E Jidela Mmadụ Abụọ Maka Izu Ohi Eriri Ọkụ Latiriki

Jun 9, 2022 - 18:02
 0
E Jidela Mmadụ Abụọ Maka Izu Ohi Eriri Ọkụ Latiriki


Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Ogun akparala mmadụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị jiri izu ohi eriri ọkụ latiriki wee mere aka ọrụ.

Mmadụ abụọ ahụ, bụ Wisdom Odogwu Wisdom na Akorede Aregbe bụ ndị e jidere otu onye n'ime ha n'ihe dika elekere abụọ nke ime abalị ebe ha nọ n'ihu ọrụ, na-ezu eriri ọkụ latiriki na ụfọdụ ihe ndị ọzọ bara uru dị n'obi ọkụ ‘Ibadan Electricity Distribution Company (IBDEC) dị na mpaghara Olisa nke Ijebu-ode, dị n'Ogun.

Akụkọ kọrọ na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ime obodo bụ ndị buru ụzọ hụ ndị ohi ahụ, wee kpọọ onyeisi (DPO) ndị uweojii na mpaghara Igbeba, bụ CSP Musiliu Doga, wee gbaara ya ama banyere nke ahụ. Nke a mezịrị ka CSP Doga jikọta ndị ọrụ ya ozigbo, ma duru ha gaba ebe ahụ.

Ka ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ otu onye n'ime ndị ahụ, bụ Wisdom Odogwu, onye bu ọgbatumtum wee bịa ya bụ ọrụ, bụkwa nke e kekwasịrị ọtụtụ eriri ọkụ na ihe ndị ọzọ e zuru ezu n'elu ya; ha wee nwụchikọọ ya. Ka ndị òtù ya ndị ọzọ hụrụ ihe na-eme, ha riri mbọmbọ ọsọ, wee larie.

N'echi ya, oge a na-agba ya ajụjụọnu, Odogwo sàrà ásịsà ma kwuo eziokwu na ọ bụ izu ohi eriri ọkụ na ihe ndị ọzọ bara uru n'ime obi ọkụ latiriki (transformer) ka ya na ndị òtù ya jiri mere aka ọrụ. Ọ kpọ̀kwara otu onye n'ime ndị ha na ya so arụ arụrụala ma bụrụkwa onye ha na-edobe ihe ha zutere na be ya, bụ Akorede Aregbe bụ onye. Ndị uweojii wee gakwaa nwụchie ya onwe ya.

Ihe dị icheiche e nwètèrè n'aka ndị ahụ gụnyere ọtụtụ eriri ọkụ latiriki ha zuru ezu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ bara uru ha zutere n'obi ọkụ latiriki, tinyekwara ngwaọrụ dị icheiche ha ji ezu ohi ahụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Abimbola Oyeyemi kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie; ma kwukwa na onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Lanre Bankole enyela ntụziaka ka e nyefee okwu ahụ n'aka ngalaba na-ahụ maka nnyocha izu ohi, iji wee mekwuo nnyocha ma lebara okwu ahụ anya ka o siri kwesi.

Ka ọ na-ekele ndị ọrụ nchekwa ahụ maka ịkpọtụrụ ndị ọrụ ya na inye ha ozi banyere arụrụala ndị ohi ahụ, CP Bankole kwèrè nkwà na ndị uweojii steeti ahụ ga-aga n'ihu ijikọ aka ọnụ, ha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche, iji chụọ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

Ọ rịọkwazịrị ọhaneze ka onye ọbụla nwere ozi dị mkpa ga-enyere ha aka n'ịkwàlite ọrụ nchekwa ha na steeti ahụ gbaa mbọ nye ha ozi dị etu ahụ, n'ihi na ọ bụ site na njikọaka ndị ọrụ nchekwa na ọhaneze ka a pụrụ isi nweta mmeri ọsọọsọ n'agha ahụ a na-ebu megide ndị omekoome na arụrụala ha na steeti ahụ, maka na ótù onye anaghaị achụ ngwere mgbahige aja.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484