Obiefuna Abatala Otu Odu Agbaja Abatete, dụ̀ọ́ ndị igbo ka ha Na-akwalite Njirimara Ha

Apr 23, 2022 - 18:49
Apr 24, 2022 - 18:58
 0
Obiefuna Abatala Otu Odu Agbaja Abatete, dụ̀ọ́ ndị igbo ka ha Na-akwalite Njirimara Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu ka ha na-akwàlite omenala, ọdịnala na njirimara ha, ka ha wee ghara ịnwụ maọbụ fuo.

Otu nwaanyị ihe omenala Igbo na-amasị nke ukwuu, bụ Oriakụ Nkiru Obiefuna bụ ya kpọrọ oku a na mmemme ịkpọbata ya n'òtù ụmụnwaanyị a maara dịka ‘Otu Odu Agbaja Abatete’.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'ezinụlọ be ya dị n'Ifite Abatete, n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye ya aha echichi ọhụrụ dịka Arụbụeze.

Ya bụ oke mmemme bụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị enyi na ndị na-echere ya ezi echiche, tinyere ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu, ndị sitere obodo ahụ na mpụga ya wee bịa.

Ọ kọwara ndị Igbo dịka ndị nwere ọmarịcha omenala dị icheiche, ma dụọ ha ka ha ghara ikwe ka omenala ndị ahụ nwụọ, maka na ọ na-abụ onye kpọọ ọba ya ọkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpoo ahịhịa.

O kelekwazịrị ndị otu na ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozuru oke ịbata notu ahụ, ma kelekwa ọtụtụ ndị ọzọ bịara nọnyere ya ụbọchị ahụ; ọbụladị dịka o kwere nkwa ịbụ ezigbo onye nnọchianya ndị otu ahụ n'ebe ọbụla ọ nọ.

Na mbụ n'okwu ya n'ebe ahụ, otu onye n'ime ndị Otu Odu ahụ, bụ Oriakụ Ifeyinwa Onwudinjo kwuru na ha nyochara Oriakụ Obiefuna wee hụta ya dịka onye tozuru oke ịbata na ya bụ otu nwere ugwu; ọbụladị dịka o kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi ya.

A nọrọ na mmemme ahụ wee jie ya bụ agụ nwaanyị ejiji, chọọ ya mma, ma nyekwa ya akụpe, nke e biri aha echichi ya “Iyom Arụbụeze” na ya. A nọkwara na ya bụ mmemme gbaa egwu ọdịnala, mee ihe ngosi dị icheiche, ma nyekwa Oriakụ Obiefuna onyinye dị icheiche site n'aka ọtụtụ mmadụ.

Otu Odu so n'otu n'ime otu ụmụnwaanyị kachara dị elu ma nwekwa ùgwù n'ala Igbo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484