Gọọmenti Etiti Agbaala Peter Nwachukwu Akwụkwọ Maka Ọnwụ Osinachi Nwunye Ya

Jun 7, 2022 - 21:41
 0
Gọọmenti Etiti Agbaala Peter Nwachukwu Akwụkwọ Maka Ọnwụ Osinachi Nwunye Ya


 

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

Gọọmenti etiti ala Nigerịa agbaala Maazị Peter Nwachukwu akwụkwọ, bụ di nwaanyị ahụ na-agụ egwu ụka a ma ama lagoro mmụọ, bụ Oriakụ Osinachi Nwachukwu
 Ebubo a na-ebo ya gụnyere igbu ọchụ na ihe ndị ọzọ megidere ndụ mmadụ.
 Akwụkwọ ahụ nke a gbara ya ka ọnwa Mee dị n'abalị iri abụọ n'afọ a bụ 2022 bụ nke Onyeisi na-ahụ maka ‘Sexual and Gender-Based Violence’ na ngalaba ‘Public Prosecutions’ nke ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ n'ala Nigeria (Federal Ministry of Justice), Oriakụ Yewande Gbola-Awopetun tinyere aka na ya.
 E boro Nwachukwu ebubo na o ji aka ike chụpụ Osinachi n'ụlọ, tinyere ịkwapụ ya n'ụgbọala na-aga aga.
 Ọzọ bụ na o gbochiri ya ezi nnwere onwe dịka mmadụ, site n'igbochi na itinyere ya anya ebe ọ na-aga, ma na-akpọchido ya ụzọ, n'ime ụlọ.
 E bokwara Nwachukwu ebubo na ọ na-akpagbu nwunye ya n'okwu ọnụ ma na omume ọjọọ.
 E kwukwara na o kweghị ka Osinachi wèré ego ya onwe ya gbòó mkpa dịịrị ya, dịka ilekọta ahụike ya na ihe gbasara ezinụlọ, ma si otu ahụ kwanye ya n'ịrịọ arịrịọ na ịgba mbìbì ego 
  E kwukwara na o kewara Osinachi na ezinụlọ ya, site n'igbochi nne ya na ụmụnne ya ịbịa be di ya.
 Ọzọ bụkwa na e kwùrù na nwoke ahụ na-eti ụmụ ya ihe oge niile, ma were ekwentị na-ese ha ka ha na-ebe akwa, bụ nke ọ na-emecha n'ikpeazụ na-egosị onyoonyoo ya n'ekwentị.
 N'ebubo niile e boro Nwachukwu, gbasara ụzọ dị icheiche o siri megide nwunye ya, a rụtụchara aka ebe o siri megide iwu ala anyị. 
 Ọ dị ncheta na Osinachi nwụrụ n'Epure n'ihi agha ezinụlọ. E kwuru oge ahụ na ọ nwụrụ n'ihi ụkwụ di ya bụ Peter Nwachukwu gbara ya n'obi.
 Ka ọ dị ugbua, Ministrị na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị n'ala Nigeria ekwela nkwa na gọọmenti ga-ahụ na e nwetàrà nkwụmọtọ, n'okwu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484