Narị Otu Ụbọchị n'Ọkwa: Ọchịchị Soludo na Ụfọdụ Ihe O Mepụtagoro

Jun 26, 2022 - 22:22
Jun 26, 2022 - 22:58
 0
Narị Otu Ụbọchị n'Ọkwa: Ọchịchị Soludo na Ụfọdụ Ihe O Mepụtagoro

Izunna Okafor dere edemede a

Ụnyaahụ ka o mere mkpụrụ ụbọchị otu narị aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo jiri banye n'ọkwa dịka gọvanọ nke ise steeti Anambra nwegoro n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

Gọvanọ Soludo bụ onye e duru n'iyi ọrụ n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2022, bụkwa ụbọchị ọ malitere ọrụ ozigbo.

Edemede a na-eleba anya n'ụfọdụ ihe dị icheiche dara ụda ọchịchị Soludo mepụtagoro kemgbe abalị otu narị gara aga o jiri malite.

Ihe mbụ Gọvanọ Soludo mere ka e duchara ya n'iyi ọrụ n'abalị iri na asaa ọnwa Maachị bụ ịga ebe idei mmiri na enye nsogbu n'akwa mmiri Sakamori dị n'Okpoko, n'okpuruọchịchị Ọgbaru, bụ ebe ọ malitere ọrụ ozigbo ikpochaa ya bụ ebe ka ọ dịkwa ka ebe mmadụ bi.

Ka ọ dị taa, a sụgheela ọwammiri Sakamori ahụ sụchiri asụchi n'oge mbụ, nke mere ka mmiri niile dọ ebe ahụ n'oge mbụ hughesie ma na-agazịrị onwe ya, dịka ọ dị taa.

Malite ụbọchị ahụ ruo taa, ọchịchị Soludo akpatụla aka na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ. Na ngalaba ọrụ ugbo, Gọvanọ Soludo nọrọ na nsonso a gbapee atụmatụ ọrụ ugbo nke ahọ 2022 n'ime steeti Anambra, bụkwa nke a nọrọ na ya wee kesaara ọtụtụ ndị ọrụ ugbo ịọ na steeti ahụ mkpụrụ akụkụ ọrụ ugbo dị icheiche n'efu maka ịkụnye n'ugbo ha. Ọ nọkwara n'ime izuụka olenaole gara aga wee gbapee atụmatụ ịkụ akị oyibo na akwụ ruru otu nde n'ọnụọgụgụ n'ime steeti ahụ.

N'ihe gbasaara ọnọdụ gburugburu, n'ịga n'ihu n'ime o mere na Sakamori, Gọvanọ Soludo nọrọ n'abalị ise nke ọnwa Juunu ahọ a wee gbapee atụmatụ ịkụ ọtụtụ osisi na steeti ahụ iji chekwaa ma kwalite ịmamma nke gburugburu Anambra.

Gọvanọ Soludo ekpochasịkwala ọtụtụ ebe na-erubụ ajọ unyi na mpaghara Onitsha nà mpaghara ebe ndị ọzọ na steeti ahụ, ma kwalitekwa usoro e si ekpo ahịhịa na atịtị na steeti ahụ, iji mee ka steeti ahụ chawapụ. Ọbụladị n'izuụka a, ọchịchị Soludo gbanwere usoro e si ekpo ahịhịa na steeti ahụ, ka ọ bụrụzie nke ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ikpo ahịhịa na steeti ahụ ga na-aga n'ụlọ n'ụlọ na-eburu, karịa ndị mmadụ ịdị na-agazị ebe ekpofu ahịhịa edebe ha.

Na ngalaba ahụike, ụfọdụ ihe dị icheiche Gọvanọ Soludo mepụtagoro na ngalaba gburugburu metụtakwara ngalaba ahụike n'ihi na ebumnobi ụfọdụ n'ime ha bụ iji nye aka kwalite ọnọdụ ahụike steeti ahụ na ụmụafọ ya, ọkachasị dịka o siri metụta idebe gburugburu ọcha. Ọ nọkwara n'isi mbido ọnwa a wee zọpụ ụkwụ imemila na ịchụ ọrịa ịba ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ, bụkwa ebe a nọrọ wee malite ikesa ụlọ mgbochi anwụnta n'efu n'ime steeti ahụ. Ọ nọkwara n'izuụka gara aga wee gbapee ogige ebe a ga-arụ ahịa ọgbọ ọgwụ mba ụwa n'Ọba, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Idemili South nke steeti ahụ, nke ga-abụ ebe kachasị buo ibu a na-ere ọgwụ na mpaghara Africa ma ọ bụrụ na a rụchaa ya.

N'ihe gbasaara agụmakwụkwọ, ngwangwa ọ batara n'ọchịchị, Gọvanọ Soludo zọpụrụ ụkwụ ozigbo ịkwalite ngalaba agụmakwụkwọ steeti ahụ, bụkwa nke o kwenwòrò nkwa ime mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme ụbọchị ụmụaka nke ahọ a, e mere n'abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Mee ahọ a. Ọchịchị ya malitekwara atụmatụ iwè ndị nkụzi n'ọrụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-ewe ndị nkụzi ọhụrụ ruru puku ise n'ọrụ nkụzi na steeti ahụ, bụkwa nke usoro ya na-aga n'ihu ugbua. Nke a agaghị enye aka naanị n'ịkwalite ngalaba mmụta steeti ahụ, ọ ga-enyekwa aka ime ka ibelata ọnụọgụgụ ndị ntorobịa enweghị ọrụ na steeti ahụ.

