Ụka Katọlik Enyela Fada Ocheazụ Maka Isonye n'Ígwù Okwe Ndọrọndọrọ Ọchịchị

May 30, 2022 - 22:01
May 30, 2022 - 22:04
 0
Ụka Katọlik Enyela Fada Ocheazụ Maka Isonye n'Ígwù Okwe Ndọrọndọrọ Ọchịchị

 Chinwendu Uzoatu

 N'ihi nsonye ya n'ígwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, ụka Katọlik enyela otu ụkọchukwu aha ya bụ Fada Hyacinth Alia ocheazụ.
 Nke a bụ nke e mere ka ọ pụta ìhè site n'edemede leta nke Bishọp ụka Katọlik na dayọsis Gboko, bụ ‘Most Rev. William Avenya’ binyere aka na ya, nke e dere ka ọnwa Mee dị n'abalị iri abụọ n'afọ a bụ 2022; ma bụrụ nke e degaara ndị ụkọchukwu, ndịisi ụka na ndị ụka banyere ocheazụ ahụ e nyere ya bụ ụkọchukwu.

 Fada Alia so ná mmadụ iri nà abụọ gbatarala akwụkwọ ikike (forms) nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC, maka isonye n'ịzọ ọkwa Gọvanọ na steeti Benue.
 Leta ahụ nke isiokwu ya “Suspension of Revd. Fr. Hyacinth Lornem Alia from Sacred Ministry” (nke pụtara na e nyela Fada Alia ocheazụ n'ọrụ ụka) kọwara na ụka anaghị ahapụ ndị echichi ya ka ha tinye aka n'ígwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị n'aka nke onwe ha.
 
Leta ahụ kwuru tinyere ihe ndị ọzọ Bishọọpụ, site na leta ahụ, sị: "Ana m ede iji mee ka ụnụ mara banyere ocheazụ nke ụkọchukwu m, Revd. Fr. Hyacinth Iornem Alia, ka ọ kwụsị ịgbasara ọhaneze oziọma, ka m dọchara ya aka na ntị ọtụtụ oge. Ụka (The Mother Church) anaghị ekwe ka ndị echichi ya (clerics) tinye aka na ndọrọndọrọ ọchịchị n'onwe ha. Ụnụ maara na nwa m, nwanne ụnụ nwoke na ụkọchukwu ụnụ agbatala akwụkwọ ikike otu ndọrọndọrọ ọchịchị iji zọọ ọkwa gọvanọ steeti Benue, n'okpuru ‘All Progressives Congress (APC)’, bụ nke adabaghị chaachaa n'usoro echichi anyị. 

“Ya mere, iji zaa òkù ọrụ nke mmụọ na nke ịgbasa ozioma nke ụka na Dayọsis Ụka Katọlik na Gboko, enyela m ya ocheazụ.”

Bishọp Avenya gara n'ihu kwuo na ocheazụ ahụ malitere ịdị ire ozigbo e mere ka ụkọchukwu ahụ mara banyere ya, ma kwukwa na ọ ga-adịgide etu ahụ wee ruo na Fada ahụ echegharịa ma chigharịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484