Ndị ndú Ayamelum Akwàdóla Ọkaokwu Anambra Màkà Ịzọ Ọkwa Nke Ugboro Atọ

May 13, 2022 - 18:06
 0
Ndị ndú Ayamelum Akwàdóla Ọkaokwu Anambra Màkà Ịzọ Ọkwa Nke Ugboro Atọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Òtù a maara dịka ‘Ayamelum Leaders of Thought’, bụ́ otu kachasị elu n'okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum nke Anambra steeti, nke bụ́kwa okpuruọchịchị na ọgbọ nta nkwàdó nke Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ́ Rt. Hon. Uchenna Okafor, ekwuputala mkpebi ha na nkwàdó ka nwa amadi ahụ gaghachi azụ ga nọ̀chitekwa anya ha ozo n'ụlọ omeiwu ahụ na ntuliaka izugbe ahụ na-abịa n'ihu.

Onyeisioche ndị òtù ahụ, bụ́ Chiifu Sir Tony Chinedu kwupụtàrà nke a oge ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụọnụ na nsonso a n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, bụ́ ebe ọ nọrọ wee mee ka a mara mkpebi nà ebe ndị òtù ahụ kwụ̀ n'ihe gbasara onye ga-anọ̀chite anya ọgbọ nta nkwàdó ahụ n'ụlọomeiwu steeti ahụ n'ahọ 2023.

A ga-echeta na Ayamelum bụ otu ọgbọ nta nkwàdó kwụụrụ onwe ya ma bụrụkwa okpuruọchịchị ime obodo nwere mpaghara atọ - Ayamelum North, Ayamelum South, na Ayamelum Central.

A ga-echetakwa na Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor bụ onye sitere mpaghara Ayamelum North, ma bụrụkwa onye nọchitegoro anya mpaghara ahụ ihe dị ka afọ asatọ ugbua, ebe ọ nọrọ afọ anọ mbụ ya n'ụlọomeiwu dịka naanị onye omeiwu, ma na-nọzị ahọ anọ nke abụọ ya ugbua dịka Ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ.

Kaosiladị, dịka ntuli aka izugbe nke afọ 2023 na-akpụdòbe nso, ụfọdụ ndị sitere ọgbọ nta nkwàdó ahụ malitèrè iji usoro mgbasa ozi dị icheiche wee na-ekwu ihe dị icheiche megide ịkwàdò ya bụ Ọkaokwu ka ọ gaa nọ̀chitekwa anya ọgbọ nta nkwàdó ahụ nke ugboro atọ, ma na-arụtụ aka na ọ nọchìtèghị̀ anya ha nke ọma, tinyekwuoro na ha nwere usoro ndị mpaghara a jee, ndị mpaghara ọzọ ejee n'ọgbọ nta nkwàdó ahụ.

Otú ọ dị, mgbe ha na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtụka okwu, ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'Ayamelum, bụ ndị a maara dịka ‘Ayamelum Leaders of Thought’ katọ̀rọ̀ ihe ahụ ndị ahụ kwuru megide Ọkaokwu Uche Okafor, ma mekwa ka a mara ebe ha kwụ̀ nà mkpebi ha n'okwu ahụ.

Dịka onyeisioche ndị òtù ‘Ayamelum Leaders of Thought’ bụ Chiifu Tony Chinedu siri kọwaa ndị òtù ahụ mere ọgbakọ̀ na nsonso, bụ ebe ha nọrọ wee mee ka o doo anya na e nweghị nhazi ọbụla kwuru na ndị mpaghara a jee ndị mapaghara ọzọ ejee n'ọgbọ nta nkwàdó ahụ. 

Ya mere o kwuru na ọ gbagwojuru ya anya etu ụfọdụ ndị mmadụ ga-esi na-ekwu na Ọkaokwu Uche Okafor agaghị anọchitezị anya ọgbọ nta nkwàdó ahụ ọzọ maka ihi mpaghara sịkwa, mpaghara asịghị.

Ọ kọwara na ndị otu ahụ nyere Uche Okafor nkwàdó ịga nke ugboro atọ oge ọ bịara gwa ha banyere mmasị ya, bụkwa nke ọ sị na ha kwàdòrò n'ihi na ọ rụpụtara ihe a na-ahụ anya ma nọchitekwa anya ha nke ọma n'ime afọ ole gara aga ọ nọ̀gòrò n'ụlọ omeiwu ahụ. 

O kwukwara na ihe ọzọ ha jiri kwàdó ya bụ maka ọkwa o ji dịka Ọkaokwu ụlọ omeiwu ahụ, bụ nke ndị ọgbọ nta nkwàdó ahụ ritegoro ọtụtụ uru site na ya, ma bụrụkwa nke ha nwere olileanya anya na ọ ka ga-ejidekwa ma ọ gaghachi azụ n'ụlọ omeiwu ahụ.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, onyeisi ọchịchị obodo Ifite-Ogwari ma bụrụkwa onyeisioche ndịisi ọchịchị obodo niile dị n'Ayamelum, bụ́ Ọkaiwu Oliver Okonkwo; onye jipùrù ọkwa na nsonso a dịka onyeisioche nchereoge n'okpuruọchịchị Ayamelum, bụ́ Ọkaiwu Benjamin Onyeabor; nà onyeisioche otu ndọrọndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ n'okpuruọchịchị Ayamelum, Hon. Livinus Onyenwe kwujọrọ ma katọ̀ọ́ n'ihe ahụ ụfọdụ ndị mmadụ kwuru megide nhọpụta Ọkaokwu Uche Okafor nke ugboro atọ, n'ihi na ha sị na ọ rụghị okporoụzọ na ọrụ mmepe ndị ọzọ na mpaghara ahụ. Ha chètààrà ndị na-ekwu ụdị okwu dị etu ahụ na ọrụ onye omeiwu abụghịkwanụ ịrụ okporoụzọ, kama na ọ bụ ime iwu.

