Ụmụnwaanyị Emeela Ngagharịiwe Maka Pastọ Kwasoro Nwatakịrị Iko n'Ike n'Anambra

May 6, 2022 - 11:31
 0
Ụmụnwaanyị Emeela Ngagharịiwe Maka Pastọ Kwasoro Nwatakịrị Iko n'Ike n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a

Òtù ụmụnwaanyị a maara dịka ‘Ultimate Business Women and Farmers Association of Nigeria (UBWFAN)’ nọ̀rọ̀ na nsonso a wee mere ngagharịiwe udo n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, banyere ebubo e boro na otu nwoke, bụ Maazị Boniface Onyekwere (onye dị afọ iri ise na isii) ma bụrụkwa pastọ̀ kwasòrò otu nwatakịrị nwaanyị gbara naanị ahọ iri na abụọ iko n'ike n'Awka.

E boro ebubo na Pastọ̀ Onyekwere, onye bụkwa onye nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, merụrụ nwata ahụ dị afọ iri na abụọ, ka ọ gachara naanị ụbọchị atọ ya na ya malitesịrị ibi dị ka onye ọrụ ụlọ.

N’akụkọ banyere ihe mere ya, nwata ahụ, onye si n’otu obodo dị n’okpuru ọchịchị ‘Orumba North’ nke Anambra steeti, kwuru na ihe mgbu ọ gabigara ụbọchị ahụ karịrị, nke mere na o si n’elu ụlọelu wee wụtuo n'ihe dị ka oge o ji ọkara gata elekere itoolu nke anyasị ụbọchị ahụ, mgbe o nweghịzị ike idi ihe mgbu ahụ. Ọ sịkwara na ọ gbajiri ụkwụ ma merụkwa ahụ nke ukwuu oge ahụ.

N'okwu ya n'oge ngagharịiwe ahụ ha mere n'ogige ‘Women Development Center, Awka’, onyeisi òtù ụmụnwaanyị ahụ mere ya bụ ngagharịiwe, bụ Hon. Nkiru Nwagbo kwuru hoohaa na òtù ahụ agaghịkwa ezu ike ruo mgbe nwata ahu nwetara ikpe ziri ezi.

O kwuru, sị: "Anyị amaghị ihe obodo anyị na-aghọ̀zị ugbua. Anyị ga-agbasi mbọ ike iji nwetara nwata nwaanyị ahụ ikpe ziri ezi ma hụkwa na nwoke ahụ nwetara ntaramahụhụ kwesiri ya, ka nke ahụ wee bụrụ ihe mmụta na ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị nwere ike ịchọ ịga n'ihu n'omume ọjọọ dị etu ahụ n'ọdịnihu."

N'okwu nke ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Anambra bụ DSP Tochukwu Ikenga kwuru na a kpụpụla pastọ̀ ahụ a na-enyo enyo na o mere ihe ahụ n'ụlọ mkpọrọ ma kpụpụkwa ya ụlọ ikpe, ebe ndị uweojii ka na-eme nyocha banyere okwu ahụ. Ọ dụkwara ndị nne na nna ọdụ ka ha na-akpachapụ anya mgbe niile banyere ụdị ndị ha na-akpọnye ụmụ ha.

N'akụkụ nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụaka na steeti ahụ bụ Oriakụ Ify Obinabo kpọrọ̀ òkù ka e kpee onye ahụ a na-enyo enyo, bụ pastọ Onyekwere, ikpe ngwangwa, bụkwa onye a kpọchigoro n'ụlọ nga dị n'Awka, wee na-echezị ụbọchị a ga-ekpe ya ikpe.

Kọmishọna ahụ tòrò ma kwupụta ọṅụ ya maka ngagharịiwe ụmụnwaanyị ahụ, ma mekwa ka a mara na ichekwa na ịkwalite ọdịmma ụmụnwaanyị na ụmụaka so n'ihe bụ isi ebumnuche nke ọchịchị Gọvanọ Charlse Soludo na-achị steeti ahụ.

N’ịga n’ihu, o kwuru, sị: “Anyị ebidola mmemme nkụzi banyere ịkpachapụ anya maka ụmụnwaanyị, ụmụ agbọghọ na ụmụntakịrị nwoke iji gbochie mmeso a na-emetọ ndị na-eto eto.

"Anyị na-akpọkwa ndị òtù na ndị ndú okpukperechi na ụlọakwụkwọ dị icheiche ka ha nye aka kụziere ụmụaka omume ọma, ka ha wee jiri aka ahụ too ma na-agbara ihe ọjọọ ọsọ, ọbụladị oge ha bụụrụ okenye."

A hụrụ ụmụnwaanyị ahụ na-eme ngagharị iwe ka ha bu mpempe akwụkwọ e degasị̀rị̀ ihe dị icheiche na ha, ya na foto nke ụlọelu ebe ahụ nwatakịrị nwaanyị ahụ si wụtuo, na foto ya ebe o dinara n'àkwà ụlọọgwụ ma na-anara ọgwụgwọ màkà mmerụ ahụ dị icheiche ọ nwegasịrị, nke mere ka a machisie ya bandeeji n'akụkụ ahụ ya dị icheiche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484