Gọọmenti Ekwela Nkwa Mgbataọsọ Mbize Okporoụzọ Ukpor-Nnewi

Jun 26, 2022 - 23:04
 0
Gọọmenti Ekwela Nkwa Mgbataọsọ Mbize Okporoụzọ Ukpor-Nnewi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti steeti Anambra ekwela nkwa mgbataọsọ n'ebe ahụ mbize na-enye nsogbu ma na-akpakwa ike na mpaghara okporoụzọ ahụ siri Ukpor gaa Nnewi.

Kọmishọna na-ahụ maka Gburugburu na steeti ahụ, bụ Maazị Felix Odimegwu bụ ya kwupụtara nke a oge onye ntaakụkọ anyị na-agba ya ajụjụọnụ banyere ihe gọomenti na-eme maka ya bụ ọnọdụ ibo, bụ nke gbasagokwara na nsonso a n'ihi oke mmiri ozuzo na ijummiri gbara n'ebe ahụ na nsonso a.

O mere ka a mara gọọmenti azọpụla ụkwụ banyere ya bụ ọnọdụ, ma kwuo na ndị ọrụ ga-aga ebe ahụ oge adịghị anya iji lelee ma hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, wee marazie etu a ga-esi wee rie ya bụ akpụ kwụrụ ụdọ, dịka o siri metụta ọnọdụ kacha mma a ga-esi wee kpàá ya bụ mbize eze.

Kọmishọna Ọdimegwu kpọkuzịkwara ndị na-anya ụgbọala na ọgbaatumtum na ndị ọzọ niile si n'okporoụzọ ahụ aga ka ha biko kpachapụ anya ma na-ekwekwa nkwụcha nke ọma oge ọbụla ha na-agafe n'ebe ahụ, ọkachasị n'abalị, iji zeere ihe ọdachi ọbụla.

Ọ dị ncheta na mbize ahụ bụ nke dị n'otu n'ime ogologo okporoụzọ jikọrọ Ukpor (dị n'okpuruọchịchị ime obodo Nnewi South) na obodo Nnewi, ma bụrụkwa nke kawanyegoro njọ na ugbua ma na-achọkwazị ikewa okporoụzọ ahụ abụọ.

Ya bụ mbize bụkwa nnukwu ihe izendụ ugbua n'ebe ahụ ma bụrụkwa nke wetegoro ọtụtụ ihe mberede okporoụzọ n'ebe ahụ na nsonso a n'ebe ahụ, n'ihi na ụgbọala na-adị adanyebe n'ime ọwammiri oge ụfọdụ ma ọ na-eze ya bụ mbize.

Nke ahụ emegokwa ka ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ na ndị na-esikarị n'okporoụzọ ahụ agba kpọkuo gọọmenti ka a gbata ọsọ enyemaka ngwangwa n'ebe ahụ mara ihe e mere ya bụ mbize tupu ọ kawanye njọ, laa ndụ mmadụ n'iyi, maọbụkwanụ weta ihe egwu ọzọ kacha njọ na gburugburu ebe ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484