A Tọhàpụ̀lá Nwaanyị Gburu Di Ya Ka Ọ Nọchara Ahọ Ise n'Ụlọnga

May 30, 2022 - 21:46
 0
A Tọhàpụ̀lá Nwaanyị Gburu Di Ya Ka Ọ Nọchara Ahọ Ise n'Ụlọnga

Izunna Okafor dere akụkọ a

 

 Otu nwaanyị gbara afọ iri abụọ na iteghete aha ya bụ Olamide Akinbobola, onye gburu di ya site n'ịsụ̀ ya mma oge ha na-alụ ọgụ apụtala n'ụlọnga.
 Ka ọ na-ekwu okwu mgbe o nwerechara onwe ya site n'ebe a tụkpuru ya, bụ ‘Kirikiri Female Correctional Facility, Lagos’, Akinbobola kọwàra na ọnụnọ ọ nọrọ ebe ahụ mepere ya anya.
  Ọ dị ncheta na nwaanyị ahụ jí ụmụ abụọ, onye nke nọ na-agabiga agha ezinaụlọ n'alụmdinanwunye ya sụ̀rụ̀ di ya, bụ Dare Akinbobola (gbara afọ iri abụọ na asatọ) mma nri n'olu,
n'ebe ha bi n'Ikorodu, steeti Lagos.
 Ọ dụrụ ndị na-amalite amalite ka ha gbaa ọsọ na mmekọrịta maọbụ alụmdi ọbụla na-ada aja aja. 
   Ọ sị: "Gbaa ọsọ ma ọ bụrụ na e nwee agha ezinaụlọ. Nsogbu malitere mgbe m kpebiri ịnọ  n'alụmalụ nwere nsogbu. Anọgidere m n'ihi na echere m na ọ ga-adị mma. Ọ bụrụ na m gbara ọsọ oge m nwere ohère ime nke ahụ, akaraghị m ịga nga maọbụ gbuo ya ka m na-azọ onwe m."
 Dịka ọ na-ekele Jennichi Foundation maka ịgba mbọ hụ na a tọhapụrụ ya, Olamide kwuru na ọ dịrịghị ya mfe.
  Ọ sị: "Anọrọ m afọ ise ebe a. Ihe m gabigara adịghị mfe. Oge ya bụ ihe mere, ọ fọdụrụ obere ka m gbaa ara n'ihi na ọ bụghị ihe m kpachara anya wee mee. Ọ bụrụ na m kpachara anya wee mee ya, akaara m ịgbafu, mana eburu m ya gaa ụlọọgwụ; ma n'ikpeazụ azọtaghị m ya. 
 “Mgbe m nọ̀ n'ebe ahụ, site na ịgbaume ndị mmadụ, amụtala m inwe ndidi, nnagide na ezi mmekọrịta. Ọ bụghị ihe ọbụla ị hụrụ ka ị ga-ekwu maka ya. Amụkwara m ụfọdụ ọrụaka. Amụrụ m ka e si ákpà isi, amụrụ m ka e si aga biidi. 
    “Obi bụ m aṅụrị taa na enwerela m onwe m n'ikpeazụ, ma anọ m na mwute n'ihi na di m anwụọla. Ihe merenụ abụghị ihe a kpachara anya wee me, ọ na-ewute m na ọ nọghịzi ndụ. Abụ m nwaanyị ka dị obere, ji ụmụ abụọ. Nkasiobi m nwere bụ ụmụ m."  
 Otu ọ dị, nwaanyị ahụ kwùrù na ya tinyere ọdịnihu ya n'aka Chineke.
  Gbasara ụlọnga ahụ, o tòrò ha dịka o kwuru na ha mere nke ọma, na ha na-enye ha nri ugboro atọ n'ụbọchị, na-enye ha ncha ha ji asa ahụ ma hụkwa na a haziri mmiri ha nke ọma.
 Ọ gara n'ihu kwuo na ya anaghị eri eba n'ihe na ya na-arịa ọnya afọ, ma ihe zọrọ ya bụ ego Jennifer Owolabi na-enye ya. O kwuru na e nwere ụlọọgwụ bụ ịgba ebe ahụ, tinyere na a na-enye ha ọgwụ n'efu.
 N'ikpeazụ, o kelere Jennifer na ndị niile nọyeere ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484