Gọvanọ Soludo Agbapeela Ahọ Ọrụ Ugbo n'Anambra

Jun 16, 2022 - 17:09
 0
Gọvanọ Soludo Agbapeela Ahọ Ọrụ Ugbo n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịọra steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nọrọ ụbọchị Wenezdee wee gbapee amụma ịkọ ọrụ ugbo nke ahọ 2022 na steeti ahụ, ma kwe nkwa ime ka ndị Anambra nwee ihe oriri gbaanyụụ.

Mmemme ịgbape ahọ ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'amaegwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụ nke ndị isi ọchịchị steeti ahụ na ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ sonyere na ya.

Ka ọ na-agbape ya bụ ahọ ọrụ, Gọvanọ Soludo kwupụtanworo ọzọ na ọchịchị ya dị ezi njikere itute na ịkwalitekwa atụmatụ ịkụ osisi dị icheiche na-enye ego na steeti ahụ, dịka akị oyibo, akwụ na osisi ndị ọzọ, bụ nke nyere mpaghara ala Igbo ọtụtụ ego n'oge nke Michael Okpara lagoro mmụọ, bụ onye jibụrụ ọkwa dịka Gọvanọ mpaghara ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

O kwuru na nke ahụ so n'ihe mere ọchịchị ya jiri bido ma gbapee atụmatụ ịkụ osisi ruru otu nde na steeti ahụ na nsonso a; kọwaa na mmanụ agbidi na ego a na-enwete na ya na-agbadazị agbada ugbua, bụ nke mere o jiri dị mkpa na gọọmenti okpuruọchịchị dị icheiche, gọọmenti steeti na gọọmenti etiti ga-abawanye ma kwàlité ngalaba ndị ọzọ e si enwete ego, nke ọrụ ugbo bụ otu n'ime ha.

Gọvanọ Soludo kwukwara na ọchịchị ya dị ezi njikere ịkwàdò na ijikọ aka ọnụ, ya na obodo dị icheiche n'ime steeti ahụ ndị nwere mmasị itinye anya n'ịkụ, ịkọ na imepụta akwụ na akị oyibo; bụ nke o kwuru na ọ ga-eme ka ego ruru ijeri kwuru ijeri dọla si mba ofesi na-abata n'ime steeti ahụ n'ime ahọ iri na-abịa abịa, ma ọ bụrụ na e tinye uchu na ya nke ọma etu kwesiri.

Ya bụ Gọvanọ nọkwazịrị na mmemme ahụ nke isiokwu ya bụ “Ịkwadò Ụmụnwaanyị na Ndị Ntorobịa Site n'Ọrụ Ugbo Maka Mmepe Ga-Adịgide” wee mee ihe atụ ịkụ akị oyibo n'amaegwuregwu ahụ.

Na mbụ n'okwu nke ya n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti Anambra, bụ Dọkịta Foster Ihejiofor gbara akaebe banyere mkpebi ọchịchị steeti ahụ nwere itute na ịkwalite ọrụ ugbo na steeti ahụ, ya na ịkwàdò ndị ọrụ ugbo steeti ahụ, na iweta mnwogharị pụtara ìhè na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ ka ọ bụrụ ejiamaatụ.

Kọmishọna Ihejiofor kpọkukwazịrị ndị Anambra ka ha kpara ya bụ ọjị nkụ, site n'iji ezi ohere ahụ ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, bụ ọchịchị Soludo na-ewepụtasị na ntụnye dị icheiche ọ na-eme na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ wee kpọrọ ihe, jirikwa ya kwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ha, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ bèlata ụkọ nri, ma kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba steeti ahụ na ego a na-enweta n'ime ya.

Ọ dị ncheta na ọrụ ugbo so n'otu n'ime nglaba Gọvanọ Soludo kwere nkwa itinye uchu pụrụ iche na ya n'ihi ọtụtụ uru juputara na ya nàkwà etu nke ahụ ga-esi nye aka n'ịkwàlìtè mmepụta erimeri na steeti ahụ, bụkwazị nke mere o jiri kwuo na a ga-enwe atụmatụ ịkụ ọtụtụ osisi na-enye ego na steeti ahụ na mnwogharị ọrụ ugbo n'izugbe na steeti ahụ, dịka otu n'ime ụzọ a pụrụ isi mezupute ya bụ ọmarịcha ebumnobi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484