JDPC Akwadola Ụmụakwụkwọ 96 Ịgụ Akwụkwọ n'Efu n'Anambra

Jun 27, 2022 - 22:56
 1
JDPC Akwadola Ụmụakwụkwọ 96 Ịgụ Akwụkwọ n'Efu n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị òtù ‘Justice, Development and Peace Commission’  a maara dịka JDPC, nke ụka Katọlik na Dayọsis Awka, ekesaarala ọtụtụ ụmụaka ige na-esiri ike ego nkwàdo iji kwàdo ma zighachi ha n'ụlọakwụkwọ.

Ụmụaka ahụ bụ ndị ruru iri iteghete na isii n'ọnụọgụgụ, ma bụrụ ndị e kesaara ego dị nde naịra isii na ụma asaa na ụma isii (N6.7m) na mmemme weere ọnọdụ n'Awka na nsonso a, ebe e nyere onye ọbụla n'ime ha ego dị puku naịra iri asaa (N70,000) maka nkwàdó agụmakwụkwọ ya.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi nhazi otu JDPC n'ebe ahụ bụ Fada Levi Ukor kwuru na ya bụ mmemme e mere ụbọchị ahụ, nke a kpọrọ ‘Help for All’ (nke pụtara ‘Enyemaka Maka Onye Ọbụla’) bụ nnukwu mmemme ha na-eme kwà ahọ ọbụla site na njikọaka ha na ndị otu JDPC mba Australia, iji lekọta ndị ogbenye ma nyekwa nkwàdo na enyemaka nyegara ụmụakwụkwọ dị icheiche enweghị ego izụ ha n'akwụkwọ.

Dịka ọ na-akọwa na ụmụakwụkwọ ahụ e kesaara ego ahụ na-etinye uchu nke ọma n'agụmakwụkwọ ha mana ezinụlọ ha enweghị ego ịzụ ha, ya bụ Fada kọwakwara na ọ bụ site n'okpuru parish dịgasị icheiche dị na dayọsis ahụ site n'ezinụlọ ọnọdụ dịịrị añaa; ọbụladị dịka o kwere nkwa na JDPC ga na-etinyekwara ụmụakwụkwọ ahụ anya na mgbe na mgbe n'agụmakwụkwọ ha, iji hụ na ha na-eme nke ọma. 

Na ntụnye nke ya, onyeisioche otu JDPC na dayọsisi Awka, bụ Maazị Paulinus Adinuba kwuru na otu ahụ esitela na mmemme ahụ na mmemme ndị ọzọ dị etu ahụ wee tụnye ọtụtụ ụtụ dị icheiche pụtara ìhè n'ịkwàlita mmepe obodo ma tutekwa ọtụtụ olileanya dagoro ada na n'ebe olileanya adịghịzị.

O jikwazịrị ohere ahụ wee dụọ ndị nne na nna ụmụakwụkwọ ahụ soro keta ego ahụ ọdụ ka ha mepee akara ọba ego dị iche maka ya bụ ego e nyere ụmụ ha, ma jirikwa ya mee ihe e mebeere ya, gharakwa itinye ya n'ihe abaghị uru.

N'okwu nke ha n'otu n'otu, ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị ahụ soro keta oke n'ego ahụ, nke gụnyere obere Maazị Chibuike Iloegbune na Nwaada Onyinye Amamchukwu kwupụtara obi ụtọ ha nwere maka nke ahụ, kelee otu JDPC maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka ahụ, ma kwekwazie nkwa na ha ga-etinye uchu n'agụmakwụkwọ ha karịa, iji wee mee nke ọma.

Ha kpekwara ka Chukwu gọzie JDPC na ndị otu ahụ, ma kwụghachikwa ha mmaji kwuru mmaji ebe maọbụ akpa ọbụla ego ahụ siri wee pụta.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484