Ndị Uweojii Agbatuola Otu Onye Ohi n'Anambra

Jun 17, 2022 - 21:35
 0
Ndị Uweojii Agbatuola Otu Onye Ohi n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a


Ndị ọrụ uweojii n'ime steeti Anambra nọrọ ụbọchị Tuzdee wee gbatuo otu nwoke a na-enyo enyo na ọ bụ onye ohi ebe ọ gara izu ohi na steeti ahụ.

Nwoke ahụ bụ onye a gbaturu n', ogologo okporoụzọ Ogidi/Oraukwu dị na mpaghara Idemili, mgbe ya na ndị otu ya ndị ọzọ wakporo ma na-ezu ndị nọ n'ụgbọala eme njem ohi n'okporoụzọ ahụ n'ihe dịka elekere mbụ nke ehihie ụbọchị Tuzdee.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Tochukwu Ikenga siri kwuo, mmadụ atọ ndị ọzọ bụ ndị òtù ohi ahụ manyere n'ụgbọala Hilux ha ozigbo, rie mbọmbọ ọsọ mgbe ahụ a gbatuchara otu onye otu ha.

O kwukwara na e nwetere otu egbe AK47 na ụfọdụ mgbọ egbe a gbabeghị agba n'aka nwoke ahụ ha gbagburu; ebe anya ndị uweojii ka dịkwa nkọ na gburugburu ebe ahụ niile, iji hụ na e nweghị ihe ọjọọ ọbụla ọzọ dapụtara na mpaghara ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484