Achbishọp Okeke Adụọla Ndị Ụka Ka Ha Kwe Ka Mụọ Nsọ Na-Edu Ha

Mar 7, 2022 - 13:42
 0
Achbishọp Okeke Adụọla Ndị Ụka Ka Ha Kwe Ka Mụọ Nsọ Na-Edu Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onye ji ọkwa Metropolitan Achbishọp nke ‘Onitsha Ecclesiastical Province’, bụ ‘His Grace, Most Reverend’ Valerian Okeke akpọkuola ma dụọ ndị ụka ọdụ ka ha nyefèé onwe ha, kwe ka mụọ Chukwu na-edu ha, ma bụrụkwa ezi ndị agha nke Kraịst.

Ya bụ Achbishọp kpọrọ òkù a n'okwuchukwu ya n'ụlọụka ‘St. Charles Lwanga Catholic Church’ dị n'Okpoko, n'okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru na steeti Anambra oge ọ gara njem nleta n'ebe ahụ.

N'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Achbishọp Okeke, onye okwuchukwu ya gbadoro ụkwụ n'isiokwu na-asị “Kwe ka Mụọ Nsọ biri n'ime gị”, kọwàrà na Mụọ Nsọ enweghị mmalite na njedobe, n'ihi na Chineke enweghị mmalite na njedobe.

Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha onye ọbụla n'ime ha nabata Mụọ Nsọ ma na-ebikwa ezi ndụ ga-eme ka Mụọ Nsọ ahụ nọgide n'ime ya mgbe niile, ọbụladị dịka o chètààrà ha na Chineke bụ ụzọ, eziokwu na ndụ, ma nyekwazie ha ndụmọdụ ka ha bụrụ ezi ndị agha nke Kraịst ga-egùzosi ike ma jigidesie okwukwe ha ike dịka ezi ndị otu Kraịst.

O jikwazịrị ohere ahụ kelee onyeisi nchụaja nọ n'ụlọụka ahụ maka ọrụ ọma ya na ọrụ mmepe dị icheiche a na-ahụtagasị n'ụlọụka ahụ na gburugburu ya; kelee ndị ụka maka nkwàdó ha na-enye ya bụ onyeisi nchụaja; ma kpekwazie ekpere ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ndị Ya na ime ka ha si n'ike na-abà n'ike, na-etokwa eto n'ime mmụọ.

Na nzaghachi ya, onyeisi nchụaja n'ụlọụka ahụ, bụ Fada Theophilus Odukwe kọwara ụbọchị ahụ dịka oke ụbọchị pụrụ iche, ma kelee Achbishọp Okeke maka njem nleta ahụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'iwulite otuto ime mmụọ na agamnihu nke ụlọụka ahụ na ndị ụka ya.

Dịka ọ na-ekele ya bụ Achbishọp maka ọ̀gbụ̀gbá iri ya n'ọkwa dịka Achbishọp, o kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu inye ya ogologo ndụ, ịgọzi ya na ịkwụghachi ya mmaji kwuru mmaji maka ọrụ ọma dị icheiche ọ na-arụ n'ọkwa ahụ.
 
N'okwu ya n'aha odeakwụkwọ Parish ahụ, Ledi Nneka Nwachukwu kèlèrè Chineke maka ọrụ ọma niile o ji ya bụ Achbishọp arụ n'Achdiọsiisi ahụ, ya na ezi ihe dị icheiche o meputegoro, ma kpee ka Ọ gaa n'ihu na-agba ya ume ma na-agọzikwa oziọma ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484