Super Eagles Dachasịara, Chịlie Ọkpa Elu

Apr 1, 2022 - 21:55
Apr 2, 2022 - 15:16
 0
Super Eagles Dachasịara, Chịlie Ọkpa Elu
Onye dachasịara, chịlie ọkpa elu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ ụbọchị Wenezdee dịka ndị òtù egwu bọọlụ Super Eagles nke ala Nigeria dachasịara, chịnie ụkwụ enu n'asọmpi ntozuoke ahụ ha na ndị òtù egwu bọọlụ Black Stars nke mbà Ghana gbara maka isonye n'ịzọ iko mba ụwa nke ahọ 2022.

Asọmpi ahụ wééré ọnọdụ n'amaegwuregwu MKO Abiola Stadium dị n'Abuja bụ isi obodo ala Nigeria bụ nke ọtụtụ ụmụafọ Nigeria jiri nwee ntụkwasịobi itozuoke ịgbago na Qatar, n'ihi na ha agakwubụọla ndị Ghana be ha ụbọchị Fraịdee gara aga, ebe ha nọrọ n'amaegwuregwu Kumasi wee gbaa onwe ha onye laba onye laba, n'enweghị ndị sụnyere ibe ha ọkpụ ọbụla.

Ọ bụ nke a mezịrị ọtụtụ ndị mmadụ jiri nwee ntụkwasịobi na ọ bụ asọmpi nke ụbọchị Wenezdee ahụ gara aga bụ ohere ikpeazụ Super Eagles nwere.

Ọtụtụ ụmụafọ Nigeria nwèkwàrà olileanya na Super Eagles ga-eji ọkpụ wee nyejuo ndị Ghana afọ na asọmpi ahụ, n'ihi na ọ bụ na be ha (Nigeria) ka ha nọ, tinyekwuoro na mbịarabịara anaghị akarị onye nwe ụlọ.
 
Kaosiladị, ihe ndị ahụ niile mèchààrà bụrụ nrọ ịba, ọkachasị malite n'oge nwa afọ mba Ghana, bụ Thomas Partey jiri ọkpụ mbụ wee sị Super Eagles ‘Kedu ka ụnụ siri kwado?’ ka ọ gachara naanị nkeji iri e jiri malite ya bụ asọmpi.

Nke ahụ mekwazịrị ndị Super Eagles jiri ghọta na ihe ahụ abụghị egwu a pà ụtaba n'aka agba; ha wee teta n'ụra.

Ka ọ gachara nkeji iteghete e jiri sụnye ha ọkpụ ahụ, ndị Super Eagles sụnyèkwàra ndị Ghana ọkpụ nke ha site n'adọbaagbaa (penalty) nke e gburu megide Ghana, ma bụrụkwa nke ọ bụ onyeisi òtù egwu bọọlụ Super Eagles, bụ Captịn William Troost-Ekong gbara n'aha Nigeria, wee nyàkaa onye ochee bọọlụ ndị Ghana mpara, ma tụje ya n'akụkụ nke ọzọ. Aka wee kwòó.

Ka nke a gachazịrị, ndị òtù egwu bọọlụ abụọ ahụ kwèchirizịrị ka akpụ kwụrụ ụdọ, nke na o nweghịzị onye n'ime ha kwere ka a sụnye ha ọkpụ ọzọ, n'agbanyeghị ekpere niile ụmụafọ Nigeria na-ekpe ka Super Eagles sụnyekwuo ọkpụ ọzọ, maka na ha ma na ha na-ala ma ọ bụrụ na ha asụnyeghị ọkpụ ọzọ, maka na ọ bụ be ha ka a nọ.

Otu abụọ ahụ kwechirizịkwara, wee ruo ọgwụgwụ oge nkeji iri iteghete e ji agba egwu bọọlụ gwụrụ, ya na nkeji ise ọzọ a tụkwàsàrà n'elu ya. Asọmpi ahụ wee mechaa bie n'ótù ọ̀kpụ̀ otu ọ̀kpụ̀.

O wee bụrụ etu ahụ ka ndị Super Eagles siri wee dachasịa, chịlie ọkpa elu.

Ka ya bụ asọmpi bịara n'isi njedobe, ọtụtụ ụmụafọ Nigeria iwe juru obi wụbàtàkwàzịrị n'ime ogige amaegwuregwu ahụ, wee malite imebisi ihe na ime mkpamkpa dị icheiche, iji gosipụta na obi adịghị ha mma banyere mmeri ahụ e meriri Super Eagles, nke pụtara na ha agaghị esozịkwa zọọ iko mba ụwa n'ahọ a.

Kaosiladị, akparamagwa ha ahụ na ngosipụta iwe ahụ ha mere nọ ọdụ ka ụtarị a na-apịa nkịta nwụrụ anwụ, n'ihi na ọ̀ pụghị ịkpọghachi ya azụ na ndụ.

Ihe mere eme emeela.

Super Eagles siri dachasịara chịlie ọkpa elu.

Ụmụafọ Nigeria, ndo nụ̀.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484