E Duola Anierobi n'Iyi Ọrụ Dịka Kọmishọna Omenala Na Njem Nlegharịanya

Jan 20, 2021 - 16:43
Jan 21, 2021 - 06:12
 0
E Duola Anierobi n'Iyi Ọrụ Dịka Kọmishọna Omenala Na Njem Nlegharịanya

By Izunna Okafor

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ na nsonso a wee duo Dọkịta Kenneth Anierobi n'iyi ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka omenala, njem nlegharịanya na ihe ndị na-eme na mba ofèsi n'ime steeti ahụ.

Idu n'iyi ọrụ a bụ nke weere ọnọdụ n'ọgbakọ izugbe isi ọchịchị steeti ahụ mere na nsonso a, nke weere ọnọdụ n'Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke e mere oge ndị omeiwu steeti ahụ nabàtàchàrà mkpọlite ahụ a kpọlitere ya bụ nwa amadi ịbụ Kọmishọna ụlọọrụ ahụ.

Ya bụ Gọvanọ chètààrà nwa amadi ahụ na ọ bụ n'ihi ntụkwasịobi e nwere n'ihe ọ pụrụ ime ka e jiri kpọlite ya iji ọkwa ahụ dị elu, ma kpọkuzie ya ka ọ rụọ ọrụ ya nke ọma karịa ka a tụrụ anya n'aka ya, iji rụzùpụta ntụkwasịobi ahụ gọọmenti na ndị Anambra nwere n'ebe ọ nọ.

N'okwu ya na nzaghachi, Kọmishọna ọhụrụ ahụ, bụ Dọkịta Anierobi kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka mkpọlite n'ọkwa ahụ, bụ nke ọ kọwara dịka inye ya ohere iji jeere steeti ya ozi n'ụzọ pụrụ iche na n'ogoogo dị elu etu ahụ, ma kwezie nkwa ije ozi ahụ karịa ka a tụrụ anya, site n'inye aka Chineke.

Ọ dị ncheta na Kọmishọna steeti Anambra na-ahụbụ maka omenala, njem nlegharịanya na ihe na-eme na mba ofesi, bụ Dọkịta Christian Madubuko nọrọ n'ọnwa Disemba ahọ gara aga wee gbaa 'arụkwaghịm' ma jiri aka ya rịtuoro onwe ya n'ọkwa, nke mezịrị e jiri kpọlite Dọkịta Anierobi ịnọchi anya ya, maka na nnú adịghị mma ịkọ akọ n'ofe.

Dọkịta Anierobi bụ onye obodo Ọmọr dị n'okpuru Ayamelụm nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onye weghaara ọnọdụ ma malite ọrụ ozigbo dịka Kọmishọna ọhụrụ n'ụlọọrụ ahụ ngwngwa e duchara ya n'iyi ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.