A Zọgbuola Mmadụ 31 Ebe A Na-ekè Ihe Oriri na Rivers

Jun 7, 2022 - 21:59
 0
A Zọgbuola Mmadụ 31 Ebe A Na-ekè Ihe Oriri na Rivers

 Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a


 Ndị uweojii steeti Rivers ekwuputala na mmadụ iri atọ nà otu anwụọla n'ọgbakọ nke otu ụlọụka   ọgbara ọhụrụ, bụ Kings Assembly, Port-Harcout  chịkọbara na nsonso na steeti Rivers. 

    E kwuru na ọ bụ ụkwụ ka e jiri zọgbu ndị ahụ n'ihi óké nkwòkọ́sịonụ ndị bịara ebe ahụ, bụ́ ndị ụlọụka ahụ kpọrọ òkù ka ha bịa ya bụ mmemme ma kwe nkwa na a ga-ekèré ha ihe oriri na ihe ònyìnyé dị icheiche.

 Ụlọụka ahụ dị na mpaghara GRA, Port-Harcourt, mana a chịkọbara emume ahụ na PH Polo Club, bụ ebe ga-enwe ike irite igwe mmadụ.

 Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Rivers, SP Grace Iringe-Koko kwuputara na ya bụ ihe mere eme n'ezie, ma kọwaa na ụlọụka ahụ chọrọ inye ndị ogbenye ihe enyemaka.

 Ọ sị: "Mmadụ iri atọ na otu nwụrụ. Ọ bụ ụkwụ ka e jiri zọgbu ha maka na ndị ụka ahụ chọrọ inye ihe enyemaka. Ọ bụ oge ha chọrọ ịmalite emume ahụ bụ nke kwesịrị ịmalite n'ihe dịka elekere iteghete nke ụtụtụ, ka ya bụ ihe mere. Ụfọdụ ndị mmadụ gara gbawaa ebe e debere ihe ndị ahụ, ma baa ebe ahụ. N'ihi ya, ụfọdụ ndị ọzọ malitere gbagharịwa nke mere ka ebe abụ kwobe ekwobe, e wee jiri ụkwụ zọgbuo ọtụtụ ndị mmadụ." 

   Ka ọ dị ugbua, ọ sị na a malitela ime nnyocha banyere ajọ ọdachi ahụ, iji chọpụta otu mmiri siri bàá opi ụgbọgụrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484