Banyere ịkwalite udo na nchekwa, ọ bụ ihe doro anya na ajọ ọnọdụ nchekwa laghachikwara azụ na steeti Anambra, ọbụladị tupu Gọvanọ Soludo weghara ọnọdụ. Kaosiladị, kemgbe ọ batara, ọchịchị ya agbaala mbọ dị icheiche iji weghachite ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ. Otu n'ime mbọ a bụ ịkpọ nzukọ ọtụtụ ugboro maka ọnọdụ nchekwa, nke ọ kpọrọ ma ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche na ndị òtù dị icheiche na-eselite isi, na-arịọ  maọbụ na-enye nsogbu n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ n'ime steeti ahụ, ọbụladị ma ndị otu ‘Indigenous People of Biafra (IPoB), na ndị ọzọ. Otu n'ime ebumnobi mmemme ahụ bụ ka a tụkọọ ero ọnụ maka iwete udo na ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.

Ọ gakwara leta onyeisi otu IPoB, bụ Maazị Nnamdị Kanu ebe ahụ a kpọchiri ya n'ogige ndị ọrụ nchekwa DSS, dịka otu n'ime nzọpụụkwụ ya iji weghachite udo na nchekwa na steeti ahụ na mpaghara ala Igbo n'izugbe. N'ihe gbasakwara nchekwa, Gọvanọ Soludo nọrọ na mgbasaozi izugbe o mere n'ọnwa Mee wee wepụtasịa ụfọdụ ntụziaka na atụmatụ dị icheiche a ga-agbaso na steeti ahụ iji weghachite nchekwa na udo tọrọ atọ. Atụmatụ a na ntụziaka ndị a enwekwala aka n'ọtụtụ ụzọ dị icheiche ịkwalite ịjide ụfọdụ n'ime ndị omekome ahụ na-enye nsogbu na steeti ahụ, na ibibi ebe nzuzo ha. 

Ọchịchị Soludo enyekwala aka n'ikpezi udo n'etiti obodo dị icheiche na-enwe nsogbu na ọgbaghara na steeti ahụ ahụ.


N'ịga n'ihu, ọchịchị Gọvanọ Soludo emeela ọtụtụ ihe dị icheiche n'ịkwalite mmepe steeti ahụ n'izugbe, nke gụnyere iziga ámụmà ego ọrụ nke ahọ 2022 e mezigharịrị emezigharị n'ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ nke o kwuru na pasenti iri isii na anọ n'ime ya bụ màkà ọrụ mmepe obodo ebumnobi ya bụ iji kwalite mmepe steeti ahụ n'izugbe.

N'okwu ya oge ọ na-agupụ̀tara ndị omeiwu nkọwa ámụmà ego ọrụ ọhụrụ ahụ, o mere ka a mara na pasentị iri isii na anọ n'ime ego ọrụ ahụ bụ màkà ọrụ mmepe obodo; ma kọwakwa na a hụtara mkpa ọ dị ịhazìgharị̀ ego ọrụ ahụ n'ihi etu ọnọdụ akụnụba nà ọnụ ahịa ihe siri dị ugbua. Gbasara mmepe, ọchịchị Soludo kesàkwàrà ego nkwàdo ruru nde kwuru nde naịra nyegara ọtụtụ obodo dị icheiche na steeti ahụ iji kwalite ọnọdụ mmepe obodo ha, bụ nke e mere site n'okpuru ụlọọrụ 'Anambra State Community and Social Development Agency (ANCSDA)’.

Obodo dị icheiche soro keta ego ahụ n'agba nke a gụ nyere Oroma-Etiti dị n'okpuruọchịchị Anambra West, Urum dị n'okpuruọchịchị Awka North, Ifite-Ogwari dị n'okpuruọchịchị Ayamelum, Ndiokolo dị n'okpuruọchịchị Orumba North na Ezira dị n'okpuruọchịchị Orumba. Amụma ahụ ka na-agakwa n'ihu ugbua.

Ọchịchị Soludo azọpụkwala ụkwụ n'idozigharị ụfọdụ okporoụzọ mebisiri emebisi ma rụọ ndị ọhụrụ, iji hụ na e nweghị ajọ ọnọdụ okporoụzọ na steeti ahụ. Ọ bụkwa n'ihi nzọpụụkwụ a ka o jiri nọrọ na nsonso a wee dozisie ebe ahụ mebisiri emebisi na mpaghara Amansea n'ogologo okporoụzọ ahụ siri Onitsha gaa Enugu.

Ihe ndị a niile na ọtụtụ ihe ndị ọzọ bụ nke Gọvanọ Soludo mepụtara naanị n'ime mkpụrụ abalị otu narị o jiri banye n'ọchịchị. Nke a na-egosi na ya bụ ọkụkọ ga-abụ oke ebidolarị n'ejù mebe ihe oke. Nke a pụtakwara na olileanya dị ebe a na-aga, na ya bụ Gọvanọ ga-emekwa nke kacha nke n'ọdịnihu.

N'ọchịchị Soludo, ebe nke azụ dị etu, kedụzị ka nke ihe ga-adị?

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484