Ụlọikpe Atụọla Atụrụ Nga Ahọ Atọ Maka Isogbu Otu Nwaanyị

May 31, 2022 - 13:19
 0
Ụlọikpe Atụọla Atụrụ Nga Ahọ Atọ Maka Isogbu Otu Nwaanyị
 
Izunna Okafor dere akụkọ a
Ụlọikpe nọrọ na nsonso a wee ma otu nnukwu atụrụ (ebule) ikpe ma kwuwakwa na a ga-atụ ya nga ahọ atọ zuru ezu maka arụrụala ọ rụrụ.
Ya bụ ebule ọcha gbara ezigbo afụọnụ ka e kwuru na o jì mpì wee sógbúó otu nwaanyị gbara ahọ iri ise na anọ, bụ Adhieu Chaping na mpaghara ‘Rumbek East’ nke mbà South Sudan na nsonso a.
Akụkọ kọrọ na ya bụ ebule jiri mpi wee sogide nwaanyị ahụ, sojisie ya ngụgụ, merụsịa ya ahụ, ma ka na-esókwa ya, wee ruo mgbe ya bụ nwaanyị kubiri ume ọnwụ.
Nke a mezịrị ndị uweojii jiri nwụchie ya bụ ebule, tụọ ya ịgà ma kpọchie ya n'otu ogige ndị uweojii dị na mpaghara Maleng Agok Payam, oge ha nwetechara mkpesa banyere ihe ahụ o mere.
N'okwu ya banyere nke ahụ, otu onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ, bụ Major Elijah Mabor kọwàrà na aka onye nwe atụrụ ahụ (bụ Duony Manyang Dhal) dị ọcha, n'ihi na ọ bụ atụrụ rụrụ ya bụ arụrụala, bụzị nke mere ha jiri nwụchikọọ ya, ọkachasị n'ihi ọchụ o gburu. O kwukwazịrị na ọ bụ ha nyefere okwu ahụ n'aka otu ụlọikpe Majie dị na mpaghara ahụ maka ileba ya anya na ikpe atụrụ ahụ ikpe banyere ihe o mere.

Na nkabi ya oge o lebàchàrà okwu ahụ anya, onye Majie nke ụlọikpe okwu ahụ dị n'aka kpebiri na ya bụ atụrụ ga-eje nga ahọ atọ zuru ezu n'otu ụlọ mkpọrọ dị na mpaghara isi obodo Aduel, dịka ótù n'ime ntaramahụhụ ya.
Ụlọikpe ahụ kwukwàrà na a ga-akpụnyezị ndị ezinụlọ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ atụrụ ahụ ka ọ bụrụzie nke ha ngwangwa o siri n'ụlọ nga pụta n'ime ahọ atọ na-abịa abịa.
Ya bụ ụlọikpe gara n'ihu kwuo na onye ahụ nwe ya bụ atụrụ ga-akpụnyekwa ndị ezinụlọ nwaanyị ahụ nnukwu ehi ise chara acha tupu ọ kpụnyekwazie ha atụrụ ahụ, dịka ihe iti aka n'obi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484