Akụkọ Ifo: Ihe Mere Ọkụkọ Ji Abọ Ala

Jul 19, 2021 - 22:32
Jul 19, 2021 - 23:06
 0
Akụkọ Ifo: Ihe Mere Ọkụkọ Ji Abọ Ala

Ijeoma Okoye dere akụkọ a

OTU oge gara aga mgbe amụbeghị ndị nna anyị ha,ọ dị otu nzukọ jikọtara ụmụanụmanụ niile. Ụmụanụmanụ na-agbakọ na-atụ elo ma na-ekwukwa maka nsogbu dịirị ha na otu a ga-esi dozie ya.

Ihe kacha ha mkpa na ya bụ nzukọ bụ otu ha ga-esi dozi nchekwa ha na ime onwe ha ka ha baa ọgaranya. Ha chọrọ ibi n’obi aǹụrị n’obodo ha. N’ime nzukọ ha, ha nwere ndị isi: Agụ bụ onye isi oche, Enwe bụ ode akwụkwọ, Ewu bụ ode akwụkwọ ego na ndị isi ndị ọzọ ma ha e nweghị ojide ego. Ha bidoro nwebe mgbakasi ahụ n’onye ga-abụ ojide ego, ha wee nwee nzukọ ịhọpụta onye ga-abụ ojide ego ha.

N’ikpeazụ, ha họpụtara nnekwu (nwunye ọkụkọ) na ọ bụ ya ga-abụ ojide ego ha. Ụmụanụmanụ nwere aǹụrị nke ukwuu n’ihi na ha hụrụ na ọ ga- ejidenwu ego ha n’ihi obi umeala ya na ikwesi ntukwasi obi ya.

Ụmụanụmanụ wee bido tụkọtaba ego ka ume onye ọbụla ha. Ihe bụ ebum n’obi ha na ya bụ ego ha na-atụkọ bụ ịba onwe ha ọgaranya. A na-enye nnekwu ego niile ha tụkọtara n’nzukọ dịka ojide ego.

Mgbe nnekwu laruru n’ụlọ ya, o gwuru ala tinye ego ahụ. Ọ gwara di ya okeọkpa na ụmụ ya ụmụuriom maka ego ahụ ma dọkwaa ha aka na ntị ka ha ghara ịnabata onye ọbịa ọ bụla n’ụlọ ha ka ọ ghara ịma ebe ego ahụ dị. Ego ahụ mere ka nnekwu na ezinaụlọ ya na-akpachapụ anya na mmekọ ha na ụmụanụmanụ ndị ọzọ.

Mbe, anụmanụ dị oke aghụghọ bidoro masaba nnekwu ụtọ. Mgbe ọ bụla abịara nzukọ, mbe na-abịa nọdebe nnekwu na-akpanyere ya ụka. E mekata, mbe na nnekwu wee bụrụ nnukwu enyi nke na ha na-akpazị maka ezinaụlọ ha. Ha kpakatara nke na ha gwara onwe ha ihe ha ga-eji ego nke ha mee ma e kee ya.

Mbe gwara nnekwu na ọ ga-eji nke ya lụọ oke ụlọ ga-enwe ọtụtụ ọnụ ụlọ ọ ga-adọkọju nri ka ọ ga-abụ mgbe ụnwụ bịara, ka ya na ezinaụlọ ya ghara ịtara agụụ ahụhụ n’ịchọ ihe ha ga-eri. Nnekwu gwara ya na ọ ga-eji nke ya zụọ ụmụ ya n’akwụkwọ.

Otu ụbọchị, nnekwu na-aga n’ugbo ya ka o wetara ezinaụlọ ya ihe ha ga-eri wee zute mbe n’ụzọ, ha abụọ wee kelekọrịta onwe ha. Mbe wee jụọ nnekwu ma ọ ga-abịanwu n’ụlọ ya n’ihi na o nwere ọjị, nnekwu wee sị ya na ya agaghị abatanwu na ọ dị ya ọsọọsọ wee jụọ ya nke bụ ụlọ ya, mbe gosi ya. Ha keleritakwara onwe ha ọzọ. Nnekwu gaba ịchọrọ ezinaụlọ ya nri n’ugbo ya.

Ụmụ anụmanụ niile na-ebi n’udo na aǹụrị. Ego ha tụkọtara agbalitela, ha na-ekpezi ekpere ka afọ bịa n’isi njedebe n’ihi na ha akwadochaala ihe ha ga-eji ego ahụ mee. Otu ụbọchị,nzukọ gbasara mbe soro nnekwu laa n’ụlọ ya, ka ọ mara ebe o bi. Ha abụọ abụrụla nnukwu enyi nke na nnekwu enweghị ike ịgwa mbe laghachị azụ. Ọzọkwa bụ na ya bụ nnekwu amarakwuola ebe mbe bi.

Mgbe ha ruru n’ụlọ, nnekwu nabatara ya nkeọma. Dịka mbe si mara ebe nnekwu bi, o bidozie bịaba ịhụ nnekwu n’ezinaụlọ ya. Mgbe ụfọdụ mbe na-abịa, ọ zụtara ha ihe, nnekwu na ezinaụlọ ya wee were mbe dịka ezigbo enyi.

