Isi Ọchịchị Uweojii Ala Nigeria Azụtakwuola Ngwaọgụ Ọhụrụ

Apr 24, 2022 - 19:02
 0
Isi Ọchịchị Uweojii Ala Nigeria Azụtakwuola Ngwaọgụ Ọhụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

N'ịga n'ihu na mbọ ahụ ọ na-agba ịkwalitekwu ọnọdụ nchekwa, onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Usman Alkali Baba psc(+), NPM, fdc, egotekwuola ngwaọgụ na na ụgbọala ọhụrụ, iji mee ka arụmọrụ ndị uweojii na-agawanye n'ihu n'enweghị nnukwu ihe mkpọbiụkwụ.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ CSP OLUMUYIWA ADEJOBI, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ na nsonso a n'Abuja.

Dịka o siri kọwaa, ihe ọhụrụ dị icheiche onyeisi uweojii ahụ gotere gụnyere nnukwu ụgbọala lọrị ọhụrụ ruru iri ise na ise, ụgbọala e ji agba mmiri ruru ise n'ọnụọgụgụ, ụgbọala kosta bọọsụ abụọ, na ụgbọala ngwaọgụ iri na ise pụrụ iche e ji ebu ndị uweojii aga ọrụ bụ ‘Armoured Personnel Carriers (APCs)’.

O mere ka a mara na ebumnobi nke ahụ bụ iji nyere ndị ọrụ nchekwa aka ibu agha megide mpụ na arụrụala ma wetekwa ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ, ọkachasị na mpaghara ebe e nwegasịrị nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa na gburugburu niile nke ala Nigeria.

Ọ kọwara na onyeisi ndị uweojii ahụ kwupụtanwòkwàrà mkpebi na njikere ya ịga n'ihu na-akwàlite ezi ọnọdụ obibindụ nsị uweojii, ya na ịga n'ihu na-agba ha ume n'arụmọrụ ha, maka na ọ ghọtara na ọ na-abụ e nye oke dibịa ihe ọ na-eri, ọ bụọ mgbọrọgwụ n'ajọ ọfịa. 

CSP ADEJOBI mèkwàzịrị ka a mara na IGP Akali wepụtakwara nnukwu ego gbara ọkpụrụkpụ na nsonso a ka e wee wulitekwuo usoro mgbasaozi na ihe gbasaara ICT ụlọọrụ uweojii.

O kwuzịrị na ya bụ onyeisi ndị uweojii jikwazị ohere a wee na-agwa ụmụafọ Nigeria ka ghara ịtụ egwu maọbụ nwee obi ịlọ mmiri banyere ndị ọrụ uweojii ahụ pụrụ iche e zigara na mpaghara ebe dị icheiche maka ụdị ọrụ pụrụ iche, n'ihi na e nyere ha ọzụzụ nke ọma, ma dọkwa ha aka na ntị ka ha rụọ ọrụ ha nke ọma dịka ọzụzụ e nyere ha siri dị, ma gharakwa imegide ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha maọbụ mee ihe adabaghị adaba n'usoro iwu.

Ọ dụkwazịrị ọdụ ka e nwee ezi njikọaka na mmekọrịta n'etiti ndị uweojii na ọhaneze, ya na n'etiti ndị uweojii n'ime onwe ha, ọkachasị n'ihe gbasaara ikèkọrịta ozi dị mkpa maka arụmọrụ ha.

CSP ADEJOBI kwukwazịrị na IGP Akali kwenworo nkwa ịga n'ihu ibu agha esepu aka megide mpụ na arụrụala na ajọ ọnọdụ nchekwa na-arịzị ibe ya elu n'ala Nigeria ugbua; ma rịọkwazie ụmụafọ Nigeria ka ha nyere ndị uweojii aka ime ka nke ahụ pụta ihe, site n'inye ha nkwàdo zuru òke ga-enye aka ime ka ọrụ ha gaa siriri-werere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484