Dọkịta Ebelechukwu Obianọ Agaala Njem Nleta n'Ụfọdụ Ụlọ Ahụike Nta Dị N'Anambra

Apr 2, 2021 - 17:58
 0
Dọkịta Ebelechukwu Obianọ Agaala Njem Nleta n'Ụfọdụ Ụlọ Ahụike Nta Dị N'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwunye aka na-achị steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ agaala njem nleta n'ụfọdụ ụlọ ahụike nta dịgasị n'okpuru ọchịchị 'Anambra East', na steeti ahụ, iji mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

Ụfọdụ n'ime ụlọ ahụike ntà ebe nwunye Gọvanọ ahụ gara ya bụ njem nleta gụnyere ndị nke dịgasị n'Ivite Aguleri, ndị nke dị n'Enugwu-Aguleri, ndị nke dị n'Umueri, ndị nke dị n'Otuọcha, ndị nke dị n'Ụmụndeze, Eziagụlụ na Agụleri.

N'okwu n'ebe ahụ, Oriakụ Obianọ, onye bụkwa onye chọpụtara òtù ọrụ obi ebere 'Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)' mere ka a mara na ebumnobi njem nleta ahụ bụ iji were anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ndị ahụ, ya na etu ọrụ si aga n'ụlọ ahụike ndị ahụ.

Ọ gbarụrụ ihu banyere ụfọdụ ihe ọ hụtagasịrị n'ụfọdụ ụlọ ahụike ahụ, dịka o siri metụta ọnọdụ ụlọọgwụ ndị ahụ ọ gara leta, ya na ihe ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ, ụmụnwaanyị na-amụ nwa, ụmụntakịrị na ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ebe ahụ na-agabiga.

Oriakụ Obianọ, onye mere ka a mara ezi mbọ ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ gbagoro iji nwogharịa ngalaba ahụike steeti ahụ, kpọkuzịkwara Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala, onye soro ya wee gaa njem nleta ahụ, ma gwa ya ka o mee ngwangwa hụ na e nwogharịrị ma gbanwèé ọnọdụ ụlọ ahụike ndị ahụ n'oge adịghị anya.

O mere ka a mara na ọ ga-abịaghachi njem nleta ahụ ọzọ ma gakwa etu n'ebe ndị ọzọ e nwere ụlọ ahụike nta na gburugburu steeti ahụ, ọbụladị dịka o kwere nkwa na steeti ahụ ga-aga n'ihu inwe ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484