2023: APGA Achịkọbala Ntụliaka Ime Ụlọ Maka Ụlọ Omeiwu Steeti

May 26, 2022 - 20:42
 0
2023: APGA Achịkọbala Ntụliaka Ime Ụlọ Maka Ụlọ Omeiwu Steeti


Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressives Grand Alliance (APGA), na steeti Anambra, nọrọ ụbọchị Tuzdee wee mee ntuliaka ime ụlọ, bụ ‘Primary Elections’ maka ndị ji aha òtù ndọrọndọrọ ahụ azọ ọkwa ịga nọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ha dị icheiche n'ụlọ omeiwu steeti ahụ na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n'ahọ 2023.

Ya bụ ntụliaka ime ụlọ bụ nke e mere n'ogige ebe dị icheiche a họpụtara a ga-anọ chịkọba ya maka ọgbọ nta nkwàdo iri atọ e nwere na steeti ahụ; ma bụrụkwa nke ụfọdụ mmadụ gbagoro akaebe na ọ gara nke ọma na n'ụzọ ghe anya oghe, n'agbanyèghị na e zutere ihe mkpọbiụkwụ dị icheiche n'ebe ụfọdụ.

Tupu a malite ime ya bụ ntụliaka kpọnkwem, ụfọdụ ndị ndu otu ndọrọndọrọ ahụ nàkwà ụfọdụ ndị e zitèrè ezite ịbịa hazie ma lekọta ya bụ ntụliaka nọrọ n'isi ụlọọrụ APGA dị n'Awka wee dụọ ndị ‘Returning Officers’ na ndị ọzọ ga-enye aka n'ọrụ ịchịkọba ya bụ nhọpụta ọdụ ma nyekwa ha nkọwa banyere ụzọ kacha mma ha ga-esi mee ya bụ ntụliaka ka o wee gaa siriri-werere nà n'ụzọ ghe anya oghe.

Ka ọ na-agwa ndị ọrụ ahụ okwu, osote onyeisioche izugbe otu ndọrọndọrọ APGA na mpaghara ndịda-ọdịda anyanwụ, ma bụrụkwa onyeisioche maka nchịkọba ntụliaka ime ụlọ ndị ji aha APGA azọ ọkwa ụlọ omeiwu steeti n'Anambra, bụ Maazị Samson Olare ka ha jiri naanị aha ndị ‘delegate’ e depụtara n'akwụkwọ nke onyeisioche APGA kwàdòrò wee mee ya bụ ntụliaka, ka o wee gaa n'ụzọ ghe anya oghe na n'ụzọ ziri ezi.

O kwukwara ka o doo anya na a gaghị ekwe ka ndị bụ ‘statutory delegate’ sonye na ntụliaka imr ụlọ ahụ; ma dọọ ndị ọrụ ahụ aka na ntị ka ha jiri ma gbaso usoro ahụ na ntụziaka e nyere ha wee rụọ ya bụ ọrụ.

Ka nke ahụ gachazịrị, a malitèrè ikesà ngwaọrụ dị icheiche a ga-eji mee ya bụ nhọpụta.

Mgbe e mechazịrị ya bụ nhọpụta ime ụlọ gachazịrị, ndị tuuru ugo n'ọgbọ nta nkwàdo dị icheiche gụnyèrè: Aguata I - Emmanuel Okpaleke; Aguata II — ; Anaocha I - Njideka Oraedum; Anaocha II — ; Anambra East - Obi Nweke; Anambra West - Patrick Udeoba; Awka North - Chimezie Ikwunne; Awka South I - Samuel Igwedimma Nwofor; Awka South II - Chuma Okoye; Ayamelum - Uche Victor Okafor; Dunukofia - Chuks Azotani; Ekwusigo - Ikenna Ofodeme; Idemili North — ; Idemili South - Chukwuebuka Igwe; Ihiala I — ; Ihiala II - Chukwuebuka Golden Iloh;  Njikoka I - Ibemeka Chidiebere;  Njikoka II - Jude Akpua; Nnewi North - Peter Nwosu; Nnewi South I - Sonny Ozobialu; Nnewi South II - Chieloka Henry Okoye; Ogbaru I — ; Ogbaru II - Uzonwanne Emmanuel Chinna; Onitsha North I - Nwaeze Tony Nwora; Onitsha North II - Harold Ekwerekwu; Onitsha South II — ; Onitsha South II — ; Orumba North - Emeka Aforka; Orumba South - Emmanuel Nwafor; Oyi - Innocent Ojike.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484