Idu Obì n'Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbua

Jan 18, 2021 - 14:18
Jan 21, 2021 - 06:13
 0
Idu Obì n'Ala Igbo: Oge Mbụ Na Oge Ugbua

Izunna Okafor dere edemede a

Idu obì bụ otu n'ime ihe zuru Igbo ọnụ, ma bụrụkwa oge e ji asị nwata nwoke ''Lee nke a jide" n'ezinaụlọ a mụrụ ya.

Na nkọwa, idu obì pụtara nna ịkpọ ụmụ ya ndị nwoke, keere maọbụ nye onye ọbụla n'ime ha ala ebe ọ ga arụ ụlọ nke ya, maka na a sị na nwata toruo obi ọ pụọ obì. Ndị mba ọzọ dị iche iche na agbụrụ ụfọdụ na-emekwa omenala idu obì n'ụdị nke ha n'ihi na ama onye na-adị ka o siri chọọ ya. 

N'ala Igbo, idu obi abụghị naanị omenala, kama ọ bụkwa ihe ziri ezi, n'ihi na a sị na ihe onye ruru ogo ya wee rie ya, ọ bụghị akpịrị. Ọ bụ kwa ihe a ma ama na ọ bụrụ na ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mere anụ n'ọkọchị na n'udummiri. Nke a mere na ndị Igbo ejighị idu obi egwu egwu, ọ kachasị n'oge gboo, maka na ha ghọtara na ọ bụrụ na nwoke edozighị ngwuru be ya n'oge, nsogbu ụwa edulaa ya mmụọ.

N'oge gboo n'ala Igbo, nwoke ọbụla lụrụ nwaanyị na-ebu ụzọ gbàkọcháá ala ya na ihe o nwere, tupu o mara etu ya na nwunye ya ga-esi debe ọkpà wee gba egwu n'elu àkwà, maka na onye ọbụla na-amabiri ụtara ka oghere akpịrị ya ha. Onye loo nke karịrị ya, ọ gbàgbughị ya agbàgbu, ọ fụchie ya ikè. 

Ya bụ na n'oge gboo, nwoke ọbụla na-ebu ụzọ pịakọọ ma were uche gbakọọ okè ala ya na ihe o nwere, tupu o kpebie ụmụ ole ọ ga-amụ, ka o wee nwe ike inye onye ọbụla ihe ruuru ya, n'ihi na ha ghọtara onye riri amụ ebule ji íbì ụgwọ. Ya mere onye ọbụla ji ejikọlo onwe ya, ma mụrụ ole ọ ga-azụnwu.

Ọ bụrụ na ụmụaka ahụ amalite itolite, a ga-ebido na-egosi ha ihe ụfọdụ dị añaa ha kwesiri ịma banyere ezinaụlọ ha, ọ kachasị ndị bụ nwoke. Nna ha na-agbakwa mbọ kpọrọ ha na-aga ebe ụfọdụ okè ala ha, osisi na ihe ndị ọzọ ha nwere dị, maka na a sị na ọ na-adị mma a na-egosi nwata awọ n'ikpo okwute, a na-ébìbéree ya aka. Nke a bụ iji hụ na ụmụaka ahụ matara ebe ihe nna ha nwere dị, maka adịghị ama ama o nwee ka e siri chọọ ya, a hụghị ya.

Ọ bụrụ na ha tolite, ruo ihe e ji mmadụ eme, onye ọbụla n'ime ha ga-amalite gbaba mbọ dịka dimkpa, iji hụ na ụrụhụ adabughị ya, na mgbeye amagbukwaghị ya, maka na onye ụrụhụ enweghị ọnụ okwu n'ala Igbo. Nke a mere onye ọbụla n'ime ha na-eji agbasi mbọ ike, ka ọ kpata ego nke aka ya, karịa ichekwube maọbụ ịtụkwasị obi n'ihe ọ ga-eketa n'aka nna ya. Oge ha gbapụtachagoro ihe na mbọ, o wee ruo n'ịnọtu ala dịka nwoke ezinaụlọ nke aka ha; ihe a ga na-ekwuzị okwu ya oge ahụ bụ ịrụ ụlọ (ma ọ bụ ịlụ nwaanyị; dịka o siri bụrụ mmasị onye).

