Ndị Ụka Sabbath Agbanweela Aha, Machie Iyi Uwe Ọcha Oge Niile

Jun 16, 2022 - 17:16
 0
Ndị Ụka Sabbath Agbanweela Aha, Machie Iyi Uwe Ọcha Oge Niile

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ a sụọ ụtara, sụọ ụtara, e hogharịa ọdụ.

N'ịgbaso nke a, ndị ụka uwe ọcha ahụ a maara dịka ndị ụka ‘Our Lord’s Sabbath Mission’, nke e ji ụka ‘Sabbath’ wee mara nọ̀rọ̀ na nsonso a wee gbanwee aha ụka ahụ ka ọ zabazie ‘Our Lord the Saviour Covenant Church’.

Onyeisi ụka ahụ n'ala Nigeria, bụ Chigozie Nwaka bụ ya kwupụtara nke a na mmemme pụrụ iche ndị ụka ahụ chịkọbara, bụ mmemme oriri nke mụọ nsọ ‘Feast of Pentecost’ nke ahọ 2022. O kwuru na mgbanwe aha ahụ so n'otu n'ime mnwògharị pụtara ihe ụka ahụ gabigagoro na nsonso a n'okpuru nlekọta ya. 

O kwukwara na akwụkwọ na ihe ndị ọzọ niile ụka ahụ nwere na mbụ, nke bu aha ochie ahụ ka dịkwa ire ma na-arụkwa ọrụ; ma dọọ aka na ntị megide onye ọbụla iji ya mee mpụ maọbụ ihe ọbụla ezighị ezi n'aha ụka ahụ, maka na a ga-eji usoro iwu wee nyụcha onye ọbụla mere ihe dị otu ahụ anya.

Nwaka gakwara n'ihu kwuo nà malite ugbua dịrị gaba, na ọ bụghịzị iwu na onye ọbụla ga na-eyi akwa ọcha wee bịa ụlọụka ahụ, dịka ha si eme ya na mbụ; nke pụtara na mmadụ nwezịrị ike iyi akwa ọbụla dị mma masịrị ya wee bịa ụka ahụ malitezie ugbua gaba.

Ọ kpọpụtasịkwara ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị icheiche ọ gbanwegoro n'ụlọụka ahụ, ma kwuo na a ga-agakwa n'ihu na-enwogharịsị ụfọdụ ihe ndị ọzọ dịka oge na-aga, dịka o siri bụrụ mmasị nke Yahweh, na site n'odudu nke mụọ nsọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484