N'Awka, Ụmụnwaanyị ACORA Emeela Ụka Nne Ahọ 2022 n'Ụzọ Pụrụ Iche

Mar 31, 2022 - 12:07
 0
N'Awka, Ụmụnwaanyị ACORA Emeela Ụka Nne Ahọ 2022 n'Ụzọ Pụrụ Iche
Odogwu na enyi ya nwaanyị ka ha na-eme ejije na mmemme ahụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ma dụọ ụmụnwaanyị ọdụ ka ha bụrụ ndị dị ike ma na-ekpesikwa ekpere ike oge niile iji guzogide ihe ọbụla chọrọ itisà udo na ọganiru nke ezinụlọ ha.

Onyeisi nchụaja nke ụlọụka ‘Anglican Church of Redemption Parish’ dị n'Awka, bụ Venerebụụl Obiorah Alokwu n'okwuchukwu ya na mmemme ụka nne nke ahọ 2022 nke ụka Angịlịkan n'ụwa gbaa gburugburu.

N'okwuchukwu ya na mmemme ahụ, Ven. Alokwu gụpụtara ozi pụrụ iche nwunye Ashbishọọpụ ụka Angịlịkan na mpaghara Niger, bụ Oriakụ Chioma Ibezim ziteere ụmụnwaanyị ahụ na mmemme ụbọchị ha, bụ nke o sitere na ya wee dụọ ha ọdụ ka ha dị ike, ma n'ekpere, ma n'ịrụ ọrụ dịịrị ha dịka nne n'ezinụlọ, maka na ọ bụ ihe doro anya na ihe mkpọbiụkwụ na ihe iche aka mgba nwere ike ịdapụta na mgbe na mgbe.

Ọ dụkwazịrị ha ọdụ ka ha tụkwàsị na Chineke ma na-ekwesikwara Chineke ntụkwasịobi, n'agbanyèghị ihe dị icheiche ha nwere ike izute n'ime alụmdinanwunye ha.

Dịka ọ na-akatọ̀ akparamagwa ụfọdụ ụmụnwoke na-eti nwunye ha ihe maọbụ na-emekpa ha ahụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ; ọ gwakwara ụmụnwaanyị ka ha yiri ezi akparamagwa dịka uwe ma bụrụ ndị ezigbo nne.

Mmemme ụka nne ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee kpee usoro ekpere dn icheiche, mee ihe ngosi obere ejije, waa achịcha bekee, ma gbakwa ọnya ego maka nkwàdo òtù ụmụnwaanyị.

A nọkwara na ya bụ mmemme wee kpọpụtasịa ndị otu tuuru ugo n'asọmpi dị icheiche e mere na mmemme pụrụ iche a kpọrọ ‘Social Evening’ ụmụnwaanyị ahụ chịkọbara ụbọchị Satọdee tupu ụbọchị ụka nne ahụ kpọmkwem.

Dịka mpụtàrà asọmpi ahụ siri kwuo, ndị òtù ‘Peace’ gbara ndị nke anọ, ndị ‘Joy’ gbara ndị nke atọ, ndị otu ‘Faith’ gbara ndị nke abụọ, ebe ndị otu ‘Love’ bụkwazị tuuru ugo dịka ọkaibe site n'ịgba ndị nke mbụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ụmụnwaanyị n'ụlọụka ahụ, bụ Oriakụ Stella Alokwu kèlèrè ndị ọbụla nyere aka maọbụ tụnye ụtụ n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ iji mee ka ya bụ mmemme dàá ụdà. O kwupụtazịkwara olileanya o nwere  na nke ahọ na-abịa ga-amakarị nke ahọ ma kakwa ya dàá ụda n'ụzọ dị ukwuu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484