Otu abali, nnekwu na ezinaụlọ ya siri ụtara ji na ofe nsala. Mbe bịara n’ụlọ ya ịhụ ha, ha wee tinyere ya nri. Mbe riri nri ahụ wee chọpụta na ọ dị ụtọ nke ukwuu.

Mbe wee rie nri ahụ nke ukwuu nke na ije ekweghịzị ya ọgịga n’ihi na afọ ya buru oke ibu. Mbe wee rahụ n’ụlọ ọkụkọ n’abalị ahụ.

N’oge dị ugbu a, nnekwu eweela mbe ka enyi kwesịrị ntụkwasi obi. Mgbe ụfọdụ, e mechara nzukọ, a na-enye nnekwu nnukwu ego n’ihi na ọ bụ ya bụ ojide ego. Ọtụtụ oge, mbe na-eso ya ala n’ụlọ ya ma ha gbasaa nzukọ. Nnekwu na-eburu ego ahụ gaa n’olulu ahụ o gwuru n’ihu mbe tinye ego o ji bata na nzukọ. Mbe amarala ihe niile gbasara nnekwu na ezinaụlọ ya. Ọ marala mgbe nnekwu na ezinaụlọ ya nọ n’ụlọ na mgbe ha anọghị ya, mbe amarakwuola ebe nnekwu na-edebe ego nzukọ ahụ ụmụanụmanụ na-enye ya ka ọ na-edebere ha.

Otu ụbọchị, mbe weere nzuzo gaa zuo ego ahụ niile n’ihi na nnekwu na ezinaụlọ ya anọghị n’ụlọ. Mgbe nnekwu na ezinaụlọ ya lọtara, ụlọ ha niile ghasara aghasa ma kpọkwa isi n’ala. Ha chọpụtara na onye iro bịara n’ụlọ ha.

Nnekwu wee were ọsọ gaa n’olulu ahụ o gwuru ọ na-etinye ego, mgbe o ruru ebe ahụ, o tie mkpu n’oke olu sị ”Ewoo! Ezuola ego m debere!!” N’iwe, nnekwu wee were ụkwụ ya na mbọ ya bọba ala. Okeọkpa na ụmụ ya were ọsọ bịa ebe nnekwu nọ, nnekwu wee gosi ha olulu ahụ na e werela ego niile dị n’ime ya.

  Okeọkpa kwaa, ụmụ ya na-ebe. Okeọkpa tie: ”Onye mere ihe a?” Nnekwu jụọ: “Ebee ka m ga-aga?” Ụmụ ha tie: “Ewoo! Anyị abaala na nsogbu oo!….”

Nnekwu kpọrọ ụmụanụmanụ oku nzukọ mberede. N’ime ya bụ nzukọ ka nnekwu gwara ụmụanụmanụ na ezuola ego ahụ niile ha tụkọtara na nzukọ nke ọ na-edebere ha. Nnukwu nsogbu na ọgbaghara wee daa n’etiti ụmụanụmanụ,ha niile wee bee n’ụdị dị iche iche chi siri kee ha n’ize iwe. Ọtụtụ n’ime ụmụanụmanụ ahụ kwara arịrị n’ihi na ha edebechaala ihe ha ga-eji ego ahụ mee.

Ewu sịrị na ya akwadochaala otu ọ ga-esi were ego ahụ kụọ elu ụlọ ya ọ lụchabeghị. Nkita kwuru na ọ ga-eji nke ya bukọta ọkpụkpụ maka ya na ezinaụlọ ya.

Mbe ǹụrụ iyi na ya enweghị ike ịhapụ oke nke ya n’ego ahụ, ụmụanụmanụ niile wee na-ewere nnekwu iwe ma ǹụọ iyi na ha agaghị ahapụ ego ahụ.

Nnekwu wee bilie gwa ụmụanụmanụ na ha mara otu ọ bụla ha ga-esi chọ ego ahụ, ha chọọ. Mbe ghasara atụmatụ ahụ n’ihi na ọ matara n’aka ga-akpara ya ma ọ bụrụ na ụmụanụmanụ gaa ịchọ ego ahụ.

N’ikpeazụ ụmụanụmanụ kwuru na ha amaghị ihe ọ bụla gbasara ebe nnekwu debere ego ahụ na ihe ọ na-ekwu. Ha kwukwara na ha adịghị njikere ịchọ ego ahụ n’ụdị ọ bụla na iwu bụ na nnekwu na ezinaụlọ ya ga-ewetarịrị ha ego ha.

Nnekwu na ezinaụlọ ya wee laa n’ụlọ ha ịchọ ego ụmụanụmanụ nyere ya ka ọ debere ha. Rue ụbọchị taa ọkụkọ ka ji ụkwụ ya na-abọ ala n’olile anya na ọ ga-ahụ ego ahụ ụmụanụmanụ nyere ya ka o debere ha. Chakpii!

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484