Agam Elebàgharị Anya n'Ihe Banyere Ịtọhapụ Nnamdị Kanụ — Buhari

Nov 25, 2021 - 22:49
Nov 26, 2021 - 09:05
 0
Agam Elebàgharị Anya n'Ihe Banyere Ịtọhapụ Nnamdị Kanụ — Buhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari (nke anọ n'aka ekpe), Maazị Mbazulike Amaechi (nke atọ atọ n'aka ekpe), Dọkịta Chris Ngige (nke mbụ n'aka nri), Chukwuemeka Ezeife (nke abụọ n'aka ekpe) na ndị ọzọ sonyere na njem mkpọtụrụ ahụ

K

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọ ga-elebàgharị anya n'ihe gbasaara ịtọhàpụ onyeisi ndị òtù IPoB, bụ Maazị Nnamdị Kanụ, bụ onye e jidere ma kpọchie ya n'ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa 'Department of State Service (DSS) kemgbe ọnwa olenaole gara aga ugbua.

Onyeisiala Buharị kwupụtàrà nke a n'okwu ya oge ndị ndu na ndị e ji okwu ha agba izu n'ala Igbo gara kpọtụrụ ya n'isi ụlọọrụ ya dị n'Abụja, bụ isi obodo Nigeria maka ịgwa ya okwu banyere ịtọhapụ ya bụ nwa amadi ka ọ laara onwe ya.

Ndị ahụ e ji okwu ha agba izu sóró wee gaa njem mkpọtụrụ ahụ gụnyere Gọvanọ chịbụrụ steeti Anambra n'oge mbụ, bụ Dọkịta Chukwuemeka Ezeife; onye mbụ jiri ọkwa dịka Minista na-ahụ maka njem ọdụ ụgbọelu n'ala Nigeria, bụ Mbazulike Amaechi; Bishọọpụ Sunday Onuoha; onyeisi òtù Aka Ikenga n'oge mbụ, bụ Goddy Uwazurike. Ndị ha na onyeisiala nọ oge a bịara njem mkpọtụrụ ahụ gụnyere Minista na-ahụ maka ọrụ oyibo na iwè n'ọrụ, bụ Dọkịta Chris Ngige; Minista na-ahụ maka nkànụzụ, bụ Ogbonnaya Ọnụ; Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi, bụ Geoffrey Onyeama; Minista nke na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'ogoogo steeti, bụ Chukwuemeka Nwajuiba, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

N'okwu ọ gwara ndị ahụ n'ebe ahụ oge ọ nụchara ihe ha jiri bịa, Onyeisiala Buhari chètààrà ha na ịtọhapụ Maazị Nnamdị Kanu n'ényéghị ya ọnọdụ ọbụla bụ ihe adabàghị adaba n'ịgbaso usoro nkesà ọrụ dị n'etiti isi ọchịchị ala Nigeria nà ngalaba ọrụikpe. Ya bụ nà ọ gwara ha na ihe ha na-arịọ ya bụ ihe siri ike omume.

Kaosiladị, o kwere nkwà na ọ ga-elebà anya na nke ahụ. O kwuru na kemgbe ahọ isii gara aga o jiri bụrụ onyeisiala Nigeria, na o nweghị onye ọbụla ga-ekwu na ya azọbanyela ụkwụ maọbụ tinye aka n'ọrụ dịịrị ndị ọrụikpe, ọbụladị dịka o tòrò ndị okenye ahụ maka ezi ọgụgụisi ha

Ọ gwara ha na oge Maazị Kanu siri n'ụlọikpe gbapụ, e wee mechaa nwụchikọọ ya ọzọ na mba ofesi ma kpọrọ ya bata ala Nigeria, na ya onwe ya bụ onyeisiala nyere ntụziaka ka e jiri usoro iwu wee so ya, site n'iji ụlọikpe wee leba anya n'okwu ya; ma kọwaa na nke ahụ bụ ezigbo ohere ọma ka o nyere ya.

Buhari jọ̀kwàzị̀rị̀ n'oge ahụ wee kasie Mbazulike Amaechi obi maka ọnwụ nwunye ya, bụkwazị onye e mere mmemme akwamozu ya na nsonso a, ma kpee ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.

Na mbụ n'okwu ya oge o kwupụtàchàrà ihe ha jiri bịa, Maazị Mbazulike Amaechi, onye gbara ahọ iri iteghete na atọ katọ̀rọ̀ etu ọnọdụ mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, bụ ala Igbo siri debe ime na ọnụ ugbua, ọkachasị dịka o siri metụta ọnọdụ akụnụba, ọnọdụ nchekwa, ọnọdụ azụmahịa na ngamaba agụmakwụkwọ.

Ka ọ na-arịọ ka e nwee ezi mgbataọsọ site n'usoro ezi ọchịchị 'onye kwuo uche ya', karịa site n'usoro ndị agha na usoro iji aka ike; Maazị Amaechi, onye bụkwa naanị Minista mbụ n'ala Nigeria ka dị ndụ taa, kọwàkwazịrị na ọ bụrụ na a tọhàpụrụ ya Nnamdị Kanụ, na ọ ga-adụ ya ọdụ ma na-agbàziri ya, ka o wee ghara ikwuzị ihe ndị ahụ ọ na-ekwugasị n'oge mbụ.

O kwuru na ya na Kanu ezutela ugboro abụọ n'oge mbụ, mana Kanu erubechaghị isi n'ihe ụfọdụ ihe ọ gwara ya.
O kwukwazịrị na ya achọghị ịhapụ ụwa a ma ọ bụrụ na udo tọrọ àtọ echịghàtàghị n'ala Nigeria; kọwaa na ọ kwàdòrò ịdịnotu ala Nigeria dịka nnukwu obodo na mba Afrịka; ma dụkwazie onyeisiala Buharị ọdụ ka ọ gbaa mbọ bụrụ onye a ga na-echeta dịka onye hụrụ ma menyụọ ọkụ ahụ na-agba n'ala Nigeria.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484