Ịba: Anambra Agbapeela Atụmatụ Ikesa Ụlọ Mgbochi Anwụnta

Jun 9, 2022 - 17:58
Jun 9, 2022 - 18:42
 0
Ịba: Anambra Agbapeela Atụmatụ Ikesa Ụlọ Mgbochi Anwụnta

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti Anambra steeti ekwupụtala na ọ wàtàrà ọgọdọ ma dịkwa ezi njikere ibuso ọrịa ịba na ọrịa ndị ọzọ dịka ya agha na ịchụ ha ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

Gọvanọ Chukwuma Soludo kwere nkwa a n'Awka bụ isi obodo Anambra steeti n'ụbọchị Wenezde ka ọ na-agbape ámụ̀mà ikesa ụlọ mgbochi anwụnta ruru nde atọ na ụma asatọ n'ime steeti ahụ.

Ọkammụta Soludo, mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, kwuru na ámụmà ikesà ụlọ mgbochi anwụnta ahụ so n'otu n'ime mbọ dị icheiche gọọmentị na-agba iji kwalite ezi ọnọdụ ahụike ụmụafọ steeti ahụ na ndị bi n'ime ya; ọbụladị dịka ọ gwàkwàrà ndị obodo ka ha ghara iji atụmatụ ahụ gwurie egwu.

Ka ọ na-akọwa na ụlọ mgbochi anwụnta ahụ na-adịgide ire ma na-arụsi ọrụ ike wee ruo ihe dị ka ahọ atọ, ọ gwara ndị ahụ na-ahụ maka ikesa ya bụ ụlọ mgbochi anwụnta ka ha gba mbọ hụ na e kesara ya n'usoro ziri ezi. O mèkwàrà ka a mara na gọọmenti a na-ewepụtekwa atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa ịba, iji buso ọrịa ịba agha chara ọkụ n'Anambra, ruo mgbe a chịkọtara ije ozi ya kpamkpam n'ime steeti ahụ.

Gọvanọ ahụ chetaara ndị isi ọchịchị obodo, ndị eze ọdịnala, ndị ndu òtù ndị ntorobịa na ndị isi ụmụnwaanyị nke obodo dị icheiche na steeti ahụ na ha niile nwere ọrụ dị mkpa ha ga-arụ na nkesa ụlọ mgbochi anwụnta ahụ. O kwukwara na a na-eme nkesa ụgbụ site na njikọaka gọọmenti steeti ahụ na ụlọọrụ gọọmentị etiti na-ahụ maka ahụike, ma kelekwazie ndị niile jikọrọ aka ọnụ maọbụ tụnye ụtụ n'ótù ụzọ maọbụ nke ọzọ, maka nkwàdó ha.

N'akụkụ nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịnta Afam Obidike kọwara mmemme ahụ dịka otu n'ime ọgụ a na-alụ megide ọrịa ịbà na steeti Anambra, kwuo na nnyòcha na-egosi na ọnụọgụgụ ndị ji ụlọ mgbochi anwụnta ehi ụra na steeti ahụ dị obere. Ya mere, ọ dụrụ ndị ọbụla ga-enweta ụlọ mgbochi anwụnta ahụ ọdụ ka ha jiri ya na-ehi ụra dịka a tụrụ, ma dọkwa ha aka na ntị ka ha gharakwa ire ya ere ma ha keta ya. O kwukwàrà hoohaa na ụlọ mgbochi anwụnta ahụ bụ n'efu ka a na-enye ya, na a naghị eresikwa ya mmadụ eresi.

Na ntụnye aka, onye ji ọkwa dịka onyeisi ihe mmemme nke ụlọọrụ ‘Malaria Consortium’ na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka, bụ Dkt. Kolawole Maxwell kwùrù na ala Nigeria na-agbasi mbọ ike ikpochapụ ọrịa ịba n'ahọ 2025, dịka ụfọdụ mba ndị ọzọ siri mee. Ọ kọwapụtakwara mmetụta ịba na-enwe n'ahụ ike ọhaneze, ma kpọpụtasikwa ọtụtụ uru dị icheiche dị n'ikpochapụ ya.

N'okwu ya, nwunye Gọvanọ, Oriakụ Nonye Soludo, onye e nyere nkwanyeùgwù na mmemme ahụ dịka onye nnọ̀chianya ụlọ mgbochi anwụnta n'ime steeti Anambra (Anambra State Net Ambassador) na mmemme ahụ, kwupụtàrà obiụtọ ya maka nkwanyeùgwù ahụ, ma dụọ ezinụlọ ọbụla ọdụ ka ha gba mbọ wepụta onwe ha maka iketa òkè ụlọ mgbochi anwụnta ahụ.

Mmemme ahụ dọtàrà ọtụtụ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmentị, ndị isi obodo dị icheiche, ndị sitere na ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na steeti na gọọmentị etiti, ndị ọrụ otu mba ụwa United Nations, na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ihe kacha pụta ìhè na mmemme ahụ gụnyere inye Oriakụ Nonye Soludo nkwanyeùgwù ahụ kpọmkwem; ya na ngosi ihe atụ nke ikesàra mmadụ olenaole ụlọ mgbochi anwụnta ahụ na ya bụ mmemme, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484