Anyammiri Ala Anyị (Tears of Our Land)

Jun 18, 2022 - 21:08
 0
Anyammiri Ala Anyị (Tears of Our Land)

 

Izunna  Okafor dere abụ a

Ala Naịjiria ebegbuo onwe ya n'akwa
Anyammiri anyammiri ebe niile!
Ákwá ụtụtụ, ákwá ndeeri na ákwá arị̀rị̀
Ọnye ga-azọ ala anyị? 

Chi ọbụbọ wèré aka èkpè dupụta ya ụra
Chi ọjọọ ewere akwa arị̀rị̀ dúbàá ya
Ihe na-ebenụ a ka na-ebekwa
Onye ga-azọ ala anyị? 

Naịjiria bụ nne chị ụmụ
Onyeisiala bụ di ọ lụrụ
Nne na nwa ebegbuo onwe ha n'ákwá
Agụụ, anyammiri, akwa arịrị ebe niile
Onye ga-azọ ala anyị? 

Lekene nwaanyị na mma ya
Na ụbara ụmụ chi jiri gọzie ya
Mana di ya ekweghị ka o rite ihe nwa ya
Wee na-amị ya ọbara ka anwụnta Nnewi
Onye ga-azọ ala anyị?

Ezinụlọ ya nọ n'ọgbaghara
Mana di ya anaghị emezị ka nwoke
Égbé ebukọchaala ụmụ ya 
Ndị e gburu egbu akarịa ndị dị ndụ
Mana di ya emeghị ihe ọbụla maọlị
Dịka a gà-asị na ọ macha ihe na-eme
Gbachị nkịtị
Onye ga-azọ ala anyị?

Di ya ezugbuola ohi, ma bube ya ọnụ nri
Ụmụaka ya nọzịkwa n'agụụ, ọbụnadị n'ime ikpo nri ha nwèrè
Ya bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ na-erughị eru
Anyammiri ejugokwa ọgọdọ ya
Onye ga-azọ ala anyị? 

Nwoke ahụ agbaala ya ọtọ n'ọmà ahịa
Chaị! 
Agụ nwaanyị ebegbuo onwe ya n'akwa!
Dịka ụwa na-agbázịkwa ọtọ ya elele
Ùgwù e jiri mara ya erughịzịkwa ya aka
Onye ga-azọ ala anyị ?

Ala Naịjiria na-achọ di ọzọ ugbua
Ndị ọ lụrụ alụ agharịpụchaala ya
N'ihi ezùghị òkè n'ihe e ji nwoke eme
Nke bụ di ya anaghị echètékwuzị onwe ya
N'ihi ụbụrụ ịta nchara
Na ihe a gwọrọ agwọ so ya
Onye ga-achị ala anyị?

Iwe eweela ụmụ ya ndị okenye
Ha ji achọrọ nne ha di ọzọ ugbua
Naanị nwoke nwere ùgwù na nsọpụrụ
Ka a na-elegara anya ibunye mmanya ụbọchị ahụ
Ma e wepuchaa úgwùmágànà na ndị òtù ya
Ụmụnne m, ajụọ m, onye ga-alụ mma anyị?

Gị onwe gị sòrò bụrụ nwa ya
Mụ onwe m sòrò bụrụ nwa ya
Ngịga dị n'ọkụ abụghị nkè azụ
Ọ̀ bụ́rụ́ nkè anụ
Ajụọ m ọzọ
Onye ga-alụ mma anyị ?

Gbata PVC gị ugbua
Ka i wee soro zaa ajụjụ a
N'oké ụbọchị ahụ na-abịa nso
Ka anyị lụtara mma anyị di ọzọ
Maka na nke ọ lụrụ alụ emewaala ya obi
Bikonụ̀ ụmụnne m, onye ga-alụ mma anyị ?

© Izunna Okafor, 2022

*************************************

Maka Onye Dere Abụ A:

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenatọr dị n'okpuruọchịchị ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, bụrụ onye nta akụkọ na onye ikwàlite asụsụ Igbo na-amasị nke ukwuu.

O deela ọtụtụ akwụkwọ na edemede e biputagoro na mpaghara ebe dị icheiche n'ụwa gbaa gburugburu, ma n'asụsụ Igbo, ma n'asụsụ Bekee.

Dịka onye edemede na onye nta akụkọ, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri atọ n'ọnụọgụgụ. Nturuùgò na nkwanyeùgwù ya gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Izunna na-ede akwụkwọ na edemede n'asụsụ Igbo na n'asụsụ Bekee nke ọma.

Ọ bụkwa onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484