Ọrụugbo: Nsogbu Ụmụanụmanụ Na-enye (1)

May 16, 2022 - 20:07
 0
Ọrụugbo: Nsogbu Ụmụanụmanụ Na-enye (1)

Chinwendu Uzoatu

Ọrụugbo bara nnukwu uru na ndụ mmadụ. N'ihi nke a, ọ bụ nnukwu ihe n'ụwa niile gbaa gburugburu. 

Ọ bụ site n'ọrụugbo ka e si enweta ihe oriri, nke bụ na e wepụ ya, nsogbu erimeri ga-adị n'elu ụwa. Ya mere, ma nwoke ma nwaanyị na-etinye aka n'ọrụugbo. Ọbụladị ụmụaka ejighị ya egwu egwu. Ọtụtụ mmadụ jikwara ya mere aka ọrụ ma si etu ahụ bàárá onwe ha uru ma na-achụtakwa ihe ha na ezinụlọ ha na-eri.

Ọrụugbo dị n'ụdị dị icheiche, mana nke a na-ekwu maka ya ugbua bụ ndị a na-akọ n'ubi. Ụfọdụ ndị ọrụugbo na-akọ ọtụtụ ihe n'ótù oge, dịka ji, akpụ, ọka, akịdị, akwụkwonri, ede, osikapa, agwa, tomato, ọpapa, egwusi, ọkwụrụ wdg; ebe ndị ọzọ na-akọ sọọsọ otu ihe n'otu oge. Ịmaatụ, ụfọdụ na-akọ naanị ọka.

Kaosiladị, oge ụfọdụ, ụmụanụmanụ na-abụ ihe iche aka mgba n'ebe ihe ndị ahụ a kọrọ n'ugbo dị. Ha na-ejide ihe niile, laa ha n'iyi. Ụfọdụ ihe a kọrọ n'ugbo ka ha anaghị enye ohere ka o puo ma ya fọdụzie itolite etolite maọbu ị́mị̀ mkpụrụ. Ha na-eri ụfọdụ mgbe ọ na-eto ma na-erikwa ndị nọ n'ime ala, dịka ji, ede na akpụ.
   Ọkụkọ, torotoro, ọbagwụ, ọkwà na anụ ufe ndị ọzọ yiri ha na-enye nsogbu n'ugbo. Ndị ọrụugbo gbachaa mbọ kụchaa ihe n'ala, ha abọsasịa ma loo ihe ndị ahụ ha kụrụ n'ime ala dịka ọka, egwusi na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Nke a mere na ọtụtụ ihe ndị a kụrụ n'ugbo anaghị epu epu, ọbụladị ndị puru epu, ha na-agakwa n'ihu tụrụ ha loo mgbe ha ka na-epulite. Anụ dịka ọkwà, na-aga n'ihụ tụrìsie ihe ahụ mgbe o tochara ma mepụta ihe. Ọtụtụ oge ka ha na-ala ọka a kọrọ n'ugbo n'iyi site n'ịtakasị ha.

Anụ ndị ọzọ na-akpa ike ọjọọ n'ugbo bụ ewu na atụrụ. Ha bata n'ugbo, ha amalite taba ihe niile n'ike n'ike. Ha ejide akwụkwọ niile juru n'ugbo tachaa dịka akwụkwọnri, nke ọka, akpụ wdg. Ọ bụghị sọ nke ahụ, ha na-agakwa n'ihu taa ihe ndị ọzọ dịka ji, nke ha hụrụ anya.
   Ehi bụ anụmanụ kacha akpa ike n'ihe gbasara imebisị ihe a kọrọ n'ugbo. N'ihi na ọ bụ anụ buru ibu ma na-agakwa n'igwe, ugbo ọbụla ha wakporo, ha na-azọ̀ ya pịata-pịata ma lakwaa ya n'iyi kpamkpam. Nke a na-abụ nnukwu ihe ịgba anyammiri n'ebe ndị na-akọ̀ ugbo nọ maka na o nweghị onye obi ya na-eri nke a jụrụ ajụ. O nweghịkwa onye ọ na-atọ ụtọ ka ahụhụ ọ tara laa n'iyi.

