A Tụọla Mmadụ 7 Nga n'Enugu Maka ‘Yahoo Yahoo’, Jide Otu Pastọ

Jun 8, 2022 - 20:24
 0
A Tụọla Mmadụ 7 Nga n'Enugu Maka ‘Yahoo Yahoo’, Jide Otu Pastọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ agadi nwaanyị kachie ntị wụ̀ọ́ aja, e bute ozu ya n'ófè nke ọzọ.

Ka ọ dị taa, ụmụokorobịa asaa ahụ zuru òkè abụrụla ndị a tụrụ nga na steeti Enugu maka itinye aka n'ígwù ojoro site n'usoro ịntanetị, nke a maara dịka ‘Yahoo Yahoo’.

Ọ bụ Ọkaikpe I. M. Buba, nke ụlọikpe ukwu dị n'Enugu mara mmadụ asaa ndị ahụ ikpe n'ótù n'ótù maka ihe dị icheiche ha mèrè, nke gbadoro ụkwụ n'ikwu na ha bụ onye ha abụghị, ya na inweta ego site n'usoro ụgha na igwu ojoro, nke ha mere ọtụtụ ndị sitere mba ofesi dị icheiche aka ha dị ọcha.

Ụmụokorobịa asaa ahụ a mara ya bụ ikpe gụnyèrè Enegide Ifeanyi Kizito, Chukwuajama Collins Arinze, Victor Udekwe, Chukwudi Emmanuel, Nwafor Clinton Chetachi, Utogbo Joseph na Omilo Collins Chimere.

Ọ bụ ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịmazụ̀ ego ọhaneze na iri ngarị n'ala Nigeria, bụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ nwụchiri ndị ahụ, gbaa ha akwụkwọ, ma kpụpụkwa ha ụlọikpe.

N'otu n'ime ebubo ahụ e boro ha, EFCC kwuru na otu onye n'ime mmadụ asaa ahụ, bụ Chetachi Nwafor jìrì aha onye agha mba America bụ Britton Thomas, onye nọ ọrụ ugbua na mba Syria, wee gwuo otu nwaanyị mba Russia bụ Kristine bi na Latvia ojoro ma napụ ya ọkpụrụkpụ ego n'ọnwa Eprel ahọ gara aga.

Nke ahụ bụkwa nke e kwuru na o megidere mpaghara 22 (3) (a) (b) nke ‘Cybercrimes (Prohibition, Prevention, etc) Act’ nke ahọ 2015, ma bụrụkwa nke nwere ntaramahụhụ dịịrị ya, dịka ọ dị na mpaghara 22 (4) nke otu iwu ahụ.

Mmadụ asaa ahụ niile jiri ọnụ ha kweta na ikpe mara ha n'ezie mgbe a gụpụtaara ha ihe dị icheiche ha mere na ihe iwu kwuru banyere ya.

Nke ahụ mezịrị, na nkabi ikpe ya, Justice Buba tụrụ ha mkpọrọ otu afọ ma kwukwa ego ole dị icheiche ha ga-akwụ iji gbara isi onwe ha ma zèéré ntaramahụhụ ahụ.

O kwukwàrà na a ga-anapụtasị ha ekwentị ha niile, bụkwazị nke EFCC ga-ere ma kwụnye ego e retere na ha n'ime akpa ego gọọmenti etiti a maara dịka ‘Consolidated Revenue Account (CRA)’.


N'akukọ ọzọ dị ka ibe ya, EFCC nọkwàrà na nsonso a nwụchie otu nwoke e kwùrù na ọ bụ pastọ̀, ma kpụgharịa ya n'otu ụlọikpe ukwu dị n'Enugu, maka igwu ndị ọcha ojoro ma kapụ̀kwa ha ọkpụrụkpụ ego site n'usoro ‘Yahoo Yahoo’.

Nwoke ahụ, bụ Pastọ Kelechi Vitalis Anozie ka e kwùrù na ọ bụ n'abalị iri nke ọnwa Maachị ahọ a ka e jidere ya, ma kwukwa na o teela aka e jiri chọgharịba ya, nke bụ́ nà ụlọọrụ mba America na-ahụ maka nnyocha, bụ ‘America Federal Bureau of Investigation’ sochakwu achọ ya n'ihi ebe dị icheiche o gwugoro ndị mmadụ ojoro.

Nnyocha e mere na-egosi na ya bụ Pastọ gwùrù otu onye America bụ F.F. bi na mpaghara Illinois ojoro, napụ ya ego dị $135,800 (otu narị puku dọla na iri atọ na ise, na ụma narị asatọ); ma gwùkwá onye ọcha ọzọ bi na mpaghara North Carolina nke mba America ojoro, napụ ya ego dị $47,000 (puku dọla iri anọ na asaa).

Ọ bụkwazị n'ihu Ọkaikpe I.M. Buba nke ụlọikpe ukwu dị n'Enugu ka a kpụgharịrị pastọ̀ ahụ, kwukwa na e nwere mmadụ atọ ndị ọzọ ya na ya jikọrọ aka wee rụọ ya bụ ọrụ, bụ́kwa ndị nke nọ n'ọsọ ugbua. Mmadụ atọ gụnyèrè Azubuike Ifeanyi Bright, Amarachi Blessing Iro, na Kelechi Patrick Iro.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484