Ọnụ Adaa, Dịka Ndị ACORA Mere Ụka Ọmụ Ahọ 2022 n'Ụzọ Pụrụ Iche

Apr 13, 2022 - 23:13
 0
Ọnụ Adaa, Dịka Ndị ACORA Mere Ụka Ọmụ Ahọ 2022 n'Ụzọ Pụrụ Iche


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọụka ‘Anglican Church of Redemption Parish, Awka’ dị na steeti Anambra juru kpụmkpụm n'ọnụ ụbọchị ụka, dịka ya bụ ụlọụka sonyere ibe ya na mba ụwa, wee merùbe mmemme ụka ọmụ nke ahọ 2022.

Ya bụ ụka oriri nsọ nke onyeisi nchụaja n'ụlọụka ahụ, bụ Ven. Obiorah Alokwu nọ n'isi ya, bụ nke jupụtara n'ebube, dịka ndị bịara ụka n'ebe ahụ jiri obi ụtọ na ọmụ/igu nkwụ ha wee pụọ ma jiri egwu na abụ otuto dị icheiche wee gagharịa n'ụfọdụ okporoụzọ n'Awka ahụ, dịka e si eme ya n'ụlọụka dị icheiche. 

N'okwuchukwu ya n'òfùfè nrò ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Ịmụta Ihe Site n'Aka Kraịst Jizọs’ (Learning from Christ Jesus), Ụkọchukwu Lucky Onebunne kpọkùrù ndị ụka ka ha ñomie akparamagwa Kraịst, ma sokwa nzọụkwụ ya n'ozuzuoke.

Ọ gbadoro ụkwụ n'Akwụkwọ Ndị Filipaị, isi nke abụọ, malite n'amokwu nke ise, wee ruo na nke iri na otu, wee kọwaa na otu n'ime ihe pụtakarịchara ihe na ndụ Kraịst bụ na o wedara onwe Ya n'ala dịka ezi onye njeozi, n'agbanyeghị ogoogo Ya; o wee nagide ma gabiga akaje na ihe dị icheiche e mere ya, n'ihi njọ nke mmadụ, bụzị nke mere Chineke jiri mee aha Ya ka ọ bụrụ aha kachasị elu, nke nà n'áha Jizọs, ikpere niile ga-egbu n'ala, ire niile agbakwa ama na Jizọs bụ eze.

Ọ kpọkuzịrị ndị ụka ka ha ñomie Kraịst dịka ezi onye njeozi, soro ụkpụrụ ya, ma wedakwa onwe ha n'ala dịka Kraịst onwe Ya siri wedaa onwe Ya, iji wee soro Ya kekọọ òkè n'alaeze eligwe n'ụbọchị ikpeazụ.

N'ajụjụọnụ a gbara ya, otu onye a mà àmá na-eme ejije, ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche n'ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ gwụrụ agwụ na nsonso a, bụ Maazị Bob-Manuel Udokwu kọwàrà na ụka ọmụ na-egosipụta mmeri nke ndị kwere na Kraịst megide ike ọchịchịrị niile nke ụwa.

O nyekwazịrị ndụmọdụ ka onye ọbụla ka onye ọbụla were oge izuụka dị nsọ a nọ na ya ugbua wee tụgharịa uche n'ọnwụ Christ nwụụrụ ya, leghachi anya na ndụ ochie o bigoro na mgbe gara aga, rịọ Chineke mgbaghara mmehie na amara iji mezie ndụ ya, ma malitezie bibe ezi ndụ ọhụrụ na-atọ Chineke ụtọ.

N'akụkụ nke ya, nwunye onyeisi nchụaja ma bụrụkwa onyeisi otu jikọtara ụmụnwaanyị n'ụlọụka ahụ, bụ Nneọra Stella Alokwu kọwara na ụka ọmụ bụ ncheta banyere njem ahụ Kraịst gara na Jerusalem dịka eze, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha nye Christ ohere ịbata ma were ọnọdụ na ndụ ha dịka Eze, ka ha wee soro keta òkè na mmeri Ya, ma n'ụwa a, ma n'oge ikpeazụ.

A nọkwara n'ofufenrò ahụ wee nwee ịtụ mmamma pụrụ iche site n'aka ndị dị icheiche, nke gụnyere ndị ezinụlọ Maazị Samson na Dọkịta Nkechi Ọkpala, ndị tụrụ mmamma maka ọrụ ebube dị icheiche Chineke rụrụ n'isi ha na ezinụlọ ha; ya na ndị òtù ụmụnwaanyị ụlọụka ahụ, ndị tụrụ mmamma maka ụka nne ha mere n'izuụka gara aga, bụkwa nke gara siriri-werere ma jupụtakwa n'akụkọ ọgbụgbaama.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484