Ndị Ntaakụkọ Anambra Emeela Emume Ụbọchị Mgbasaozi n'Awka

Jun 7, 2022 - 21:19
Jun 7, 2022 - 21:24
 0
Ndị Ntaakụkọ Anambra Emeela Emume Ụbọchị Mgbasaozi n'Awka


 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

 Ụbọchị ụka ka e mere emume Ụbọchị Mgbasaozi n'ụwa niile. Ọ bụ ụbọchị a na-ewepụta afọ ọbụla maka ihe gbasara mgbasaozi na ụzọ a ga-esi me ka ọ na-aga werewere.
  Ahọ ọbụla, Poopu na-ezi ozi gbasara ya. Na mmemme ahụ nke afọ a, Poopu Francis kpọkuru ndị mmadụ ka ha nwee mmụọ ige ntị, bụ nke o kwuru na ọ dị oke mkpa, ná mgbasaozi.
  N'ozi ahụ, Poopu rụtụrụ aka na ụwa ejichazịghị ige ntị kpọrọ ihe, ma kọwaa ige ntị dịka ihe bara nnukwu uru maka inwe ezi nghọta.
 Na steeti Anambra, ndị otu ahụ jikọtara ndị ntaakụkọ, Nigerian Union of Journalists (NUJ), kara ụka ma tụọ mmamma n'obi Chukwu, St Patrick's Cathedral, Awka.
 N'okwuchukwu ya, Bishọp ụka Katọlik na dayọsis Awka, Most Rev. Paulinus Ezeokafor gbadòrò ụkwụ n'isiokwu ahụ bụ Ige Ntị wee kọwaa na ọ bụ site n'ige ntị ka e si enwe ezi nghọta, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha jiri ige ntị kpọrọ ihe.
 N'otu aka ahụkwa, Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasaozi na steeti Anambra, Maazị Paul Nwosu kọwàkwàrà ige ntị dịka ihe bụ isi sekpụ ntị na mmadụ ịghọta ihe ibe ya na-ekwu, dịka ọ rụtụrụ aka na ọbụladị Chineke n'onwe Ya na-ege anyị ntị. N'ihi nke ahụ, ọ kpọkwara òkù ka ndị mmadụ mata na ige ntị dị nnukwu mkpa, ma were ya kpọrọ ihe.
  A nọ n'oge ahụ wee chịkọba ọnọdụ nke Fides Media Okpuno haziri, nke onyeisi ha, Fada Martin Anusị nọ n'isi ya.
 Onyeisi NUJ steeti Anambra, Odogwu Emeka Odogwu, osote ya bụ Ngozi Obilere na ndị ntaakụkọ ndị ọzọ sonyekwara na ya bụ ọgbakọ n'ozuzuoke. 
   N'okwu ya n'ebe ahụ, Odogwu kọwakwara isiokwu e wepụtara n'afọ a dịka nke dị oke mkpa. 
 Onye nyere nkuzi ụbọchị ahụ ma bụrụkwa Onyeisi ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, Sportslight Xtra na Homeland, Sir Chuka Nnabuife kpọkuru ndị otu Kraist na ọhaneze niile ka ha jiri obi ha niile na-ege ntị, iji ghọta ma nye ezi nkọwa.
  O kwukwàrà na ige ntị dị nnukwu mkpa n'usoro mgbasaozi ma bụrụ nke na-eme ka ọ gaa dịka o kwesịrị.
Mmemme ahụ bụ àgbà nke iri ise na isii ya kemgbe o jiri malite na mba ụwa (56th World Communication Day).

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484