Onye agha ịyi egwu egbuona mmadụ asatọ na New York
Onye agha ịyi egwu egbuona mmadụ asatọ na New York
![Onye agha ịyi egwu egbuona mmadụ asatọ na New York](https://igboradio.com/uploads/images/2021/01/image_750x_600725e84db6c.jpg)
O peka mpe, mmadụ asatọ anwụọna, ebe ịhe karịrị mmadụ iri na abụọ merụrụ ahụ na Manhattan, na New York.
Ndị hụrụ mgbe o mere gwara ndị nta akụkọ n’otu nwoke onye agha iyi egwu jiri ụgbọ ala ya mere mgbọ. Ọ na-anya aghara aghara n’okporo ụzọ, n’etiti obodo, n’ehihe ọcha.
Ọ malitere na-akụtu ndị mmadụ, ma ndị ji ụkwụ aga, ma ndị igwe, ma ndị ụgbọ ala ibe ya.
Mgbe nwoke ahụ na-akpa mkpamkpa ahụ, ọ na-eti mkpu n’olu ike, na-asị “Allahu Akbar.”
Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu maka nke a, onye Meyọ New York, bụ Bill de Blazio, kwuru sị na ihe a bu agha iyi egwu megide mba Amerịka.
What's Your Reaction?
![like](https://igboradio.com/assets/img/reactions/like.png)
![dislike](https://igboradio.com/assets/img/reactions/dislike.png)
![love](https://igboradio.com/assets/img/reactions/love.png)
![funny](https://igboradio.com/assets/img/reactions/funny.png)
![angry](https://igboradio.com/assets/img/reactions/angry.png)
![sad](https://igboradio.com/assets/img/reactions/sad.png)
![wow](https://igboradio.com/assets/img/reactions/wow.png)