Nna nwe ezinaụlọ ga-akpọzie ụmụnna òkù, maọbụkwa kpọọ naanị mmadụ olenaole n'ime ha, tinyere ụfọdụ ndị nwadiala, ndị nnaochie na ndị ọzọ ga-anọ dịka ndị akaebe n'ihe gbasara idu obi maọbụ ikè ihe ahụ. Ọ ga-eweta wetá óké mmanya, ọjị, ose akpị, maọbụ sie nri, dịka aka ya ha, maọbụ dịka otu ha siri wee kwadote. Ụfọdụ ndị aka siri ike na-egbu ewu, ma kwado oriri pụrụ iche ụbọchị ahụ, n'ihi na ala obi bụ ọnụ okwu nwoke nwere be nna ya. Ọ pụtaghị na ya bụ ala ana-ebùkazị oke ibu; kama, o nwere oke ọñụ na-eso ya abịa, tinyekwuoro na ọ bụ ihe nketa kachasị ukwu nwoke na-enweta n'aka nna ya dịka nwoke.

Ihe ọzọ na-apụtakarịcha ihè ụbọchị ahụ bụ na a na-aga gbukatasịa osisi ogirisi, bụ nke a na-amanyesi n'ókè ala, maka na ọ bụ ogirisi ka e ji akpa ókè ala n'ala Igbo n'oge gboo ahụ. 

Ka ọ chọchaara ndị bịara abịa ọjị, di bi ụlọ ga-akọwara ụmụnna ihe o jiri kpọ ha, ma tachaịrị ha mmanya ka ha wee tútùghaa akpịrị, tupuu ọ kpọrọzie ha niile na ụmụ ya gaba ebe ọ chọrọ isi wee nye ha ala obi. Ọ ga-anọzị ebe ahụ wee kèé ala ahụ dịka ọnụọgụgụ ụmụ ya ndị nwoke siri dị. Ọ gaghị agụnye nke diọkpara, maka na a dịghị edu di ọkpara obi n'ala Igbo, n'ihi na ọ bụ ya nwe ngwuru be nna ya. A naghị enyekwa ụmụ nwaanyị ala obi n'ala Igbo, dịka o si wee dị n'omenala Igbo, beere sọ onye a hara àhà n'ihi ụkọ nwoke n'ezinaụlọ; ị mara na ọ bụ ya ga-akpakọrọ ihe niile nna ya nwere, n'ihi na ọ bụ ya bụ nwoke bụrụkwa nwaanyị. A sịkwa na ọ na-abụ a chọọ nze, a hụghị, ọ bàárá ofeke. 

Mana ọ dịkwa mma ime ka a mara na a ga-ebu ụzọ mee ọtụtụ omenala ndị ọzọ dị iche iche n'isi nwaanyị ahụ, tupuu a sị na ọ bụrụla onye a hara àhà, maka na e sighị n'ọdụ agbọ akwụ; e sighịkwa n'elu aghọrọ mmiri ọkụ.

Ọ bụrụ na nwoke a kèchaa ala obi ahụ, ụmụ ya ga-amalite iwè oke ha n'ótù n'ótù, malite n'onye tọchara, ma ewepu nke dịọkpara. Onye were nke ya, a manyere ya ogirisi n'ebe ókè ya jedobere maka na a sị na ụtọ ala bụ n'ókè ya ka ọ dị. Ogirisi ahụ too, ọ bụrụ ihe ịrịba ama na ihe ngosi okè nyere okè ala na ibe ya.

Na nkọwa doro anya, inye mmadụ ala obi abụghị ikè ihe n'uju, kama ọ bụ nna igosi ụmụ ya ndị nwoke ala ebe ha ga-arụ ụlọ. Mana otu ọ dị, ụfọdụ na-emekọta ihe niile ahụ otu ụbọchị, ọ kachasị n'ebe e nwere nsogbu, ebe a na-acha nwoke ọkụ, maọbụ ebe nna nọrọgoro nso n'ala ili ya; ka ọ ga-abụ onye chọọ ịnwụ, ọ nwụọrọ onwe ya n'obi òfò. 

Ọ bụrụzie na e duchaa obì, chọọ ike ihe, mgbe ahụ nke diọkpara emezie ihe a na-akpọ ise use nwa diọkpara, bụ nke ọ ga-anọ na ya wee tụọ aka mpaghara ala ebe ọbụla ọ chọrọ iwere, n'ihi ọnọdụ ya dịka diọkpara. Ọ bụ ebe na mpaghara ala ole masịrị ya ka ọ ga-atụ aka ma sere ya dịka use nwadiọkpara. 

Oge gboo ahụ bụ ogè mmadụ na-enwe obi ebere, ma bụrụkwa oge mmadụ na-akpa n'ala kpa n'ọfọ tupu o mee ihe ọbụla ọ chọrọ ime, maka na o nweghị ihe mmadụ jiri ihe nke ụwa wee kpọrọ oge ahụ.

