A Dụọla Na-Anya Ụgbọala Ka Ha Na-Elekọta Ya Anya Nke Ọma

Jun 26, 2022 - 23:00
 0
A Dụọla Na-Anya Ụgbọala Ka Ha Na-Elekọta Ya Anya Nke Ọma

Izunna Okafor dere akụkọ a

A dụọla ndị na-anyà ụgbọala ọdụ ka ha na-akpchapụ anya oge niile ma na-elerukwa ụgbọala ha anya nke ọma tupu ha eburu ya pụta n'okporoụzọ, iji zeere ọnọdụ ntụmadụ.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ije awele okporoụzọ, bụ ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC) n'ime steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi bụ ya nyere ndụmọdụ a n'okwu ya banyere ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra na nsonso a, bụ ebe otu nnukwu ụgbọala bu mmanụ ọkụ dara, mmanụ o bu wee wụfusie n'okporoụzọ.

Ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara na mpaghara njikọụzọ Eze-Ụzụ dị n'Awka, n'ogologo okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha, ma bụrụkwa nke o nweghị onye nwụrụ na ya n'abụghị naanị na onye ọkwọ ụgbọala ahụ nwetara obere mmerụahụ.

Maazị Irelewuyi, onye mere ka a mara na ọ bụ ngharịpụ nke ihe nkwụsị ụgbọala, bụ breeki ụgbọala ahụ, bụ ihe kpatara ya bụ ihe mberede, gàkwara n'ihu kwuo na ọ dị oke mkpa ka onye ọbụla bụ onye na-anya ụgbọala gba mbọ hụ na ụgbọala ha kwụ n'egwu oge niile, tupu o buru ya pụta n'okporoụzọ, maka ngharịpụ oru ihe maọbụ nke ọzụ.

O jikwara ohere ahụ dọọ ndị na-anya ụgbọala aka na ntị ka ha kwụsị ịgba oke ọsọ, n'ihi na oji nwayọ anaghị emerụ ahụ; ọ bụkwa ejealá bụ isi ijè.

Na ntụnye nke ya banyere ihe mberede ahụ na etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ ahụ, bụ RC Margaret B. Onabe kwuru na Chineke rụrụ ọrụ ebube n'ebe ahụ. 

O mere ka a mara na ọtụtụ mmadụ na ụgbọala kwụ n'ihu ebe e nwere agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ oge ya bụ ụgbọala ji ọsọ abịa n'ihi ngharịpụ breeki ya, mana onye na-anya ya bụ ụgbọala jiri ike ozigbo hucha ya n'akaekpe, tinye isi n'obere ọwa mmiri kewara akụkụ okporoụzọ ahụ na akụkụ okporoụzọ nke ọzọ; o wee jirizie otu osisi ọkụ okporoụzọ dị ebe ahụ wee bichie ụgbọala ahụ ozigbo, nke mezịrị na nnukwu ihe ọjọọ maọbụ ihe egwu e sighị na ya bụ ihe mberede pụta.

Ọ sịkwa na ndị ọrụ ha gara n'ebe ahụ ngwangwa ya bụ ihe mere, wee hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, ma nyekwazie aka na-ahazi njem ụgbọala n'ebe ahụ, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ maọbụ ihe mberede okporoụzọ ọzọ dapụtara.

RC Onabe kwukwara na ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra wụchakwara n'ebe ahụ ozigbo ya bụ ihe mere, wee jiri mmiri gbajụlata okpomọkụ si na mmanụ ọkụ ahụ si n'ụgbọala ahụ awụfusi oge ọ dara, iji hụ na e nweghị ọkụ ọgbụgba n'ebe ahụ maọbụ ọnọdụ njọọ ndị ọzọ yiri ya.

E mechaziere chọta nnukwu ụgbọala ọzọ wee gbapụ mmanụ ọkụ ndị nke fọrọ afọ n'ụgbọala ahụ dara ada, tupu bidozie ịchọ etu a ga-esi dozi ma bughapụ ya n'okporoụzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484