Nsogbu ehi na ndị na-achị ha na-enye ndị ọrụugbo bụzi okwu a kpụ n'ọnụ n'ala anyị bụ Nigeria taa. Ehi alaala puku kwuru puku ugbo ndị mmadụ n'iyi taa na gburugburu ala anyị niile; ebe ndị na-achịkwa ha gbuorola ọtụtụ ndị mmadụ, merụọ ọtụtụ ahụ, ma makwaa ọtụtụ ụmụnyaanyị elu n'ike n'ugbo ha, ka ha chịrị ehi wabaachaa n'ugbo ma mebisịa ihe niile ha kọrọ. 

Ọnọdụ a jọgburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ n'ísì. O so n'ihe debere ala anyị ihu ka ntọọ ma mee ka agụrụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ taa. N'ihi mmekpa ahụ ndị na-achị ehi na-enye ndị ọrụugbo, ọtụtụ n'ime ha ejirila égwù kwụsị ịkọ ugbo ma gbahapụ ihe ndị ha kọrọ n'ugbo. Ndị nwara anwa wakpò ndị ahụ na-achị ehi ọ̀gụ̀ zùtèrè ọnwụ ike, ụfọdụ buzi otu aka, anya mkpọ na ọtụtụ ọlụsị ndị ọzọ.

N'otu obodo dị na mpaghara ugwu ala anyị ka a kọrọ akụkọ etu ndị na-achị ehi siri chịrị ehi wabaa n'ugbo osikapa mmadụ nke butere nghọtahie n'etiti onye nwe ehi ndị ahụ na onye nwe ugbo osikapa ahụ. N'ikpeazụ, onye nwe ehi kpara nkata ọjọọ site n'ịkpọrọ ndị òtù ya chebiri nwaagbọghọ bụ nwanne onye nwe ugbo osikapa ahụ, maa ya elu n'ike ma gbupukwa ya otu aka. Nke a wee bụrụ nnukwu ihe ọjọọ na-egbu mgbu n'obi.
 
Ụmụanụ bi n'ime ọhịa dịka nchì, ènwè, úzè, ọ̀sá, tinyere ndị ọzọ sokwa emebi ihe ndị a kọrọ n'ugbo.

Ọtụtụ oge ka ha na-emebi ihe a kọrọ n'ugbo nke na onye nwe ugbo anaghị ewetezi ihe nwere isi n'ugbo ya. Ka ha na-adọwasị ma na-ata ọka, ka ha na-atarisi ihe ndị ọzọ ma na-abọpụtakwa ndị dị n'ime ala dịka ji na akpụ, ma na-atarisị ha.

Ụmụ ahụhụ ndị na-arịgharị n'ala sòkwà ala ihe ndị a kọrọ n'ugbo n'iyi. Ọtụtụ na-atakasị akwụkwọnri juru n'ubi ma mee ka ha gharakwa ime nke ọma. Ha na-erikwa ihe ndị a kụrụ n'ime ala ma mee ka ha ghara ipu epu.

 Ụmụanụmanụ emeela ka mbọ ndị ọrụugbo laa n'iyi, ọtụtụ oge. Ha mụchaa anya abalị maọbụ nyachaa anwụ, ọ bụrụ n'efu. Ọ na-agbawa ha obi ịhụ ka ahụhụ ha tara, tinyere ego ha mefuru n'ugbo lara n'iyi n'ihi ụmụanụmanụ.

Kaosiladị, ndị ọrụugbo na-agba mbọ dị icheiche iji chekwaba ugbo ha n'aka nsogbu ụmụanụmanụ n'ihi na Igbo kwuru sị na òké anaghị eri ihe onye mụ anya. Ya mere, ndị ọrụugbo na-ekwere ụmụanụmanụ ọnyà, si etu ahụ na-egbu anụ ndị mara n'ọnya ha. Ha na-eyinye ihe ha jiri aka ha mee akwa, o yie mmadụ nke na ụmụanụmanụ hụrụ ihe ndị ahụ na-agba ọsọ, chee na ha bụ mmadụ, ha na-etinyekwa ọ́yọ̀ n'ebe dị icheiche n'ugbo nke na-eme mkpọtụ ma na-achụsàkwa ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484