A Ga Enwògharị Usoro Okpuruọchịchị Steeti Anambra —Nwabunwanne

Apr 15, 2022 - 19:15
 0
A Ga Enwògharị Usoro Okpuruọchịchị Steeti Anambra —Nwabunwanne

Izunna Okafor dere akụkọ a


Dịka otu n'ime nzọpụụkwụ ya ịhụ na okpuruọchịchị niile dị na steeti ahụ na-arụ ọrụ nke ọma na etu a tụrụ anya; Kọmishọna ọhụrụ na-ahụ maka okpuruọchịchị, echịchị ọdịnala na ime na-eme n'ime ime obodo na steeti Anambra, bụ Maazị Tony Nwabunwanne ekwela nkwà inwògharị usoro okpuruọchịchị steeti ahụ.

Kọmishọna Nwabụnwanne kwupụtara nke a oge ọ malitere na njem nleta na njem nkọwaonwe n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na otu dị na steeti ahụ.

Njem nleta na njem nkọwaonwe ahụ bụ nke ọ malitere n'ime okpuruọchịchị Dunukofia na Njikoka, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'ihe metụtara okpuruọchịchị ime ime obodo, nke gụnyere Onyeisioche ụlọọrụ ‘Local Government Service Commission’ bụ Dọkịta Peter Egenti, na onyeisi òtù ‘National Union of Local Government Employees (NULGE)’, bụ Maazị Chikwelu Adigwe, na ụfọdụ ndị ọzọ soro ya wee gaa.

Kọmishọna Nwabunwanne kwuru na ebumnobi njem ahụ bụ ka ya na ndị ọrụ n'okpuruọchịchị ahụ wee nwee mkparịtụka, mara onwe ha, chọpụta ihe icheakamgba ha na-ezute, ma chọọ ụzọ a ga-esi weta ya na njedobe.

O kwuru na ọ bụghị eziokwu na Gọvanọ Chukwuma Soludo emechiela okpuruọchịchị niile dị na steeti ahụ maọbụ sị ndị ọrụ agazịla ọrụ; ma kọwaa na e nweghị ihe dị etu ahụ. Ọ gwakwazịrị ndị ọrụ nọ n'ebe ahụ ka onye ọbụla dị uchu n'ọrụ, ọbụladị dịka o chètààrà ha mkpebi na ebumnobi nke ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ iweta ezi mgbanwè na usoro bụ ịgba n'ime okpuruọchịchị niile na arụmọrụ ha na steeti ahụ.

O kwuru na oge adịghị anya, ọchịchị steeti Anambra ga-achịkọba ntụliaka okpuruọchịchị na steeti ahụ; ma kpọkukwazie ndịisi okpuruọchịchị dị icheiche ka ha zite amụmà na atụmatụ ọrụ kacha dị ha mkpa ugbua maka ileba ha anya. O kwezịrị ha nkwa ezi nchekwa ga-eme ka ha rụọ ọrụ ha n'enweghị egwu ọbụla.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, Dọkịta Egenti na Maazị Adigwe dụrụ ndị ahụ ọdụ ka ha gbaa mbọ nye ọchịchị ahụ nọ ugbua na steeti ahụ ezi nkwàdo kwesiri ekwesi, iji mezuputachaa ezi ebumnobi ahụ o nwere banyere ha, n'ihi na ihe banyere ha na ọdịmm ha na-emetụ ọchịchị steeti ahụ n'obi.

N'okwu ha n'otu n'otu, Ndịisioche nchereoge n'okpuruọchịchị ahụ a gara, Maazị Emeka Chinweze nke Dunukofia na Maazị George Ozoh nke Njikọka kèlèrè Kọmishọna Nwabunwaane maka ịmalitè ọrụ ozigbo, ya na etu o siri bịa kpọtụrụ ha. 

Ha rịọkwara ọchịchị steeti ahụ ka o wekwuo ụfọdụ ndị mmadụ n'ọrụ, iji nọchie ndị lagoro maọbụ ndị rugoro ịla ezumike nka. Ha kwezịrị nkwa na ha ga-enye ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nkwàdo etu a tụrụ anya, ma na-arụsikwa ọrụ ike dịka o siri kwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484