Otuegwu Tottenham jiri otu okpụ goolu merie Everton

Otuegwu Tottenham jiri otu okpụ goolu merie Everton

Otuegwu Tottenham jiri otu okpụ goolu merie Everton

By Chidimma Nwogu

Onye nchekwa-azụ otuegwu Everton bụ Micheal Keane nyeere ndi otuegwu Tottenham aka site n’inye ihe akpọrọ ‘own goal’ n’olu bekee.

 Mmerie a Tottenham meriri Everton ebulitela ogo ha ugbu a ibụ ndi asatọ n’ogo tebụl site n’inwe akara iri anọ na asatọ (8th on the table with 48 points, ebe Everton na-agba ndi iri n’otu site n’inwe akara iri anọ na anọ (11th on 44 points).

Tottenham ga ezute otuegwu Bournemouth n’ụbọchi Tọzdee, ebe Everton ga ezute  Southampton na Goodison Park n’otu mgbede ahụ.