Soludo Eduola Mmadụ Anọ Ọzọ n'Iyi Ọrụ 

Jun 17, 2022 - 21:42
 0
Soludo Eduola Mmadụ Anọ Ọzọ n'Iyi Ọrụ 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọvanọ steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo nọrọ ụbọchị Tuzdee wee duo mmadụ anọ ọzọ n'iyi ọrụ iji ọkwa dị icheiche n'ọchịchị ya na steeti.

Mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ wee duo mmadụ anọ n'iyi ọrụ dịka ndị ndụmọdụ pụrụ iche na ngalaba dị icheiche.

Ndị ahụ o duru n'iyi ọrụ ọhụrụ gụnyèrè Maazị Anayo Nnebe, bụ onye o duru n'iyi ọrụ dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ụlọ omeiwu; Dọkịta Alex Obiogbolu, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ndọrọndọrọ ọchịchị; Dọkịta Godwin Nnadozie, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ọgwụ na mmepụta ọgwụ; na Ọkaiwu Raphael Asha Nnabuife, onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara okpuru ọchịchị ime obodo.

Ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu oge ọ na-edu ha n'iyi ọrụ ahụ, Gọvanọ Soludo gbàrà hà ume ka ha gbasie mbọ ike n'arụmọrụ ha n'ihi na a họpụtara ha n'ihi na ha gosipụtara na ha tozuru okè ma bụrụkwa ndị nwere àgwà pụrụ iche iji rụọ ọrụ ahụ dị icheiche a kpọlitere ha ka ha rụọ.

Ọ chètààrà ha na mkpọlite ahụ a kpọlitere ha n'ọkwa dị icheiche bụ òkù ọrụ ka a kpọrọ ha iji wulite steeti na ọganihu ya n'ogoogo dị elu. Ọ gwara ha ka ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iji nye aka mee ka atumatu dị icheiche ọchịchị ya ji n'aka bịa na mmezù nke ọma.

N'okwu ha n'ótù n'ótù banyere mkpọlite ahụ a kpọlitere ha na odudu ahụ e duru ha n'iyi ọrụ, mmadụ anọ ahụ kèlèrè Gọvanọ Soludo maka ịhụta ha dịka ndị tozuru oke maka ya bụ mkpọlite.

Ha kwezịrị nkwà iji ahụmahụ ha na obi ha wee jeere steeti ahụ ozi n'ikwesi ntụkwasịobi, ya na ịrụ ọrụ ahụ a hànyèrè ya n'aka nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

Ọ dị ncheta na Gọvanọ Soludo nọrọ n'ụbọchị Fraịdee izuụka gara aga wee kpọlite mmadụ iri na otu n'ọkwa ọhụrụ dịgasị icheiche na steeti ahụ, nke gụnyere mmadụ anọ a e duru n'iyi ọrụ ụbọchị Tuzdee.

Ụfọdụ ndị ọzọ dị icheiche ọ kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ ụbọchị Fraịdee ahụ nà ọkwa ha dị icheiche gụnyere: Emma Ezenwaji (onyeisioche otu nlekọta ụlọọrụ Anambra State Waste Management Authority, ASWAMA), Maazị Mike Ozoemena (onyeisi ụlọọrụ Anambra State Waste Management Authority, ASWAMA), Dọkịta Simeon Onyemaechi (onyeisi ụlọọrụ Anambra State Health Insurance Agency), Maazị Odili Ujubuoñu (onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Signage and Advertising Agency, ANSAA); Maazị Chido Obidiegwu (onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra Broadcasting Service, ABS); Okammụta Phil O. Phil-Eze (onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Erosion Watershed and Climate Change Agency, ANSEWCCA); na Maazị Obumneme Akunyili (onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nlekọta ọrụ,  bụ ‘Project Monitoring Office’).

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484