Ndị ‘Anglican Church of Redemption’ Akàála Ụka Ọgbụgba Ndụ, Wepụta Isiokwu Ọhụrụ Maka 2022

Feb 17, 2022 - 20:44
Feb 17, 2022 - 21:07
 0
Ndị ‘Anglican Church of Redemption’ Akàála Ụka Ọgbụgba Ndụ, Wepụta Isiokwu Ọhụrụ Maka 2022


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n'ụlọụka ‘Anglican Church of Redemption' dị n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti Anambra’ dịka ya bụ ụlọụka kàrà ụka ọgbagba ndụ pụrụ iche, bụ nke a kpọrọ ‘Covenant Sunday’, ma wepụtakwa isiokwu ọhụrụ maka ahọ a bụ 2022.

Ya bụ mmemme isiokwu ya bụ “Ọgbụgbandụ Nke Ịba Ụba” (Covenant of Abundance), nke a malitere n'ụtụtụ ụbọchị ụka, bị̀àrà na njedobe na mgbede ụbọchị Tuzdee, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ na-akà ụka n'ebe ahụ nà ụfọdụ ndị sitere ebe ndị ọzọ wee bịa.

N'okwuchukwu ya, onye Chineke jiri kwara ngwaọrụ n'ụzọ pụrụ iche na mmemme ahụ, bụ ‘Evangelist' Onyeka Arinze, nke ụlọụka ‘Christ Anglican Church, Nkwelle-Ogidi’ kọwàrà ọgbụgba ndụ dịka mmadụ na ibe ya inwe nkwekọrịta n'otu ihe maọbụ karịa. 

Ọ gbadòrò ụkwụ N'Akwụkwọ Nsọ Deuteronomy 5:2-3 wee kọwaa, n'ebe o dòrò anya, ihe ọ pụtara, bụ mmadụ na Chineke ịbà n'ọgbụgba ndụ, ma chetekwaziere ndị ụka na Chineke anaghị agharịpụ onye Ya na ya gbara ọgbụgba ndụ, n'ihi na Ọ bụ Chineke na-edebe ọgbụgba ndụ.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị icheiche dị na mmadụ na Chineke ịbà n'ọgbụgba ndụ, ma nyekwa ọmụmaatụ ụfọdụ ndị ha na Chineke gbara ọgbụgba ndụ n'oge gara aga nàkwà etu Chineke siri debe ọgbụgba ndụ ahụ ruo n'isi.

Evang. Arinze, onye Chineke jiri mee ọtụtụ ihe ịrịba ama dị icheiche n'ọgbakọ ahụ, dụ̀kwàzịrị̀ ndị bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha na Chineke bàá n'ọgbụgba ndụ, ma dụkwa ha ka ha bụrụ ndị na-ekpesi ekpere ike ma na-agbasokwa nzọ̀ụ́kwụ Chineke.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisi nchụaja n'ụkọụka ahụ, bụ Ven. Obiorah Alokwu kèlèrè onye amụma Chineke ahụ, bụ Evangelist Onyeka, kelekwazie ndị mmadụ etu ha siri nuputa n'ìgwè wee sonye na mmemme ahụ n'uju. O kwezịrị nkwa na a ga na-achịkọba ụdị mmemme dị etu n'ụlọụka ahụ na mgbe na mgbe malite ugbua dịrị gaba n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche dị na ya.

Ven. Alokwu nọkwazịrị na mmemme ahụ wee kwuwaa na a ga na-enwezị ụka mgbede n'ụlọụka ahụ, malite n'ụbọchị ụka ahụ dịrịzie gaba, bụ nke ọ kpọrọ 'Redemption Hour', ma bụrụkwa nke ọ kọwàrà na ọ ga na-ewe naanị otu áwà na mgbede ụbọchị ụka ọbụla.

A nọkwazịrị na mmemme ahụ wee kpùghéé ma kwuwaa ọkpụrụkpụ isiokwu ụlọụka ahụ nke ahọ a bụ 2022, nke bụ “2022: Ahọ Inweta Ihe Nweta M” (2022: My Year of Possessing My Possession), ma bụrụkwa nke e wetere site n'akwụkwọ Joshua 21:43.

A nọkwazịrị na ya bụ mmemme bụọ abụ otuto na abụ ofufe dị icheiche, buo amụma, kpee usoro ekpere dị icheiche, ma kpọkwa òkù maka mmadụ na Chineke ịba n'ọgbụgba ndụ, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ mmemme jupụta n'ebubè.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484