N'Imo, Nwoke Akwaala Arịrị Maka Nwa Ya Nwụrụ n'Ihe Mbigbọ

Jun 21, 2022 - 22:51
 0
N'Imo, Nwoke Akwaala Arịrị Maka Nwa Ya Nwụrụ n'Ihe Mbigbọ

 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

 Ka ọ gachara izuụka olenaole mmadụ dị otu narị na iri ise n'ọnụọgụ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba dapụtara n'ebe a na-esucha mmanụ agbidi, nke iwu akwadoghị (illegal refinery) dị n'Abaezi, Egbema, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ohaji/Egbema na steeti Imo; nna otu n'ime ndị ahụ ọkụ gbagburu, Maazị Uche Okwuodo enwebeghị ike ịghọta ma kwete n'ezie na nwa ya nwoke gbara afọ iri na asaa, Onyekachi Okwuodo, anwụọla pịị ma bụrụkwa onye a gaghị ahụkwa anya ọzọ n'ụwa a.

 N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na nsonso a, ya bụ nwoke sị na ọ bụrụ na o nwere ka o si metụ ya n'ahụ na ọkụ ga-agbagbu nwa ya nwoke ahụ o hụrụ n'anya, na ya gaara eme ihe niile o nwere ike ime, iji hụ na ọ nọdụrụ ala n'ụlọ na gharakwa ịpụ̀ àpụ̀ ụbọchị ahụ ya bụ ihe mere.

 Okwuodo, bụ onye kapịnta na nwunye ya na-azụ obere ahịa na be ha bụ Etekuru, ka a hụrụ na ha ka nọ n'oke mwute n'ihi ọdachi ahụ. Anyammiri juru ha anya n'ihi na o kweghị ha odidi.
 
Okwuodo, onye kabara ahụ gwa ndị ntaakụkọ okwu, kọwara otu nwa ya nwoke siri nwụ na ya bụ ọdachi, ma hapụzie ọchịchọ obi ya nke bụ dibia bekee. 
Onyekachi, dịka nna ya siri kwu, nabatara ịrụ ọrụ n'ebe nhazi mmanụ ahụ iwu akwadoghị ka o wee nwee ike nweta ego, ma chekwaa ya maka ịnweta ọchịchọ nke obi ya. Ọ sị na nke kacha agbawa ya obi bụ na ọ bụ ụbọchị ahụ ọkụ gbara bụ ụbọchị mbụ Onyekachi tụrụ ụkwụ ebe ahụ. O kwukwàrà na ọ bụ enyi ya, onye nwụkwuru n'ihe mbigbọ ahụ mere ka ọ mata banyere ọrụ ahụ nke iwu akwadoghị.
 Okwuodo, onye nke nọ n'oke mwute sị: "Ruo ugbua, ekwetebeghị m na nwa m nwoke, Onyekachi, anọghịzi. Anyị nọkọrịtara nkeọma. Ọ gwara m banyere ọchịchọ nke obi ya, ọ na-agụkwanụ akwụkwọ ma na-agbasi mbọ ike iji hụ na ọ bịara na mmezu. Agwara m ya enyela ndụ ya nsogbu, na ọ bụrụ na o mee nke ọma n'ule JAMB, na anyị ga-ama ihe anyị ga-eme iji nweta ego ọ ga-eji gụrụ akwụkwọ gaa n'ihu. Mana ugbua, ọ nwụọla, ya na ọchịchọ ya niile ahụ ịgụ akwụkwọ. 

“Onyekachi bụ nwa nke abụọ n'ime ụmụ ise m mụtara. O nwere agwa ọma. Ọ gbara ahọ iri na asaa, lee ule SSCE n'ahọ gara aga, ma nwee olileanya ịgụrụ akwụkwọ gaa n'ihu. Mana ugbua, ọnwụ emechiela ihe niile n'ebe ọ nọ. Ákà m na-echeta otu enyi ya siri mmee ka ọ mata banyere ya bụ ọrụ dị n'ebe a na-esucha mmanụ. Ọ gabeghị ebe ahụ mbụ. Enyi ya bịara n'ụlọ anyị kpọrọ ya, ha pụọ, o wee bụrụ njem alọta alọta n'ebe ụmụaka ahụ nọ."
  
   Nwoke ahụ gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị ntorobịa sonyere n'ọrụ ahụ, bụ ndị ocheghị na onwere otu onye n'ime ha dị ndụ, ka ya bụ ihe mechara.
 Gbasaara otu o siri nụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ sị: "Anọ m n'ụlọ oge nwa m nwoke nke mbụ ji ọsọ gbabata, gwa m na nwanne ya nwoke anwụọla n'ihe mbigbọ mere ahụ a na-esucha mmanụ, n'ihi na a nụrụ nnukwu mkpọtụ n'ogbe a niile. Ekweteghị m, wee ruo mgbe m soro ya ruo, ma anyị enweghị ike ịbịa nso ebe ahụ. Ọkụ ahụ karịrị akarị. Anyị nọ ebe tere aka na-ekiri ya, n'enweghị ihe anyị menwuru ka ọ na-agba na-aga n'ihu."
 O kwuru na ọ gbawara ya obi ịhụ ka nwa ya nwoke na-ere n'ime ọkụ, ma o nweghị ihe ya nwere ike ime.
 Otu onye obodo ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ebe nhazi mmanụ ahụ iwu akwadòghị nyèrè ndị ntorobịa obi siri ike ohere ọrụ ha ga-arụ nwa mgbe nta. Ndị kwetere ịrụ ọrụ ahụ bụ ndị kpebiri, ihe ọ pụtara, ya pụta.
 Dịka onye ahụ siri kwu, ọtụtụ ndị ọrụ ahụ bụ ndị ntorobịa sitere obodo dị n'Ohaji/Egbema, ndị n'enweghị ike inwete ọrụ a ga-akwụ ha ụgwọ, nke mere ka ha sonye n'ọrụ ahụ iwu akwadòghị, iji nyere ndụ aka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484