Anambra: Ịgba Ọgwụ Mgbochi Ọrịa Ntụrịụkwụ Ga-akwụsị Echi — Okpala
Izunna Okafor dere akụkọ a
Ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma.
N'ihi nke ahụ, ọchịchị steeti Anambra ekpebiela na ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa ntụrịụkwụ, bụ ọrịa polio, n'ime steeti ahụ, nke malitere ụbọchị Satọde, bụ abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Jenụwarị ahọ a ga-akwụsị echi bụ Tuzdee.
Kọmishọna na-ahụ maka ahụike n'ime steeti Anambra, bụ Dọkịta Vincent Okpala bụ ya kwupụtara nke n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Awka n'ọgbakọ a chịkọbara site n'aka ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike ntà n'ime steeti ahụ, bụ ụlọọrụ 'Anambra State Primary Healthcare Development Agency'.
O kwuru na nke ahụ bụ nke dabara adaba n'ezi mbọ ọchịchị steeti ahụ na-agba iji chekwaba ụmụaka steeti Anambra pụọ n'ajọ ọrịa ahụ bụ polio, ya na ntụnye ụtụ steeti ahụ n'ibu agha megide nàkwà ịchụ ọrịa ahụ ọsọ ụkwụ eru ala ka ọ pụọ kpamkpam n'ala Nigeria.
O mekwara ka a mara na atụmatụ ịgba ọgwụ mgbochi ahụ a kpọrọ 'National Immunization Plus Days' gà-ewere ọnọdụ malite ụbọchị Satọdee na-abịa abịa, wee ruo ụbọchị Tuzdee, bụ abalị mbụ nke ọnwa Febụwarị.
Dọkịta Ọkpala kọwàrà ọrịa polio dịka ọrịa jọgburu onwe ya, bụ nke na-ewète mkpọnwụ n'ụkwụ, aka maọbụ akụkụ ahụ mmadụ, maọbụkwanụ gbuo onye ahụ egbuo.
Ọ kọwakwara na ọrịa polio enweghị ọgwụgwọ ọbụla, ma kwuo na naanị ihe a pụrụ ime iji gbochie ya bụ ịtụnye nwatakịrị ọbụla nọ n'agbàtà ọnwa efù ruo ọnwa iri ise na iteghete (0—59months) ọgwụ “oral polio vaccine” n'ọnụ kpọm-kpọm ugboro abụọ, iji chekwaba ha pụọ n'inwete ọrịa ahụ (n'agbànyèghị na nwata ahụ ọ tụbụọla ọgwụ ahụ mbụ maọbụ na ọ tụbeghị ya).
Ka ọ na-eme ka a mara na ịgba ọgwụ mgbochi ahụ dị̀ óké mkpa ugbua n'ihi na ọrịa ahụ na-agbasàwanyezị nke ukwuu ugbua; Kọmishọna Ọkpala kpọpụtasịkwara ụfọdụ ọgwụ mgbochi ndị ọzọ a ga-agbakwa, ma nke a ga-agba ụmụnwaanyị dị ime na ụmụnwaanyị rugoro ogo ịtụ ime.
N'okwu ya na mbụ oge ọ na-anabata ndị bịara mmemme ahụ, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Primary Healthcare Development Agency (ASPHCDA), bụ Dọkịta Chioma Ezenyimulu kọwàrà na ha chọrọ ka nwata ọbụla tozuru òkè iso gba ọgwụ mgbochi ahụ nweta ya.
Dịka ọ nà-échètara ọhaneze na ịgba ọgwụ mgbochi ahụ bụkwà n'efù, Dọkịta Ezenyimụlụ kpọkuzịrị ndị nne na nna na ndị nlekọta ụmụaka ka ha gba mbọ hụ na ụmụ ha maọbụ ụmụaka ha na-elekọta (ndị tozuru òkè) sònyèrè n'ịgba ọgwụ ahụ.
Ọ rịọkwara ndị ndu obodo, ndị isi ụka, ndịisi ụlọakwụkwọ na ndị nta akụkọ ka ha nye aka n'ịgbasa ozi bànyere ịgba ọgwụ mgbochi ahụ, maka na nke ahụ bụ maka ọdịmma nwatakịrị bịara ụwa, iji nyere ya aka.
Mmemme ahụ dọtàkwàrà ụfọdụ ndị ọrụ sitere ngalaba ahụike steeti ahụ, tinyere onye mkpọtụrụ ụlọọrụ ahụike mba ụwa (Cluster Consultant of World Health Organisation, WHO) n'ime steeti Anambra, bụ Uju Orjiagu, na ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba ahụike.
What's Your Reaction?