Nchekwa na Ikpere Arụsị: Soludo Agwala Ndị Ụka Guzosie Ike

Jun 8, 2022 - 20:34
 0
Nchekwa na Ikpere Arụsị: Soludo Agwala Ndị Ụka Guzosie Ike


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịọra steeti Anambra bụ Ọ̀kammụ̀ta Chukwuma Soludo echeterela ndị òtù Kraịst na ha nwere ọrụ pụrụ iche chere ha n'ihu banyere ọnọdụ nchekwa steeti ahụ ugbua, ya nà ikpere arụsị, bụ nke na-echighatakwazị azụ n'ike n'ike ugbua na steeti nà mpaghara ebe dị icheiche n'ala Igbo.

Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a n'okwu ya na mmemme ụka ịtụ mmamma e jiri chịkọta nnukwu ọgbakọ sinọọdụ ahọ 2022 nke ụka Angịlịkan na dayọsiisi Amichi, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka ‘St. Peter's Anglican Church, Amichi’ dị n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ nke steeti ahụ.

Ọ kpọrọ oku ka a kwalite ịdịnotu, ezi mmekọrịta na njikọaka na mmekọrịta n'etiti ndị òtù ụka dị icheiche, iji nye aka n'ibuli steeti ahụ na ọchịchị ya n'ogoogo dị elu na n'imegide ihe dị icheiche na-echere steeti ahụ nà ndị òtù Kraịst aka mgba n'oge ugbua.

O chètààrà ha na ikpere arụsị ji nwayọ echighatakwa azụ ugbua na steeti ahụ, ọkachasị n'etiti ndị ji ya arụ arụrụala ma na-eweta ala adịghị mma; ma gwa ndị ụka ka ha guzosie ike megide nke ahụ.

Dịka ọ na-eme ka ọhaneze mara na ọrụ nchekwa bụ ọrụ dịịrị mà onye ukwu mà onye ntà n'ihi na onye ọbụla nwere ntụnye ọ ga-eme na ụzọ ọ ga-esi nye aka; ya bụ Gọvanọ, onye duru nwunye ya bụ Oriakụ Nonye Soludo wee bịa mmemme ahụ, kpọkùkwàzịrị ndị Anambra ka ha na-enye ndị ọrụ nchekwa ozi dị mkpa ga-enye aka ịkwàlite arụmọrụ ha, ọkachasị oge ha hụrụ onye na-aga ije dị añaa.

O kwùrù na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ, ya na ndị ụka, kwe nkwà na ọ ga-agakwa n'ihu ịrụ ezi ọrụ na steeti ahụ, ọkachasị ọrụ ịkwàlite nchekwa na ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, ya na ọrụ ịkwàlìtè ezi ọnọdụ mmepe na ọganihu bụ steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo nọkwàrà na mmemme sinọọdụ ahụ wee machie ndị ji ọkwa gọọmenti n'ọchịchị ya ime ego n'ọ̀hà maọbụ ịkpọ ịkpọ aha ego nkwàdó ha na-enye n'ọhà na mmemme ọhaneze ọbụla; ma kwuo na nke ahụ ga-enye aka ịkwalite ịkwụba aka ọtọ na ime ihe etu o kwesiri n'ọchịchị ya. 

Na mbụ n'ozi ya na mmemme ahụ, Bishọp ụka Angịlịkan na Dayọsis Amichi, bụ ‘Rt. Revd.’ Ephraim Ikeakor kèlèrè Chineke ma inye steeti ahụ onye dịka Ọ̀kammụ̀ta Soludo dịka onye ndu, dịka o siri bụrụ mmasị Ya.

O chètààrà ya bụ Gọvanọ na ụmụafọ steeti Anambra na-atụ anya ọtụtụ ihe n'aka ọchịchị ya ma na-elegara ya anya ka onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasaara ọchịchị. Gbasaara etu ọnọdụ nchekwa siri dị na steeti ahụ ugbua, Bishọp ahụ gwàkwàrà Gọvanọ Soludo na ndị Anambra ka nwere ntụkwàsịobi ma kwenyesie ike na ọchịchị ya wàtàrà ọgọdọ ma nwekwa ihe ọ ga-ewè iji memìlaa ndị omekoome ahụ na-eyi ụmụ mmadụ egwu ma weghàchitekwa ezi ọnọdụ nchekwa na udo tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Ọ nọkwazịrị n'ebe ahụ wee kwe ya nkwà na ndị ụka kwụ ya n'azụ ma dịkwa njikere ịga n'ihu na-enye ya nkwàdo ma na-ekpere ya ekpere oge niile, iji hụ na ọchịchị ya na steeti ahụ gàrà siriri-wèrèrè ma mekwa nke ọma.

Bishọp Ikeakor nọkwàrà na mmemme ahụ wee kpeere Gọvanọ Soludo na nwunye ya ekpere, ma rịọ nchekwa, amamihe, na odudu Chineke n'isi ha.

Ya bụ mmemme sinọọdụ, nke isiokwu ya bụ: “Ndị Ọbịa nà Ndị Njem n'Ụwa: Ọnọdụ Anyị Dịka Ndị Otu Kraịst” dọtàkwàrà ọtụtụ mmadụ na ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ; ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya mee emume ịwa achịcha bekee, tụọ mmamma, kpee ekpere, ma bụ̀kwá abụ otùtó dị icheiche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484