N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe

Mar 11, 2021 - 14:27
 0
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe
N'Anambra, Ekweoba Arụọrọla Nwaanyị Ajadụ Ụlọ Ọhụrụ n'Ebenebe

Izunna Okafor dere akụkọ a

Mkpu ọñụ dara na nsonso a, dịka otu nwaanyị ajadụ nwètara onyinye ọmarịcha ụlọ ọhụrụ site n'aka otu nwoke ọrụ obi ebere na-amasị na steeti Anambra.

Ya bụ ọmarịcha ụlọ ọhụrụ bụ nke a rụụrụ nwaanyị ajadụ ahụ bụ Oriakụ Philomena Ubaka n'Ebenebe dị n'okpuru ọchịchị 'Awka North' site n'aka Maazị Ekweoba Arnold Ebuka bụ onyeisi ótù ụlọọrụ nnọronwe na-ahụ maka ewumewu ụlọ, bụ ụlọọrụ 'Arnold and Associates'.

Nwaanyị ajadụ ahụ bụ onye ya na ụmụ ya bi n'ochie ọkpọkịrị ụlọ e jiri gbamgbam na ákwà wee kpuchie, wee ruo n'ahọ 2017, mgbe ótù òtù ọrụ obi ebere nnọrọonwe a maara dịka ‘Restore a Radiant Smile Foundation’ zutèrè ya wee hụta ajọ ọnọdụ ya na ụmụ ya nọ na ya na ihe ha na-agabiga.

N'okwu ya oge ọ na-enyefe nwaanyị ahụ ya bụ ụlọ ọhụrụ na igodo ya, Maazị Ekweoba mere ka a mara na ya ahụtụbéghị nwaanyị ahụ anya nke mbụ wee ruo ụbọchị ahụ ọ bịara inyefè ya ụlọ ahụ kpọmkwem.

O kwuru na ọ bụ n'ahọ gara aga ka ótù òtù nnọrọonwe zutèrè ya wee kọọrọ ya akụkọ banyere nwaanyị ahụ, nke mere ka anyammiri gbaa ya. O mere ka a mara na Mmụọ Nsọ ziri ya ozi, gwa ya ka ọ bụrụ onye a ga-eji kwara ngwaọrụ iji gbanwèé ọnọdụ nwaanyị ahụ na ezinụlọ ya; o wee nabata ozi ahụ Mmụọ Nsọ ziri ya, wee kweta na ọ ga-arụrụ nwaanyị ahụ na ụmụ ya ọmarịcha ụlọ ọhụrụ ahụ.

O mezịrị ka a mara na ihe ahụ ọ rụrụ bụ ọrụ Chukwu, ma bụrụkwa nke ọkpụkpọ òkù ya siri eluigwe wee bịa, ọbụladị dịka o nyere Chineke ekele maka iji ya wee kwara ngwaọrụ wee si n'aka ya mee ka ihu ọchị waa nwaanyị ahụ na ụmụ ya, bụ ndị ọ hụtụbeghị anya n'ụwa ya

Na mbụ n'okwu ya oge ha gara kpọtụrụ ya, eze ọdịnala obodo Ebenebe, bụ Igwe Chris Emeka Nnaegbuna n'òbí ya kọwara ọrụ ọma ahụ Maazị Ekweoba rụrụ dịka nke a hụtụbeghị ụdị ya n'oge mbụ, ma gọọrọ ya ọfọ ndụ, kpekwa ka Chineke gọzie ma kwụghachi ya mmaji kwuru mmaji.

Na nzaghachi, Oriakụ Ụbaka, onye ọñụ jupụtara obi ụbọchị ahụ, jiri anyammiri wee gbuo ikpere n'ala, kelee Chineke maka icheta ya, ma kelekwa Maazị Ekweoba maka ịgbatara ya na ezinụlọ ya ọsọ enyemaka ma kwere ka Chineke were ya kwara ngwaọrụ iji hichaa ya na ụmụ ya anya. 

O kwuru na ihe ahụ nwoke ahụ mere enyeghị ya ọnụ okwu chaa chaa, n'ihi na ọ hụbèghị ụdị ime ọgọ dị etu ahụ n'oge mbụ. O kpere ekpere ka Chineke ụmụnwaanyị ajadụ kwụghachi ma gaa n'ihu ịgọzi ya bụ nwoke ma bulikwa ya n'ogoogo dị elu.

Na ntụnye nke ya, onye hụrụ maka ọrụ ahụ, bụ Maazị Victor Ugwoegbu kwuru na ọ bụ n'etiti ahọ gara aga ka ọ gakwuru nwoke ahụ ma kọwatara ya banyere ọnọdụ nwaanyị ahụ, o wee kwe nkwà na ọ ga-arụrụ nwaanyị ahụ ụlọ, bụkwazị nke o mezupụtagoro n'ime ihe erubeghị ọnwa isii. 

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onyeisioche ụmụnna Ụmụdịaba dị n'ógbè Ụmụajana, bụ Maazị Maxwell Nnamso; ya na nwa nwoke nwaanyị ajadụ ahụ, bụ Maazị Arinze Ubaka tinyèrè olu wee kelee Maazị Ekweoba maka iwepụta onwe ya ka Chineke were ya kwara ngwaọrụ. Ha kpọkukwazịrị ndị ọzọ Chineke gọziri ka ha ñomie ihe dị etu ahụ site n'icheta ndị nọ na mkpa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484