Na Kaduna, Ndị Ojiegbe Egbuola Nwoke Lụrụ Nwaanyị Ọhụrụ, Tọ̀rọ́ Nwunye Ya Dị Ime

Jun 7, 2022 - 21:32
 0
Na Kaduna, Ndị Ojiegbe Egbuola Nwoke Lụrụ Nwaanyị Ọhụrụ, Tọ̀rọ́ Nwunye Ya Dị Ime

 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

 Ndị ojiegbe nọrọ na nsonso a wakpò obodo Jere dị n'okpuruọchịchị ime obodo Kagarko na steeti Kaduna, ma kpaa mkpamkpa ebe ahụ.
 Ndị omekome ahụ e kwuru na ha karịrị iri ise n'ọnụọgụgụ, jì ọgbatumtum wee bata Jere, nke dị n'ogologo ụzọ awara-awara ahụ si Abuja gaa Kaduna, bụ ebe na-azụ azụ ugbua n'ihi ihe ọjọọ.
  Otu onye obodo ahụ, Hassan Adamu Jere kwùrù na ndị omekome ahụ wakporo ezinaụlọ nwoke na nwaanyị lụrụ dinanwunye ọhụrụ ma chọọ ka ha kpụrụ nwunye ọhụrụ ahụ pụọ, ma di ya jụrụ ajụ. Mgbe ọ na-azọ nwunye ya, ha gbara ya egbe, ọ nwụọ. Ha wee kpọrọkwa nwunye ya ahụ dị ime pụọ.
  Dịka Adamu Jere siri kwu, oke égwù dị n'obodo ahụ ugbua dịka ndị ntorobịa na-ewe iwe ma na-akwa arịrị nà n'ágbànyèghị̀ ndị ọrụ nchekwa juru obodo ahụ, na ndị omekome ahụ rụrụ ọrụ ojọọ ahụ ihe karịrị awa atọ, ma pụọ n'enweghị onye jidere ha.
 Ọ sị: "Anyị kpọrọ ha oku ekwentị ọtụtụ ugboro, ma ha gbachiri nkịtị. Nke a bụ nke abụọ ndị omekome na-akpa nnukwu ike n'obodo anyị n'ime ọnwa atọ, nke mere ka anyị na-echè na ndị ọrụ nchekwa e debere ebe a abaraghị anyị uru." 
  Onye ọzọ aha ya bụ Ibrahim  Salisu kọwara na agwa ndị nche ahụ kpara gosịrị na ha na ndị omekome ahụ nọ n'izù maọbụ na ha ebughị ọdịmma ha n'obi.
 Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ka ọ gachara ọtụtụ awa ndị omekome ahụ jiri laa ka ndị ọrụ nchekwa pụtara ma mechaa gwa ndị obodo na ha gburu mmadụ abụọ n'ime ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484