Soludo Akatọọla Mwakpò Ndị Omekoome n'Okpuruọchịchị Nnewi South

Apr 8, 2022 - 20:13
 0
Soludo Akatọọla Mwakpò Ndị Omekoome n'Okpuruọchịchị Nnewi South


Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo akatọ̀ọ́la mwakpò ahụ ndị omekoome wakpòro isi ụlọọrụ okpuruọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ dị n'Ụkpọr na nsonso a, bụkwa ebe ha nọrọ wee mee mkpamkpa dị egwu.

Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a oge ọ gara njem nleta n'ebe ahụ, ma bụrụkwa nke onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echenge na ụfọdụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ soro ya wee gaa.

Isi ụlọọrụ ‘Nnewi South’ ahụ bụ nke ndị omekoome wakporo n'ihe dịka elekere abụọ nke ụtụtụ ụbọchị Tọzdee, wee gbaa ọtụtụ ụlọ dị n'ime ebe ahụ ọkụ, ma gbagbukwa otu onyenche ha hụrụ n'ebe ahụ, tupu ha larie.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo kọwàra mkpamkpa ahụ ndị omekoome ahụ kpara ebe ahụ dịka nke jọgburu onwe ya, nàkwà nnukwu ihe mwute, ọbụladị dịka ọ gbarụkwara ihu banyere etu ndị omekoome sizị awakpò ma na-eme ihe na-asụ ntị wuruwuru na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.

O mere ka a mara na ọ bụ ihe mwute na ya bụ atụmatụ ndị ojiegbe n'ime steeti ahụ eruola nke etu ahụ, nke na mmadụ nkịtị aka ya dị ọcha na-anatazịkwa ntaramahụhụ ihe ha maghị maka ya. O kwukwara na nke ahụ metụtakwara gọọmenti, n'ihi na ọ ga-emezị ka gọọmenti were ego o kwesiri iji rụọ ọrụ mmepe wee na-edozisi ihe ndị ojiegbe mebisiri.

Ọ dụkwazịrị Ndị Anambra ọdụ ka ha kwụdosie ike n'ihi na ndị omekoome apụghị iguzogide maọbụ merie ya bụ steeti na ụmụafọ ya; ọbụladị dịka o kwupụtara olileanya o nwere na Anambra ga-aga n'ihu na-adịwanye mma ma na-esiwanyekwa ike.

Ọ gakwazịrị n'ihu kwupụtanwòó ezi njikere ọchịchị ya dị ichekwa ndụ na akụnụba ụmụ mmadụ na steeti ahụ nà iweghàchite udo na ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ, n'agbànyèghị akaọrụ ndị omekoome.

Banyere onyenche ahụ ndị ojiegbe ahụ gbagburu ebe ahụ ụbọchị ahụ, Gọvanọ Soludo kọwara ya dịka nke ekwesighị ekwesi, n'agbànyèghị ihe ọbụla bụ ihe ndị omekoome ahụ na-achọ. Ọ kasizịkwara ndị ezinụlọ nwoke ahụ obi, kpee ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa; ma dụ̀kwazie ndị Anambra ọdụ ka ha jikọta aka ọnụ, ma nyekwara gọọmenti aka iji memìlaa atụmatụ ndị omekoome na steeti ahụ.
 
Na ntụnye nke ya, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Echeng Echeng kwèrè nkwà na ndị uweojii steeti ahụ ga-ejikọ aka ọnụ, ha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche, iji chụọ mpụ na arụrụala ọsọ ụkwụ eru ala na steeti ahụ.

Ọ rịọkwazịrị ndị Anambra ka onye ọbụla nwere ozi dị mkpa ga-enyere ha aka n'ịkwàlite ọrụ nchekwa ha na steeti ahụ gbaa mbọ nye ha ozi dị etu ahụ, n'ihi na ọ bụ site na njikọaka gọọmenti, ndị ọrụ nchekwa na ọhaneze ka a pụrụ isi nweta mmeri ọsọọsọ n'agha ahụ a na-ebu megide ndị omekoome na arụrụala ha na steeti ahụ, maka na ótù onye anaghaị achụ ngwere mgbahige aja.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484