Ọkaokwu Ụlọ Omeiwu Anambra Arụọrọla Ndị NUT Ụlọọrụ Ọhụrụ n'Ayamelum

Oct 23, 2021 - 22:17
 0
Ọkaokwu Ụlọ Omeiwu Anambra Arụọrọla Ndị NUT Ụlọọrụ Ọhụrụ n'Ayamelum

Izunna Okafor dere akụkọ a

Okaokwu ụlọ ọgbakọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor arụọrọla òtù ahụ jikọtara ndị nkụzi bụ 'Nigeria Union of Teachers (NUT)', ngalaba nke okpuruọchịchị Ayamelụm isi ụlọọrụ ọhụrụ.
 
Ya bụ ọmarịcha ụlọọrụ bụ nke a rụrụ n'obodo Anakụ, ma bụrụkwa nke e mere mmemme mgbape ya na nsonso a, bụkwa ebe Ọkaokwu ahụ nọrọ wee nyefèé ndị òtù ahụ igodo ụlọọrụ ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ na-enye ndị òtù ahụ igodo ụlọ ahụ, Maazị Okafor kọwara nke ahụ dịka mmezupụta nkwà o kwere ha; ọbụladị dịka o kelekwara aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka iwetè ihe e jiri wee rụọ ya bụ ụlọ.
 
O chètèèrè ndị bịara mmemme ahụ na Gọvanọ Obianọ atụnyela ụtụ dị ukwuu ma mekwa ọtụtụ ihe dara ụda n'ịkwalite ngalaba mmụta na agụmakwụkwọ steeti ahụ, bụkwa nke pụtara ihè n'etu ụmụakwụkwọ steeti ahụ sizị eme nke ọma ma na-enwetekwa mmeri dara ụda n'ule na asọmpi dị icheiche, ma n'ala Nigeria na n'ogoogo mba ụwa.

N'okwu ya n'aha ndị otu ya, onyeisioche òtù NUT n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Nonye Chibueze, nke ọ bụ Oriakụ Maria Ugwor nọchitere anya ya, kọwàrà Ọkaokwu Anambra dịka nwoke na-edebe okwu ya, n'ihi etu o siri mezupute nkwà ahụ o kwere ha, nà etu o si emezuputekwa nkwà ndị ọzọ o kwere.

Ọ kpọpụtasịkwara uru dị icheiche ụlọọrụ ahụ ga-abara ndị òtù ahụ, ma kwekwazie nkwà na ndị òtù NUT ga-akwàdo ma tụnyere otu ndorondoro APGA na nhọpụta ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, iji hụ na mmepe na mnwògharị ahụ na-aga n'ihu na steeti ahụ ugbua ga-adịgide.

Onyeisioche okpuruọchịchị ime obodo Ayamelụm, bụ Maazị Ben Onyeabor kọwara na ọ bụ nnọọ nnukwu ihe ọrụ ebube na ngọzị si n'aka Chineke na ha nwere Maazị Okafor dịka onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ahụ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra; ma kelee ya bụ nwoke maka ihe ọma dị icheiche o meputagoro kemgbe o siri banye n'ọkwa ahụ, kpekwa ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi, ịkwụghachi na ichekwa ya.

Mmemme ịgbape ụlọ ahụ dọtara ọtụtụ ndị sitere obodo dị icheiche n'okpuruọchịchị ahụ wee bịa, ma bụrụkwa nke dọtara ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n'ọrụ gọọmenti. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484