Ndị Ojiegbe Awakpòla Ụlọọrụ Nchekwa Ọzọ n'Anambra

May 12, 2021 - 00:03
May 30, 2021 - 18:37
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ka ọ gachara abalị ole na ole ha jiri wakpòchaa Ichida dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha na Awka-etiti dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili South' nke steeti Anambra, ndị ojiegbe ezu a maghị ndị ha bụ nọkwara na nsonso a wee wakpò ụlọọrụ ndị nchekwa obodo ọzọ na steeti ahụ.

Mwakpò ahụ bụ nke ndị ọjọọ a mere n'ụlọọrụ ndị nchekwa obodo dị n'Ọzụbụlụ, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ha sitere na ya wee gbagbuo mmadụ anọ n'ebe ahụ, nke gụnyere ndị ọrụ nchekwa obodo ahụ, ndị ótù onye n'ime ha bụ osote onyeisi ndị ọrụ nchekwa ahụ, onye a maara dịka G.O.D.

Akụkọ kọrọ na ọdachi ahụ dapụtara ụbọchị ụka, malite oge o jiri ọkara gaa elekere anọ nke mgbe, wee ruo n'ihe dị ka elekere isii nke mgbede ahụ.

Dịka ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere siri wee kọwaa, ndị ojiegbe ahụ jiri ụlọala 'Toyota Sienna' wee wụchaa ebe ahụ na mgbede ahụ, ma malite ịgba égbè aghara aghara, nke sitezịrị na ya wee gbagbuo mmadụ atọ ahụ.

Ndị ahụ mebìsìkwara ụfọdụ ihe n'ebe ahụ, kpọghèpù ndị a kpọchiri n'ụlọ nga ebe ahụ; otu onye n'ime ndị mkpọrọ ahụ sokwàrà ha wee pụọ, ebe ndị ọzọ rìkwàzịrị mbọmbọ ọsọ.

Akụkọ kọkwàrà na ndị omekoome ahụ gakwàrà ịwakpò ògige ndị uweojii dịkwa nso n'ebe ahụ; mana ndị uweojii ahụ kwèchììrì, buso ha agha, ha wee gbaa ọsọ. Mana ha mụnyèkwàrà ótù ụgbọala ndị uweojii ọkụ n'ebe ahụ, tupu ha larie.

N'okwu ya banyere mwakpò ahụ, Onyeisi ndị ọrụ nchekwa obodo n'Ọzụbụlụ, bụ Maazị Jude Ọnọnuju mèrè ka a mara na ihe ahụ bụ eziokwu, ma mee ka a mara na ọ nọghị n'ụlọọrụ ahụ mgbe ahụ ihe ahụ mere. 

O kwuru na ọ na-echè na ọ bụ ndị òtù ótù onye n'ime ndị ahụ a kpọchiri n'ụlọọrụ nchekwa ahụ bịàrà mwakpò ahụ, maka na ọ bụ ka ọ gachara ihe dịka nkeji iri abụọ na ise ya bụ nwoke jiri zachaa òkù ekwentị ka ndị omekoome ahụ jiri wụchaa n'ebe ahụ ma kpaa àgwà ọjọọ ahụ. 

O kwuru na ya bụ òkù ekwentị nwoke ahụ kpọrọ bụ ndị ga-abịa ibinye aka n'akwụkwọ iji gbapụta ya ka ọ kpọrọ ma gwa ha ebe ọ nọ kpọkwem, bụ nke mezịrị o jiri gbaa onye ọbụla ngharị etu ndị ahụ siri wụchaa ebe ahụ n'oge adịghị anya o jiri zachaa ekwentị ahụ.

Na mbụ n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Ikenga Toochukwu kwuru na mwakpò ahụ mere eme n'ezie, ma kwuo na ọ bụ n'ime mgbede ka ndị ahụ jii wee bịa na n'ụlọọrm ndị uweojii ahụ.

