Ibelata Nsogbu Idei Mmiri

Sep 25, 2021 - 22:42
 0
Ibelata Nsogbu Idei Mmiri

Uche Nwamba dere akụkọ a

maka na ọ bụ oge mmiri ozuzo ka e ji akọ ihe a ga-eri kwa afọ ọbụla. Ọ bụkwa oge ihe niile dị ndụ ji ekute ume ndụ. Mmiri ozuzo dị mma, mana oke mmiri ozuzo na-ewetara ihe ọbụla na-eku ume oke ọdachi.

Ọ bụ n’ime oke mmiri ozuzo ka e si enweta oke ide mmiri bụ nke na-ewetara ihe nile ọbụla oke ọdachị jọgbụrụ onwe ya. Ide mmiri pụtara mmiri juputara ebe nile na mberede, oge ụfọdụ ọ bụrụ n’oge ehihie ma ọ bụ oge abanị.

Ide mmiri bụ ihe enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ mana ọ na-akpa ike ọjọọ. Ọ na-eropụ osisi n’agbanye ka osisi ahụ ra, ọ na-akwatu ụlọ, ọ na-ebu mmadụ, na-ebukwa ụgbọala nakwa ọtụtụ mmekpa ahụ ọ na-ewetara mmadụ.

E wepu ụlọ, osisi, ngwaahịa nakwa ngwo ngwo ndị mmadụ ide mmiri nwere ike I buru. Ihe ọzọ na-eweta ide mmiri jiri ebukarị mmadụ bụ enweghị ndidi. Mmiri na-ezo, ụfọdụ asị ka ha laba, maọbụ ha ebilie, gaba ọlụ maọbụ ahịa maọbụkwa ebe ọbụla dị ha mkpa. Oge ụfọdụ, ha ekwudo oke ide mmiri n’ụzọ. N’ihi na ha amaghị otu ụzọ ahụ dị na mbụ, tinyere ide mmiri juru ebe nile, ha adanye n’olulu, ide eburu ha.

Ihe ọbụla nwere ọghọm nwekwara uru. Uru abụghị na anyị na-asi ka ide mmiri na-adi mgbe ọ bụla. Ụfọdụ uru dị n’ide mmiri bụ na akụkụ ndị ọlụ ubi ka ọ dịkarị maka na ebe ọ bụla ide mmiri na ebukọ ihe nile, ịkọ ihe n’ebe ala ubi dị otu ahụ na-eme ihe nke ọma.

O kwesiri ka ndị gọọmentị leba anya n’ihe gbasara ide mmiri. Ka ha rụọ ezigbo ọwara mmiri ka ide na-aga ebe o kwesiri. Onye na-alụ ụlọ, ya arụchina ebe ide mmiri na-esi aga. Ndị na-ekponye ahịhịa n’ọwara mmiri ma ọ bụ n’ide ma mmiri na-ezo, kwụsi ya kpamkpam.

O kwesiri ka ụfọdụ n’ime ha kpatara ego nyere gọọmentị aka n’ihazi obodo anyị ka ọ na-atọ ụtọ dịka ebe ahụ ha jere.    

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484