Kaosiladị, ha kpọụtara ụfọdụ n'ime ihe dị icheiche nà ọrụ mmepe nke Ọkaokwu Uche Okafor kwàdòrò maọbụ dọta n'Ayamelum, nke gụnyere ịzọpụ̀tà ndị mpaghara ahụ na nsogbu enweghị ọkụ karịrị, bụ nke ha nọrọ na ya ihe karịrị afọ iri; site n'iweghàchi ọkụ latiriki na mpaghara ahụ; ikesà ihe eji akọ̀ ugbo na mgbe nà mgbe, inye ndị ntorobịa nkwàdó, ikwado ịrụ okporoụzọ ‘Onitsha—Aguleri—Omor—Adani Road’ tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'aka nke ya, onye bụbu ode akwụkwọ izugbe gọọmentị steeti ahụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Emergency Management Agency Anambra (SEMA)’, bụ Chiifu Paul Odenigbo, nyere nkọwa banyere etu e si ekesa ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche n'okpuruọchịchị ahụ, bụ nke nwere mpaghara atọ.

Dị ka ya si kwuo, Ayamelum Central (nke naanị obodo Omor dị na ya) na-ejigide ọkwa onyeisioche okpuruọchịchị ime obodo ahụ; Ndị Ayamelum South (nke gụnyere Umumbo, Umuerum na Anaku) na-ejigide ọkwa Kọmishọna na ụfọdụ ọkwa ndị ọzọ yiri ya; ebe Ayamelum North (nke gụnyere Omasi, Umueje, Ifite-Ogwari na Igbakwu) na-aga anọchite anya ha n'ụlọ omeiwu steeti ahụ.

Ọ gara n’ihu kwuo na ha nwere ọgbakọ dị oke mkpa n’afọ 2018, iji kparịta ụka banyere nhazi ike ọkwa na mpaghara na mpaghara, bụ ebe a nọrọ wee kwuo ka Maazị Uche Okafor jee nọchite anya ha nke ugboro abụọ n'ụlọ omeiwu ahụ, ma bụrụkwa nke ụfọdụ anabataghị, ma soro ya wee zọọ ọkwa ahụ, mechaa daa.

Chief Odenigbo, onye bụkwa onyeisi ndu APGA n’Ayamelum kwùrù na ha nwèkwàrà ụdị ọgbakọ ọzọ yiri nke ahụ n'Awka n’ime ọnwa gara aga, nke ndị e ji okwu ha agba izu n'Ayamelum chịkọ̀bara, ma bụrụkwa nke ọ kwuru na e nweghị nkwekọrịtara ọhụrụ e mere na ya banyere etu nhazi ịkesà ọkwa na mpaghara na mpaghara, nke mezịrị ha jiri kpebie na ka ihe niile ka dịgodi etu ọ dị ugbua, ruo mgbe e mèchààrà ntuliaka izugbe ahụ a ga-eme n'ahọ na-abịa abị, ka ha wee nọ̀kọọ ọzọ wee kpebie usoro a ga-esi na-emezị ndị mpaghara a gachaa ndị ọzọ agaa n'ọkwa dị icheiche.

Dị ka o siri kwuo, mkpebi ahụ e mere ka ihe niile dịgodi etu ọ dị ugbua, pụtàrà na ha kwàdòrò ịzọ ọkwa nke atọ nke Maazi Uche Okafor, onye si mpaghara Ayamelum North, ebe ọ na ọ bụ ndị mpaghara na-ejere ha ụlọ omeiwu steeti.l, dịka ọ dị taa. O kwukwara na otu onye si Ayamelum South bụkwa onye Gọvanọ Soludo kpọlitere n'ọkwa dịka Kọmishọna na nsonso a; ebe onyeisioche okpuruọchịchị Ayamelum nke jipùrù ọkwa na nsonso a bụ̀ onye sitere mpaghara Ayamelum Central, bụ nke gbasòrò ma dabere na nhazi etu ahụ dị ugbua.

Na mbụ n'okwu ya, eze ọdịnala obodo Omasi, H.R.H. Igwe Dọkịnta Benjamin Onukwube Okeji, onye bụkwa onyeisioche otu jikọtara ndị eze ọdịnala niile nọ n'Ayamelum, ma bụrụkwa osote onyeisioche nke otu jikọtara ndị eze ọdịnala niile nọ na mpaghara ‘Anambra North’ kwuru na Rt. Hon. Okafor emela nke ọma n'ime afọ olenaole gara aga dịka onye nnọchi anya ha, ma kwupụ̀takwa nchekwube o nwere na ọ ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na e nyeghachi ya ikike ịnọ̀chìtè anya ha ọzọ n'ụlọomeiwu na nhọpụ̀ta a na-abịa abịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484