Igwe Ekpe Adụọla Ụlọakwụkwọ Ala Igbo Ka Ha Na-Akwàlite Asụsụ Igbo

Jul 20, 2021 - 21:49
 0
Igwe Ekpe Adụọla Ụlọakwụkwọ Ala Igbo Ka Ha Na-Akwàlite Asụsụ Igbo

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ụlọakwụkwọ dị iche iche dị na mpaghara ala Igbo ka ha na-akwàlite asụsụ Igbo, na-asụ ya oge niile ma na-echekwaba ya, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo, dịka ndị òtù mba ụwa 'United Nations Education, Scientific and Cultural Organisation' (UNESCO) siri buo n'amụma na ya bụ asụsụ ga-anwụ n'oge adịghị anya.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ eze ọdịnala obodo Enugwu-Ukwu dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti Anambra, bụ Igwe Ralph Ekpe n'okwu ya oge ụmụakwụkwọ 'Frankstar Group of Schools, Amawbia' dị n'okpuru ọchịchị 'Awka South' gara kpọtụrụ ya.

Ọ gwara ndịisi ụlọakwụkwọ dị iche iche dị na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ ala Nigeria ka ha na-akụzi ma na-akwàlite ọmụmụ asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ha dị iche iche site n'iji ya akụzi ihe na ịsụrụ ya ụmụakwụkwọ oge niile.

O mere ka a mara na asụsụ Igbo so n'asụsụ kacha maa mma nà asụsụ kacha atọ ụtọ n'ime asụsụ niile dị na mba ụwa, ma kọwaa mkpà ọ dị na onye ọbụla bụ nwaafọ Igbo ga-ama na-asụ asụsụ Igbo nke ọma ma na-emesikwa omenala Igbo ike, maka na ọ bụ asụsụ bụ njirimara mbụ na-egosi ebe mmadụ sì.

Ọ dụkwara ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ ọdụ ka ha na-eji ejiji ndị Igbo oge niile maka na nke ahụ bụkwa ọmarịcha ezi njirimara ọzọ ndị Igbo nwere, bụkwa nke kwesiri ka e chekwaa ya nke ọma, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fuo.

Ya bụ eze ọdịnala kèlèkwàrà onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Frank Okafor maka ịghọta mkpa ọ dị ime ka ụmụakwụkwọ ha ghọta banyere omenala na ọdịnala Igbo nke ọma, site n'ịkpọrọ ha wee bịa kpọtụrụ ya, ya na ụdị njem mkpọtụrụ ahụ ha na-abagide n'ebe ndị ọzọ ha ga-amụta ihe dị iche iche bànyere omenala Igbo.

N'ozi ekele ya, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Frank Okafor tòrò eze ọdịnala ahụ maka ịnabata ha nke ọma n'ụdị pụrụ iche, ya na ụzọ dị iche iche o si akwàlite omenala na njirimara Igbo, ọkachasị site n'ụfọdụ mmemme dị iche iche ọ na-achịkọba n'obodo ahụ.

O kwere nkwà na ụlọakwụkwọ ya ga-ewelitekwu aka n'ịsụ, ịkụzi, ịkwàdò, ịkwàlitè, na ichekwaba asụsụ Igbo na omenala Igbo ndị ọzọ, ma kwuo na ha ga-agbatịwanyekwu ụbọchị ha ga na-asụ naanị asụsụ Igbo n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị sonyere na njem mkpọtụrụ, nke gụnyere obere Maazị Michael Ngene na obere Nwaada Abundance Johnson kwupụtàrà obiañụrị ha banyere njem mkpọtụrụ ahụ ha bịara, ma kelee onyeisi ụlọakwụkwọ ha na Igwe Ekpe maka ya bụ njem, ọbụladị dịka ha kwupụtàrà mmasị ha ịbagidekwa n'ụdị njem dị etu ahụ ọzọ n'oge adịghị anya.

A nọrọ na njem mkpọtụrụ ahụ wee kọwaara ụmụakwụkwọ ahụ ụfọdụ ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere omenala na ọdịnala Igbo, ma durukwa ha wee gaa njem nlegharịanya n'ebe nchekwa ihe ọkpụ dị na Nri a maarị dịka 'Nri Museum', bụkwazị nke mere ka ya bụ mmemme tọọ ụtọ ma jupụtakwa n'ihe mmụta.

p

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484