N'otu aka ahụ, obere nwa na nwoke na-enwekwa ihe nne ha, ma ọ bụrụ na o nwere ala mbụbọ nna ha nyere ya ka ọ na-akọ, maọbụ dịka ebe ọ ga na-ekpofu ahịha. Mana ọ ga-echerekwa ruo mgbe nne ya nwụrụ, tupu ọ malite itinye aka n'ebe ahụ, ka o wee ghara ịbụ iri ya ekpe na ndụ; ma nke diọkpara ga-enwekwa ndidi ahụ ka nna ya laa mmụọ tupu ọ malite iri ya ekpe. A na-eme ihe niile ndị a n'ụzọ udo, ma werekwa ọñụ rie ihe e butere, gbasaa. Onye ọbụla agazie rụba ma webe ihe n'ala nke ya.

Nke a wee bụrụ etu e si eme mmemme idu obi n'oge mbụ ahụ, bụ oge ewu na-akpa n'ukwu ụkwa.

Ka ọ dị n'oge ugbua, ihe ndị a niile adagharịchaala ma na-adazịkwa ọ chaa achaa gbute, ọ chaghị acha gbute. 

Ugbua n'ala Igbo, ọ bụghị naanị na ụfọdụ ụmụ okorobịa na-atụkwasịzị obi n'akụnụba nna ha na ihe ha ga-ekèta n'aka ya, ma gharazie ịgba mbọ n'onwe ha dịka nwoke, iji kpata akụnụba nke ha; kama a na-emezi idu obi ya n'ụzọ 'tigbuo, zọgbuo', karịa ime ya n'ụzọ udo. Ụfọdụ na-akụchakwuzị ọgwụ ma na-egbu mma ebe a na-edu obi, maka na e bighịzị ebi; ọtụtụ ezinaụlọ bụzịkwa ọkụ, ebe ụfọdụ kpakọrọzịkwara ihe niile nna ha nwere, jide ya naanị ha, n'ihi ọnọdụ ha dịka diọkpara maọbụ onye kachara selite isi n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ.

Ụfọdụ ụmụnwoke na-anọzịkwa n'afọ na-achọ ala obì ugbua, ka ha wee rewaa ya isi ma buru ego ya lawara mba ofesi, ga mefusie maọbụ gbafusie ya n'arabanko. 

Ụfọdụ ndị nna anaghịzịkwa ekwe edu ụmụ ha obi n'oge kwesiri ekwesi, n'ihi na ha chere na ha ga-epu ome n'ụwa, bụkwazị nke na-eme na ụmụaka ahụ ndị anya adịghị mma na-aga chọọ ụzọ ha ga-esi 'mekpuge' nna ha ahụ maọbụ were ọgwụ fegbuo, maọbụ kwanụ fechie ya anya. A sị na onye jụ ọchịchà, jụ ọgịga, e mee ya ihe a na-eme osisi kwụchiri ụzọ. 

Ihe ndị a bụzị ihe ndị na-eme na idu obi na-adazị nghatangha n'ala Igbo taa, ma bụrụkwazie nke tigbuo zọgbuo na ọgbaaghara jupụtara n'ime ya, maka na a na-ahapụzị ịsụ n'ikwe, sụba n'ala; ihe niile wee na-atọzị aja aja.

N'ebe ọ dịkarịsịrị nkenke, ndị Igbo kwesiri ịghọta na idu obi bụ omenala kwesiri ekwesi, bụrụ oge inye ihe nketa, ma n'ihi nke ahụ, bụrụkwa nke e kwesiri iji uche, udo na ọñụ zuru òkè wee mee wee na-eme n'ụzọ ziri ezi, maka na ihe e mere na nzuzu amụtaghị nzuzu, o bie na nzuzu.

Ọ ga-amagbu onwe ya ka ndị Igbo na ọtụtụ ezinụlọ dị iche iche laghachi azụ n'etu ndị Igbo si edu obì n'oge gboo, ma na-agbasòkwa usoro ahụ wee na-eme ya taa n'ala Igbo. Ọ dịkwa mma ime ka a ghọta na a na-ere ala obi ere n'ala Igbo, n'agbanyèghị etu ọ sọrọ ego si kọọ onye nwe ya ụkọ. Onye rere ala obi ya ereela ọnọdụ ya na òkè ya n'ezinụlọ. Onye mere ka idu obi bụrụ nke e mere n'usoro ọgbaaghara jupụtara na ya na-ewepụtakwara ụmụ ya na ụmụ-ụmụ okè ọgbaaghara nke ha dịka ọ na-ewere ala obi ahụ, maka na ọ maghị ebe ala obì a na-enye ya siri pụta, nakwa etu e siri zọta ma chebegide ya bụ ala, o wee ruo ya aka dịka ihe nkèta, n'akwụghị ụgwọ ọbụla.

Amamihe bụ ọgwụ nzuzu; nghọta bụkwa ọgwụ okwunaụka.

Onye a gwara kwe, a hụkwa ọzọ, a gwa ya. Mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.