Onye isi ọchịchị mba Izrel adọọla mba Amerịka aka na ntị maka mba Iran

Onye isi ọchịchị mba Izrel adọọla mba Amerịka aka na ntị maka mba Iran

Mar 3, 2015 - 06:23
Jan 20, 2021 - 06:24
 0
Onye isi ọchịchị mba Izrel adọọla mba Amerịka aka na ntị maka mba Iran

Aka na-achị mba Izrel, bụ Benjamin Netanyahu, adọọla mba Amerịka aka na ntị maka nzukọ mkparịta ụbụbọ ịkpe udo ahụ nke na-aga n’ihu ugbu a n’etiti mba ụwa na mba Iran. Mgbe ọ na-agwa ndị omebe iwu nke mba Amerịka okwu n’isi obodo mba Amerịka, bụ Wọshintin, Netanyahu kwuru n’ịkpe udo a mba ụwa na mba Iran na-akwado bụ nnukwute ịhe mmekpa ahụ nye mba Izrel.

N’agbanyeghị n’ebum n’uche ya na Barack Obama, onye isi ala Amerịka, abụghị ofu n’ihe gbasara mmekọrịta mba ụwa na mba Iran, Netanyahu kelere Obama maka nkwado ndị Amerịka na-akwado mba Izrel. Netanyahụ kwuru si na mba Amerịka na mba Izrel bụ enyi oma. Netanyahụ kọtọrọ mkparị ụbụbọ ahụ na-aga n’ihu ugbu a n’etiti Iran na mba ụwa maka ịchọta ụzọ a ga-esi eme ka Iran ghara inwete akara ngwa ogbunigwe nuklia.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ihe gbasara mmekọrịta mba Amerịka na mba Izrel na-ekwu na otu Netanyahụ siri bịa njem a abụghị ihe ziri ezi, n’ihi na nanị ya na ndị isi otu Rịpọblikan bụ ndị kwekọrịtaranụ. Ọtụtụ ndị otu Demokrat na-agba abụbụ, ha ekweghị aga n’ogige ebe Netanyahu kwuru okwu ahụ, nke ha na-ege ya ntị. Nke a bụ maka na Netanyahu na onye isi ndị Demokrat, bụ Obama, ejighị otu obi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.