O kwùkwàrà na ha ka na-eme nnyòcha banyere okwu ahụ, iji nwụchikọọ ndị aka ha dị n'arụrụọụala ahụ.

Ka ọ gachara abalị ole na ole ha jiri wakpòchaa Ichida dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha na Awka-etiti dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili South' nke steeti Anambra, ndị ojiegbe ezu a maghị ndị ha bụ nọkwara na nsonso a wee wakpò ụlọọrụ ndị nchekwa obodo ọzọ na steeti ahụ.

Mwakpò ahụ bụ nke ndị ọjọọ a mere n'ụlọọrụ ndị nchekwa obodo dị n'Ọzụbụlụ, n'okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke ha sitere na ya wee gbagbuo mmadụ anọ n'ebe ahụ, nke gụnyere ndị ọrụ nchekwa obodo ahụ, ndị ótù onye n'ime ha bụ osote onyeisi ndị ọrụ nchekwa ahụ, onye a maara dịka G.O.D.

Akụkọ kọrọ na ọdachi ahụ dapụtara ụbọchị ụka, malite oge o jiri ọkara gaa elekere anọ nke mgbede, wee ruo n'ihe dị ka elekere isii nke mgbede ahụ.

Dịka ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere siri wee kọwaa, ndị ojiegbe ahụ jiri ụgbọala 'Toyota Sienna' wee wụchaa ebe ahụ na mgbede ahụ, ma malite ịgba égbè aghara aghara, nke ha sitezịrị na ya wee gbagbuo mmadụ anọ ahụ.

Ndị ahụ mebìsìkwara ụfọdụ ihe n'ebe ahụ, kpọghèpù ndị a kpọchiri n'ụlọ nga ebe ahụ; otu onye n'ime ndị mkpọrọ ahụ sokwàrà ha wee pụọ, ebe ndị ọzọ rìkwàzịrị mbọmbọ ọsọ.

Akụkọ kọkwàrà na ndị omekoome ahụ gakwàrà ịwakpò ògige ndị uweojii dịkwa nso n'ebe ahụ; mana ndị uweojii ahụ kwèchììrì, buso ha agha, ha wee gbaa ọsọ. Mana ha mụnyèkwàrà ótù ụgbọala ndị uweojii ọkụ n'ebe ahụ, tupu ha larie.

N'okwu ya banyere mwakpò ahụ, Onyeisi ndị ọrụ nchekwa obodo n'Ọzụbụlụ, bụ Maazị Jude Ọnọnuju mèrè ka a mara na ihe ahụ bụ eziokwu, ma kọwaa na ọ nọghị n'ụlọọrụ ahụ mgbe ahụ ihe ahụ mere. 

O kwuru na ọ na-echè na ọ bụ ndị òtù ótù onye n'ime ndị ahụ a kpọchiri n'ụlọọrụ nchekwa ahụ bịàrà mwakpò ahụ, maka na ọ bụ ka ọ gachara ihe dịka nkeji iri abụọ na ise ya bụ nwoke jiri zachaa òkù ekwentị ka ndị omekoome ahụ jiri wụchaa n'ebe ahụ ma kpaa mkpamkpa ahụ. 

O kwuru na ya bụ òkù ekwentị nwoke ahụ kpọrọ bụ ndị ga-abịa ibinye aka n'akwụkwọ iji gbapụta ya ka ọ kpọrọ ma gwa ha ebe ọ nọ kpọkwem, bụ nke mezịrị o jiri gbaa onye ọbụla ngharị etu ndị ahụ siri wụchaa ebe ahụ n'oge adịghị anya o jiri zachaa ekwentị ahụ.

Na mbụ n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Ikenga Toochukwu kwuru na mwakpò ahụ mere eme n'ezie, ma kwuo na ọ bụ n'ime mgbede ka ndị ahụ jii wee bịa na n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ.

O kwùkwàrà na ha ka na-eme nnyòcha banyere okwu ahụ, iji nwụchikọọ ndị aka ha dị n'arụrụala ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484