Ndị Amị Awakpola Ogige Ndị Omekoome, Bute Akpati Ozu, Égbè, Ọgwụ na Ngwaọgụ

Mar 30, 2022 - 23:17
 0
Ndị Amị Awakpola Ogige Ndị Omekoome, Bute Akpati Ozu, Égbè, Ọgwụ na Ngwaọgụ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụbọchị niile nwere ike bụrụ nke onyeohi, mana otu ụbọchị ga-abụrịrị nke onye nwe ụlọ.

N'ịgbaso nke a, ndị ọrụ agha ala Nigeria, nke mpaghara 82 Division nọrọ na nsonso a wee wakpo ogige ebe nzuzo ndị ojiegbe, bụ ndị a maara dịka ‘Unknown Gunmen’ na steeti Anambra, wee chụọ ha ọsọ ụkwụ eru ala, bukọtasịkwa ihe dị icheiche ha ji akpa ike.

Ọ dị ncheta na ndị ojiegbè a bụ ndị omekoome ahụ na-emekpa ndị mmadụ na obodo dị icheiche ahụ na mpaghara ebe dị icheiche nke steeti Anambra, ọkachasị mpaghara Ihiala, Orsumoghu, Azia, Ebenator, Ezinifite, Ukpor, Ụtụ, Nnewi na mpaghara ebe ndị ọzọ ha na-akpa ike. 

Ọ bụkwa ha bụ ndị malitere ịga n'obodo n'obodo na n'ụlọ n'ụlọ na nsonso a wee na-anakọrọsị ndị ọrụ nchekwa obodo dị icheiche egbe ha ji arụ ọrụ. Ọ bụ ha bụkwa ndị ahụ meerela ka ọ bụrụ iwu na onye ọbụla ga-akwa ozu maọbụ mee nnukwu mmemme ọbụla na mpaghara obodo ebe ahụ ha kacha akpa ike ga-abịarịrị ịhụ ha anya, nye ha ihe ha na-eri, ma chọọrọ ha ego mgbọ; emeghị ma ya, ha abịa jiri egbe mebisie ihe ebe ahụ ụbọchị ahụ.

Ọ bụ n'ihi nke a ka ndị ọrụ agha a jiri hazie ma kwado onwe ha nke ọma wee wakpò ebe nzuzo ha, bụ ebe ha na-anọ ahazi na na-akwado ọrụ, dị n'Orsumoghu, n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala nke steeti Anambra, ma chụọ ha ọsọ n'ebe ahụ.

Dịka ozi a kụpụrụ banyere nke ahụ na nsonso a site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi ala Nigeria, bụ Brigadier General Onyema Nwachukwu siri kọwaa, ndị omekoome ahụ na ndị amị ahụ kwàrà mgbọ dị egwu oge ha na-achọ ịbata ebe ahụ, n'ihi na ndị omekoome ahụ busoro ha agha dị dị egwu, iji wee gbochie ha.

Kaosiladị, ọ sị na ha gosiri ndị omekoome ahụ na nwoke na ibe ya hà bụ n'ọnụ, ha wee hapụ ogige ahụ na ihe dị icheiche dị ebe ahụ, rie mbọmbọ ọsọ.

O kwuru na ihe dị icheiche e nwetara n'ogige ahụ gụnyèrè ọtụtụ ụdị egbe dị icheiche, ọtụtụ mmà, ọtụtụ ụdị ekwentị dị icheiche, igwè laptọọpụ, otu ụgbọala Hilux, akpati ozu, okwu arụsị, na ọtụtụ ọgwụ dị icheiche

Ọ kọwara na nnyocha e megoro na-akọwa na ebe nzuzo ndị omekoome ahụ bụkwa ebe onyeisi ndị ọrụ nchekwa obodo ahụ, bụ Maazị Innocent Obieke (bụ onye a maara dịka ‘Double Lion’) na-anọkarị oge ụfọdụ, n'ihi na o so na ndị ha na ndị omekoome ahụ na-arụkọ ọrụ na nzuzo, ma bụrụkwarị onye na-akwadoro ha ọrụ ma na-agbara ha ama oge ụfọdụ, n'agbanyèghị na ọ bụ onyeisi ọrụ nchekwa obodo.

Nwoke ahụ bụkwàzị onye e kwuru na ọ nọ n'ọsọ ugbua n'ihi na ndị ọrụ amị ahụ na-achọgharị ya na ndị otu ya ugbua.

Brigadier General Nwachukwu gwakwazịrị ọhaneze ka ha gaa n'ihu inye ndị ọrụ agha ahụ ozi dị mkpa ga-enye aka ime ka ọrụ ha na-aga nke ọma n'agha ahụ a na-ebu megide ndị omekoome ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484