Ndị Uweojii Anwụchiela Nwaafọ Nigeria na Mba India Maka Ọgwụike

Jun 21, 2022 - 22:43
 0
Ndị Uweojii Anwụchiela Nwaafọ Nigeria na Mba India Maka Ọgwụike


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ngalaba ụlọọrụ uwe ojii pụrụ iche na-ahụ maka ihe gbasaara ọgwụike, bụ ‘Narcotics Squad’ nke West Delhi dị na mba India anwụchiela otu nwaafọ ala Nigeria maka itinye aka n'ihe gbasaara ịtụ mgbere ọgwụike.

Nwoke ahụ, bụ Aboh Casmir Arinze bụ onye e kwuru na a nwụchikọrọ na nsonso a na maghara Janakpuri nke Delhi.

Ozi a kụpụrụ site n'aka ụlọọrụ ahụ na-ekwukwa na e nwetere ọgwụike ‘heroin’ ruru gram narị atọ na abụọ (302 grams) n'aka ya, bụ nke ọnụ ego ya ruru Rs 1 crore.

Ụlọọrụ ahụ gakwara n'ihu kwuo na ya bụ nwa amadi batara mba India n'ọnwa Septemba ahọ 2019 maka ihe nlekọta ahụike ya, mana ọ laghachizịghị ala Nigeria mgbe akwụkwọ e nyere ya gachara; kama ọ nọrọ ebe ahụ bido rebezie akwa, wee megidezie, banye n'ịtụ mgbere ọgwụike.
 
Ka ọ dị taa, ndị uweojii ka na-emekwazị nnyocha banyere okwu ya, ma na-amakwa imi n'ala, iji nwụchikọọ ndị ọzọ ọ na-egote ọgwụike n'aka ha maọbụkwanụ ndị na-egoro n'aka nke ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484